Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Kọrịnt 13:1-13

13  Ọ bụrụ na m na-ekwu okwu n’asụsụ dị iche iche nke ụmụ mmadụ+ na nke ndị mmụọ ozi, ma enweghị m ịhụnanya, aghọwo m ngwá egwú bras nke na-ada ụda ma ọ bụ ájà nke na-eme mkpọtụ.+  Ọ bụrụkwa na m nwere onyinye ibu amụma,+ marakwa ihe nzuzo dị nsọ+ niile na ihe ọmụma niile,+ ọ bụrụkwa na m nwere okwukwe niile iji bupụ ugwu,+ ma enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị ihe m bụ.+  Ọ bụrụkwa na m na-enye ihe niile m nwere iji zụọ ndị ọzọ,+ ọ bụrụkwa na mụ enyefee ahụ́ m,+ ka m wee nyaa isi, ma enweghị m ịhụnanya,+ ọ baghịrị m uru ọ bụla.  Ịhụnanya+ nwere ogologo ntachi obi+ na obiọma.+ Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo,+ ọ dịghị etu ọnụ,+ ọ dịghị afụli onwe ya elu,+  ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị,+ ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya,+ ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe.+ Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ.+  Ọ dịghị aṅụrị ọnụ n’ihi ajọ omume,+ kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ.+  Ọ na-edi ihe niile,+ na-ekwere ihe niile,+ na-enwe olileanya ihe niile,+ na-atachi obi n’ihe niile.+  Ịhụnanya adịghị ada ada.+ Ma ọ bụrụ na e nwere onyinye ibu amụma, a ga-ewepụ ha; ọ bụrụ na e nwere ịsụ asụsụ dị iche iche, ha ga-akwụsị; ọ bụrụ na e nwere ihe ọmụma, a ga-ewepụ ya.+  N’ihi na anyị nwere ihe ọmụma na-ezughị ezu,+ anyị na-ebukwa amụma n’ụzọ na-ezughị ezu;+ 10  ma mgbe ihe ahụ nke zuru ezu bịarutere,+ a ga-ewepụ ihe ahụ nke na-ezughị ezu. 11  Mgbe m bụ nwa ọhụrụ, m na-ekwu okwu dị ka nwa ọhụrụ, na-eche echiche dị ka nwa ọhụrụ, na-ele ihe anya dị ka nwa ọhụrụ; ma ugbu a m ghọrọ dimkpa,+ ahapụwo m omume nwa ọhụrụ. 12  N’ihi na ka ọ dị ugbu a, anyị ji enyo ígwè+ na-ahụ ihe inyoghi inyoghị, ma mgbe ahụ, ọ ga-abụ ihu na ihu.+ Ka ọ dị ugbu a, m maara ihe n’ụzọ na-ezughị ezu, ma mgbe ahụ, m ga-amara ihe n’ụzọ ziri ezi ọbụna dị ka a maara m n’ụzọ ziri ezi.+ 13  Otú ọ dị, ihe ndị fọdụrụ ugbu a bụ okwukwe, olileanya, ịhụnanya, ihe atọ ndị a; ma nke kasị n’ime ha bụ ịhụnanya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji