Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Kọrịnt 3:1-23

3  N’ihi ya, ụmụnna m, enweghị m ike ịgwa unu okwu dị ka ndị mmụọ nsọ na-achị,+ kama dị ka ndị anụ ahụ́ na-achị, dị ka ụmụ ọhụrụ+ n’ime Kraịst.  Enyere m unu mmiri ara, ọ bụghị nri siri ike,+ n’ihi na unu esichabeghị ike. N’eziokwu, unu esichabeghịkwa ike ugbu a,+  n’ihi na unu ka bụ ndị anụ ahụ́ na-achị.+ N’ihi na ebe e nwere ekworo na esemokwu n’etiti unu,+ ọ̀ bụ na unu abụghị ndị anụ ahụ́ na-achị, ọ̀ bụkwa na unu adịghị eje ije dị ka ụmụ mmadụ si eje?+  N’ihi na mgbe otu onye na-asị: “Abụ m nke Pọl,” ma onye ọzọ asị: “Abụ m nke Apọlọs,”+ ọ̀ bụ na unu na ndị ọzọ aghọbeghị otu ihe?  Gịnịzi ka Apọlọs bụ?+ Ee, gịnị ka Pọl bụ? Ha bụ ndị ozi+ ndị unu si n’aka ha ghọọ ndị kwere ekwe, ọbụna dị ka Onyenwe anyị nyere onye nke ọ bụla ọrụ.  Akụrụ m+ mkpụrụ, Apọlọs gbara ya mmiri,+ ma ọ bụ Chineke na-eme ka o too;+  nke mere na onye na-akụ+ mkpụrụ abụghị ihe ọ bụla, onye na-agba ya mmiri abụghịkwa ihe ọ bụla, kama ọ bụ Chineke onye na-eme ka o too+ bụ ihe niile.  Ya mere, onye na-akụ mkpụrụ na onye na-agba ya mmiri bụ otu,+ ma onye ọ bụla ga-anata ụgwọ ọrụ nke ya dị ka ndọgbu ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ si dị.+  N’ihi na anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.+ Unu bụ ubi Chineke nke a na-arụ ọrụ na ya,+ ụlọ nke Chineke na-ewu.+ 10  Dị ka obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ si dị,+ bụ́ nke e nyere m, dị ka onye nduzi ọrụ nke maara ihe, atọrọ m ntọala,+ ma onye ọzọ na-ewu ụlọ n’elu ya. Ma ka onye ọ bụla na-elezi anya otú o si ewu ụlọ n’elu ya.+ 11  N’ihi na mmadụ ọ bụla apụghị ịtọ ntọala ọzọ+ karịa nke a tọworo, nke bụ́ Jizọs Kraịst.+ 12  Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla ejiri ọlaedo, ọlaọcha, nkume dị oké ọnụ ahịa, osisi, ahịhịa, okporo ọka wuo ụlọ n’elu ntọala ahụ, 13  ọrụ onye ọ bụla ga-apụta ìhè, n’ihi na ụbọchị ahụ ga-eme ka ọ pụta ìhè, n’ihi na a ga-eji ọkụ kpughee ya;+ ọkụ ahụ ga-egosi ụdị ọrụ onye ọ bụla rụrụ. 14  Ọ bụrụ na ihe onye ọ bụla rụrụ, nke o wuru n’elu ntọala ahụ, adịgide,+ ọ ga-anata ụgwọ ọrụ;+ 15  ọ bụrụ na ọkụ erepịa ọrụ onye ọ bụla, ihe ga-efunahụ ya, ma a ga-azọpụta ya onwe ya;+ ma, ọ bụrụ otú ahụ, ọ ga-adị ka ọ̀ bụ site n’ọkụ.+ 16  Ọ̀ bụ na unu amaghị na unu bụ ụlọ nsọ Chineke,+ nakwa na mmụọ Chineke bi n’ime unu?+ 17  Ọ bụrụ na onye ọ bụla ebibie ụlọ nsọ Chineke, Chineke ga-ebibi ya;+ n’ihi na ụlọ nsọ Chineke dị nsọ,+ bụ́ ụlọ nsọ+ nke unu bụ.+ 18  Ka onye ọ bụla ghara ịrafu onwe ya: Ọ bụrụ na onye ọ bụla chere na ya maara ihe+ n’usoro ihe a, ya ghọọ onye nzuzu, ka o wee bụrụ onye maara ihe.+ 19  N’ihi na amamihe nke ụwa a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ;+ n’ihi na e dere, sị: “Ọ na-ejide ndị maara ihe n’aghụghọ ha.”+ 20  E dekwara, sị: “Jehova maara na ihe ndị maara ihe na-atụgharị n’uche bụ ihe efu.”+ 21  N’ihi ya, ka onye ọ bụla ghara iji ndị mmadụ na-anya isi; n’ihi na ihe niile bụ nke unu,+ 22  ma ọ̀ bụ Pọl ma ọ bụ Apọlọs+ ma ọ bụ Sifas ma ọ bụ ụwa ma ọ bụ ndụ ma ọ bụ ọnwụ ma ọ bụ ihe ndị dị adị ugbu a n’ebe a ma ọ bụ ihe ndị gaje ịbịa,+ ihe niile bụ nke unu; 23  unu onwe unu bụ nke Kraịst;+ ma Kraịst bụ nke Chineke.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji