Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ihe E Mere 14:1-17

14  Haịram+ eze Taya+ wee zigara Devid ndị ozi, zigakwara ya osisi sida+ na ndị na-ewu mgbidi na ndị ọkwá nkà ka ha wuoro ya ụlọ.+  Devid wee mara na Jehova emewo ka o guzosie ike+ dị ka eze Izrel, n’ihi na e buliri alaeze ya elu nke ukwuu n’ihi ndị ya bụ́ Izrel.+  Devid wee lụkwuo ụmụ nwaanyị+ na Jeruselem. Devid wee mụtakwuo ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị.+  Ndị a bụ aha ụmụ ọ mụrụ na Jeruselem: Shamua+ na Shobab,+ Netan+ na Sọlọmọn,+  na Ịbha+ na Elaịshua na Elpelet,+  na Noga na Nifeg+ na Jefaya,  na Elishama+ na Beelayada na Elifelet.+  Ndị Filistia wee nụ na e tewo Devid mmanụ ịbụ eze Izrel dum.+ Ndị Filistia niile wee gbagote ịchọ Devid.+ Mgbe Devid nụrụ ya, ọ gara ka o buso ha agha.  Ma ndị Filistia batara wee na-awakpo ndagwurugwu Refeyim.+ 10  Devid wee jụọ Chineke ase,+ sị: “Ọ̀ bụ m gbagoo buso ndị Filistia agha, ị̀ ga-enyefe ha n’aka m?” Jehova wee sị ya: “Gbagoo, m ga-enyefe ha n’aka gị.” 11  Devid wee gbagoo Bel-perezim,+ o wee merie ha n’ebe ahụ. Devid wee sị: “Ezi Chineke esiwo n’aka m kwada ndị iro m dị ka ebe mmiri kwadara.” Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ ebe ahụ+ Bel-perezim. 12  Ha wee hapụ chi ha dị iche iche n’ebe ahụ.+ Devid wee nye iwu, e wee gbaa ha ọkụ.+ 13  Mgbe e mesịrị, ndị Filistia wakporo ndagwurugwu ahụ ọzọ.+ 14  Devid wee jụọ+ Chineke ase ọzọ, ezi Chineke wee sị ya: “Achụrụla ha gbagoo. Gaa nkọnkọ nkọnkọ ka i wee ghara ibuso ha agha ihu na ihu, ị ga-ezutekwa ha n’ihu ebe ahụ osisi beka jupụtara.+ 15  Ọ ga-erukwa na mgbe ị nụrụ ụda ụkwụ n’elu osisi beka ndị ahụ,+ ị ga-apụ gaa buo agha,+ n’ihi na ezi Chineke ga-agaworị n’ihu gị+ igbu ndị agha ndị Filistia.” 16  Devid wee mee dị nnọọ ka ezi Chineke nyere ya n’iwu,+ ha wee gbuo ndị agha ndị Filistia malite na Gibiọn+ ruo Giza.+ 17  Devid wee malite ide ude+ n’ala niile, Jehova wee mee ka ụjọ ya jide mba niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji