Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Tesalonaịka 1:1-10

1  Pọl na Silvenọs+ na Timoti+ na-edetara ọgbakọ ndị Tesalonaịka, nke ya na Chineke bụ́ Nna nakwa Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị n’otu,+ akwụkwọ: Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo dịrị unu.+  Anyị na-ekele Chineke mgbe niile mgbe anyị na-echeta unu niile n’ekpere anyị,+  n’ihi na anyị na-eburu n’uche mgbe niile ọrụ unu ji ikwesị ntụkwasị obi na-arụ+ na ndọgbu unu ji ịhụnanya na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ntachi obi unu n’ihi olileanya unu nwere+ n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst n’ihu Chineke bụ́ Nna anyị.  N’ihi na anyị maara, ụmụnna anyị ndị Chineke hụrụ n’anya, nhọrọ ọ họọrọ unu,+  n’ihi na ozi ọma anyị kwusara n’etiti unu abụghị naanị n’okwu ọnụ, kama ọ kpara ike+ n’etiti unu site n’ike mmụọ nsọ, nke mere unu ji kwenyesie ike,+ dị nnọọ ka unu maara ụdị ndị anyị ghọrọ n’ebe unu nọ n’ihi unu;+  unu ghọkwara ndị na-eṅomi+ anyị na ndị na-eṅomi Onyenwe anyị,+ ebe unu ji ọṅụ nke mmụọ nsọ+ na-enye nabata okwu Chineke mgbe unu nọ ná mkpagbu dị ukwuu,+  nke mere na unu ghọọrọ ndị niile kwere ekwe nọ na Masedonia nakwa n’Akeya ihe nlereanya.  Ihe bụ́ eziokwu bụ na, ọ bụghị naanị na okwu Jehova+ esitewo n’ebe unu nọ dapụta ụda na Masedonia na Akeya, kama n’ebe ọ bụla, okwukwe unu+ n’ebe Chineke nọ agbasawo n’ebe niile,+ nke mere na ọ dịghị anyị mkpa ikwu ihe ọ bụla.  N’ihi na ha onwe ha na-akọ akụkọ banyere otú anyị si bata n’etiti unu na mbụ, na otú unu si hapụ arụsị+ unu wee bịakwute Chineke ka unu wee bụrụ ohu ezi+ Chineke dị ndụ,+ 10  na ichere+ Ọkpara ya si n’eluigwe,+ onye o mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie,+ ya bụ, Jizọs, onye ga-anapụta anyị n’ọnụma ahụ nke na-abịanụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji