Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Tesalonaịka 3:1-13

3  N’ihi ya, mgbe anyị na-enwekwaghị ike idi ya, anyị hụrụ na ọ dị mma ka a hapụ naanị anyị n’Atens;+  anyị wee zite Timoti,+ bụ́ nwanna anyị na onye ozi Chineke n’ozi ọma+ banyere Kraịst, ka o mee ka unu guzosie ike, kasiekwa unu obi n’ihi okwukwe unu,  ka mkpagbu ndị a wee ghara ime ka onye ọ bụla ṅagharịa.+ N’ihi na unu onwe unu maara na ihe ndị a aghaghị ime anyị.+  N’eziokwu, mgbe anyị na unu nọkwa, anyị na-agwa unu tupu o mee+ na a kawo ya aka na a ga-akpagbu anyị,+ dị nnọọ ka o mewokwara, dịkwa ka unu maara.+  N’ezie, ọ bụ ya mere na mgbe m na-enwekwaghị ike idi ya, m zitere ya ka m wee mara banyere ikwesị ntụkwasị obi unu,+ n’ihi na, ma eleghị anya, Onye Ọnwụnwa+ ahụ pụrụ ịnwaworị unu ọnwụnwa n’ụzọ ụfọdụ, ndọgbu anyị dọgburu onwe anyị n’ọrụ ewee bụrụ n’efu.+  Ma Timoti ka si nnọọ n’ebe unu nọ bịakwute anyị+ ugbu a ma kọọrọ anyị akụkọ ọma banyere ikwesị ntụkwasị obi na ịhụnanya unu,+ kọọkwara anyị na unu na-echeta anyị nke ọma mgbe niile, nakwa na ọ na-agụsi unu agụụ ike ịhụ anyị, n’otu ụzọ ahụ ọ na-agụ anyị ịhụ unu.+  Ụmụnna anyị, ọ bụ ya mere e ji kasie anyị obi+ n’ihe metụtara unu, n’ime mkpa anyị niile na mkpagbu anyị niile, site n’ikwesị ntụkwasị obi nke unu na-egosi,+  n’ihi na anyị dị ndụ ugbu a ma ọ bụrụ na unu eguzosie ike n’Onyenwe anyị.+  N’ihi na olee otú anyị pụrụ isi gosi Chineke ekele anyị nwere n’ihi unu nakwa n’ihi ọṅụ niile anyị na-aṅụrị+ n’ihu ya n’ihi unu, 10  ebe anyị na-arịọsi arịrịọ ike+ abalị na ehihie n’ụzọ pụrụ iche karị iji hụ ihu unu, iji mee ka unu nwetakwa ihe kọrọ n’okwukwe unu?+ 11  Ka Chineke bụ́ Nna anyị nakwa Onyenwe anyị Jizọs+ duo anyị nke ọma ka anyị rute n’ebe unu nọ. 12  Ka Onyenwe anyị meekwa ka ịhụnanya+ unu nwere n’ebe ibe unu nọ nakwa n’ebe mmadụ niile nọ dịkwuo ukwuu,+ ee, mụbaakwa, ọbụna dị ka anyị na-eme n’ebe unu nọ; 13  ka o wee mee ka obi sie unu ike, meekwa ka obi unu bụrụ nke a na-apụghị ịta ụta+ n’ịdị nsọ n’ihu Chineke bụ́ Nna anyị n’oge ọnụnọ+ nke Onyenwe anyị Jizọs, ya na ndị nsọ ya niile.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji