Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Kọrịnt 5:1-13

5  N’ezie, a na-akọ na ịkwa iko+ dị n’etiti unu, bụ́ ụdị ịkwa iko nke na-adịghị ọbụna n’etiti ndị mba ọzọ, na otu nwoke kpọọrọ nwunye nna ya.+  Ùnu na-afụli onwe unu elu?+ Ọ́ bụghị uju ka unu kwesịrị iru,+ ka e wee wepụ nwoke ahụ mere ihe a n’etiti unu?+  Ọ bụ ezie na anọghị m ya n’anụ ahụ́ kama anọ m ya n’ime mmụọ, mụ onwe m ekpeworị nwoke mere ihe dị otú ahụ ikpe n’ezie,+ dị ka à ga-asị na m nọ ya,  n’aha Onyenwe anyị Jizọs, mgbe unu zukọtara, mmụọ m adịrịkwa n’etiti unu site n’ike Onyenwe anyị Jizọs,+ ka unu  wee nyefee nwoke dị otú ahụ n’aka Setan+ ka e bibie mmetụta anụ ahụ́ na-enwe, ka e wee chebe ọnọdụ ime mmụọ+ nke ọgbakọ n’ụbọchị Onyenwe anyị.+  Ihe mere unu ji anya isi ezighị ezi.+ Ọ̀ bụ na unu amaghị na ntakịrị ihe iko achịcha na-eme ka ntụ ọka dum a gwakọtara agwakọta+ koo eko?+  Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta,+ dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo+ nwa atụrụ ememme ngabiga+ anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.+  N’ihi ya, ka anyị na-eme ememme ahụ,+ n’ejighị ihe iko achịcha ochie,+ n’ejighịkwa ihe iko achịcha+ bụ́ ihe ọjọọ na ajọ omume,+ kama ka anyị jiri achịcha na-ekoghị eko bụ́ izi ezi na eziokwu na-eme ya.+  N’akwụkwọ ozi m, m deere unu ka unu na ndị na-akwa iko kwụsị ịdị na-akpakọ, 10  ọ pụtaghị ndị niile na-akwa iko+ nke ụwa a+ ma ọ bụ ndị anyaukwu na ndị na-apụnara mmadụ ihe ma ọ bụ ndị na-ekpere arụsị. Ma ọ́ bụghị ya, unu aghaghị isi n’ụwa pụọ n’ezie.+ 11  Ma ugbu a, m na-edetara unu akwụkwọ ka unu na onye ọ bụla a na-akpọ nwanna bụ́ onye na-akwa iko ma ọ bụ onye anyaukwu+ ma ọ bụ onye na-ekpere arụsị ma ọ bụ onye na-ekwujọ mmadụ ma ọ bụ onye aṅụrụma+ ma ọ bụ onye na-apụnara mmadụ ihe kwụsị ịdị na-akpakọ,+ ka unu na onye dị otú a ghara ọbụna irikọ ihe. 12  N’ihi na, gịnị jikọrọ mụ na ikpe ndị nọ n’èzí ikpe?+ Ọ̀ bụ na unu adịghị ekpe ndị nọ n’ọgbakọ ikpe,+ 13  ebe Chineke na-ekpe ndị nọ n’èzí ikpe?+ “Wepụnụ onye ọjọọ ahụ n’etiti unu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji