Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ihe E Mere 17:1-27

17  O wee ruo na ozugbo Devid malitere ibi n’ụlọ nke ya,+ Devid gwara Netan+ onye amụma, sị: “Lee, m bi n’ụlọ e ji osisi sida wuo,+ ma igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova dọrọ n’okpuru ákwà ụlọikwuu.”+  Netan wee sị Devid: “Mee ihe ọ bụla dị gị n’obi,+ n’ihi na ezi Chineke nọnyeere gị.”+  O wee ruo n’abalị ahụ na okwu+ Chineke ruru Netan ntị, sị:  “Gaa gwa Devid bụ́ ohu m, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Ọ bụghị gị ga-ewuru m ụlọ m ga-ebi.+  N’ihi na ebitụbeghị m n’ụlọ malite n’ụbọchị m kpọpụtara Izrel ruo taa,+ kama anọwo m na-esi n’otu ụlọ ntu gaa n’ụlọ ntu ọzọ, sikwa n’otu ụlọikwuu+ gaa n’ụlọikwuu ọzọ.+  N’oge niile m gagharịrị+ n’Izrel dum, ọ̀ dị otu n’ime ndị ikpe Izrel bụ́ ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m dị ka atụrụ nke m gwatụrụ, sị, ‘Gịnị mere na unu ejibeghị osisi sida wuoro m ụlọ?’”’+  “Nke a bụ ihe ị ga-agwa ohu m Devid, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru: “Mụ onwe m si n’ala ịta ahịhịa, n’ebe ị na-edugharị ìgwè ewu na atụrụ,+ kpọrọ gị ka ị bụrụ onye ndú+ nke ndị m Izrel.  M ga-anọnyekwara gị n’ebe ọ bụla ị na-aga,+ m ga-ebipụkwa ndị iro gị niile+ n’ihu gị, m ga-emekwara gị aha+ dị ka aha ndị ukwu bi n’elu ụwa.+  M ga-enye ndị m Izrel otu ebe, kụọkwa ha dị ka mkpụrụ,+ ha ga-ebikwa n’ebe ha nọ, a gakwaghị eme ka ha maa jijiji; ụmụ ajọ omume+ agaghị enye ha nsogbu ọzọ, dị nnọọ ka ha mere na mbụ,+ 10  ọbụna kemgbe ụbọchị m mere ka ndị ikpe+ na-achị ndị m Izrel. M ga-eweda ndị iro gị niile n’ala.+ M na-asịkwa gị, ‘Jehova ga-ewukwara gị ụlọ.’+ 11  “‘“Ọ ga-erukwa na mgbe ụbọchị gị ga-ezu ka i sonyere nna nna gị hà,+ m ga-eme ka mkpụrụ gị, nke ga-abụ otu n’ime ụmụ gị,+ bilie mgbe ị nwụsịrị, m ga-emekwa ka ọbụbụeze ya guzosie ike.+ 12  Ọ bụ ya ga-ewuru m ụlọ,+ m ga-emekwa ka ocheeze ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.+ 13  Mụ onwe m ga-abụ nna ya,+ ya onwe ya ga-abụ nwa m;+ agaghị m ewepụ obiọma* m n’ebe ọ nọ+ dị ka m wepụrụ ya n’ebe onye bu gị ụzọ nọ.+ 14  M ga-eme ka o guzo n’ụlọ m+ nakwa n’alaeze m+ ruo mgbe ebighị ebi. Ocheeze ya+ ga-abụkwa nke na-adịru mgbe ebighị ebi.”’” 15  Netan wee gwa Devid okwu dị ka okwu ndị a niile si dị nakwa dị ka ọhụụ a dum si dị.+ 16  E mesịa, Eze Devid batara nọdụ ala n’ihu Jehova+ wee sị: “Ònye ka m bụ,+ Jehova Chineke, gịnịkwa ka ụlọ m bụ+ mere i ji meere m ihe a niile?+ 17  Dị ka à ga-asị na nke a bụ ihe nta n’anya gị,+ Chineke,+ ị na-ekwukwa ihe ga-eme mgbe dị anya n’ọdịnihu banyere ụlọ ohu gị,+ i lewokwa m anya dị ka onye ga-anọ n’ọkwá dị elu,+ Jehova Chineke. 18  Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị banyere ùgwù ị kwanyeere ohu gị,+ ebe gị onwe gị maara ohu gị nke ọma?+ 19  Jehova, i mewo oké ihe a niile site n’ime ka a mara oké ihe niile ị ga-arụzu+ n’ihi ohu gị nakwa dị ka o si dị gị mma n’obi.+ 20  Jehova, ọ dịghị onye dị ka gị,+ ọ dịghịkwa Chineke dịnụ ma e wezụga gị,+ dị ka ihe niile anyị jiworo ntị anyị nụ si dị. 21  Oleekwa mba ọzọ n’ụwa nke dị ka ndị gị Izrel,+ bụ́ ndị ezi Chineke gara gbapụtara onwe ya ka ha bụrụ ndị ya,+ iji meere onwe gị aha site n’ịrụzu oké ihe+ na ihe dị egwu site n’ịchụpụ mba dị iche iche+ n’ihu ndị gị bụ́ ndị ị gbapụtara n’Ijipt? 22  I wee mee ka ndị gị Izrel bụrụ ndị gị+ ruo mgbe a na-akaghị aka, gị onwe gị kwa, Jehova, wee bụrụ Chineke ha.+ 23  Ugbu a, Jehova, ka ihe i kwuru banyere ohu gị nakwa banyere ụlọ ya mezuo ruo mgbe ebighị ebi, dị nnọọ ka i kwuru. 24  Ka aha gị+ bụrụ nke a pụrụ ịtụkwasị obi, ka ọ dịkwa ukwuu+ ruo mgbe ebighị ebi, ka ndị mmadụ wee sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ Chineke Izrel,+ bụụrụ Izrel Chineke,’+ ka ụlọ ohu gị Devid bụrụ nke ga-adịgide n’ihu gị.+ 25  N’ihi na gị onwe gị, Chineke m, ekpugheworo ohu gị nzube gị iwuru ya ụlọ.+ Ọ bụ ya mere ohu gị ji nwee ike ikpe ekpere n’ihu gị. 26  Jehova, ị bụ ezi Chineke,+ i kwere ohu gị nkwa ihe ọma a.+ 27  Biko, hụ na ị gọziri ụlọ ohu gị ka o wee dịgide n’ihu gị ruo mgbe e bighị ebi;+ n’ihi na gị onwe gị, Jehova, agọziwo ya, ọ bụrụwokwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

1Ih 17:13*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”