Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Kọrịnt 12:1-31

12  N’ihe banyere onyinye nke mmụọ nsọ,+ ụmụnna m, achọghị m ka unu bụrụ ndị na-amaghị nke a na-akọ.  Unu maara na mgbe unu bụ ndị mba ọzọ,+ a na-eduhie unu ife arụsị+ ndị ahụ na-adịghị ekwu okwu,+ dị nnọọ ka e duhiere unu.  Ya mere, achọrọ m ka unu mara na ọ dịghị onye ọ bụla nke na-ekwu okwu site n’ike mmụọ Chineke nke na-asị: “Jizọs bụ onye a bụrụ ọnụ!”+ ọ dịghịkwa onye ọ bụla pụrụ ịsị: “Jizọs bụ Onyenwe anyị!” ma ọ́ bụghị site n’ike mmụọ nsọ.+  E nwere onyinye dị iche iche,+ ma e nwere otu mmụọ nsọ ahụ;+  e nwekwara ije ozi dị iche iche,+ ma e nwere otu Onyenwe anyị ahụ;+  e nwekwara ịrụ ọrụ dị iche iche,+ ma ọ bụ otu Chineke ahụ+ bụ́ onye na-arụ ihe niile n’ime mmadụ niile.+  Ma a na-eme ka mmụọ nsọ pụta ìhè n’ime onye ọ bụla maka nzube bara uru.+  Dị ka ihe atụ, a na-esite n’ike mmụọ nsọ nye otu onye okwu amamihe,+ nye onye ọzọ okwu ihe ọmụma+ dị ka otu mmụọ nsọ ahụ si dị,  nye onye ọzọ okwukwe+ site n’otu mmụọ nsọ ahụ, nye onye ọzọ onyinye ịgwọ ọrịa+ site n’otu mmụọ nsọ ahụ, 10  nyekwa onye ọzọ ịrụ ọrụ dị ike,+ nye onye ọzọ ibu amụma,+ nye onye ọzọ nghọta+ nke okwu si n’ike mmụọ nsọ,+ nye onye ọzọ ịsụ asụsụ dị iche iche,+ nyekwa onye ọzọ nkọwa+ nke asụsụ dị iche iche. 11  Ma ọrụ ndị a niile ka otu mmụọ nsọ ahụ na-arụ.+ Ọ na-ekenye+ onye ọ bụla n’otu n’otu dị ka o si chọọ.+ 12  N’ihi na dị nnọọ ka ahụ́ ahụ bụ otu ma nwee ọtụtụ akụkụ, ọ bụ ezie na akụkụ niile nke ahụ́ ahụ dị ọtụtụ, ha bụ otu ahụ́,+ otú ahụ ka Kraịst dịkwa.+ 13  N’ihi na n’ezie e mere anyị niile baptizim+ site n’otu mmụọ nsọ ịbụ otu ahụ́, ma ànyị bụ ndị Juu ma ànyị bụ ndị Grik, ma ànyị bụ ndị ohu ma ànyị bụ ndị nweere onwe ha, e mekwara ka anyị niile ṅụọ+ otu mmụọ nsọ. 14  N’ihi na, n’ezie, ahụ́ ahụ abụghị otu akụkụ, kama ọ bụ ọtụtụ akụkụ.+ 15  Ọ bụrụ na ụkwụ asị: “N’ihi na abụghị m aka, abụghị m akụkụ ahụ́,” ọ bụghị ya mere ọ ga-eji ghara ịbụ akụkụ ahụ́.+ 16  Ọ bụrụkwa na ntị asị: “N’ihi na abụghị m anya, abụghị m akụkụ ahụ́,” ọ bụghị ya mere ọ ga-eji ghara ịbụ akụkụ ahụ́.+ 17  Ọ bụrụ na ahụ́ dum bụ anya, olee ebe ike ịnụ ihe ga-adị? Ọ bụrụ na ahụ́ dum bụ ike ịnụ ihe, olee ebe ike ịnụ ísì ga-adị? 18  Ma ugbu a, Chineke edebewo akụkụ ndị ahụ n’ahụ́, nke ọ bụla n’ime ha, dị nnọọ ka o si dị ya mma.+ 19  Ọ bụrụ na ha dum bụ otu akụkụ ahụ́,+ olee ebe ahụ́ dum ga-adị? 20  Ma ugbu a, ha bụ ọtụtụ akụkụ ahụ́,+ ma ha bụ otu ahụ́. 21  Anya apụghị ịgwa aka, sị: “Ị dịghị m mkpa”; ma ọ bụ, isi apụghịkwa ịgwa ụkwụ, sị: “Ị dịghị m mkpa.” 22  Ma ọ na-abụkarị na akụkụ ahụ́ ndị dị ka ọ̀ bụ na ha adịghị ike+ dị mkpa, 23  akụkụ ahụ́ ndị anyị chere na ha ekwesịchaghị nsọpụrụ, ọ bụ ha ka anyị na-enye nsọpụrụ ka ukwuu,+ n’ihi ya kwa, akụkụ ahụ́ anyị ndị na-amaghị mma n’anya mara mma nke ukwuu karị, 24  ma ọ dịghị ihe na-akpa akụkụ ahụ́ anyị ndị mara mma ile anya. Otú o sina dị, Chineke jikọtara ahụ́ ọnụ, na-enye akụkụ ahụ́ ndị ihe kọrọ nsọpụrụ dị ukwuu karị, 25  ka e wee ghara inwe nkewa n’ahụ́, kama ka akụkụ ya niile wee na-elekọta ibe ha+ n’otu ụzọ ahụ. 26  Ọ bụrụkwa na otu akụkụ ahụ́ na-ata ahụhụ, akụkụ ndị ọzọ dum na-eso ya ata ahụhụ;+ ma ọ bụ, ọ bụrụ na e mee ka otu akụkụ ahụ́ dị ebube,+ akụkụ ahụ́ ndị ọzọ niile na-eso ya aṅụrị ọṅụ.+ 27  Unu bụ ahụ́ nke Kraịst, bụrụkwa akụkụ ahụ́ n’otu n’otu.+ 28  Chineke edebewokwa ndị dị iche iche n’ọgbakọ,+ nke mbụ, ndịozi;+ nke abụọ, ndị amụma;+ nke atọ, ndị ozizi;+ nke ọzọ, ọrụ ndị dị ike;+ nke ọzọ, onyinye ịgwọ ọrịa;+ ọrụ enyemaka,+ ikike inye nduzi,+ ịsụ asụsụ dị iche iche.+ 29  Ọ̀ bụ ha niile bụ ndịozi? Ọ̀ bụ ha niile bụ ndị amụma? Ọ̀ bụ ha niile bụ ndị ozizi? Ọ̀ bụ ha niile na-arụ ọrụ dị ike? 30  Ọ̀ bụ ha niile nwere onyinye ịgwọ ọrịa? Ọ̀ bụ ha niile na-asụ asụsụ dị iche iche?+ Ọ̀ bụ ha niile bụ ndị nsụgharị?+ 31  Ma jirinụ ịnụ ọkụ n’obi na-achọ onyinye ndị ka ukwuu.+ Ma m ga-egosi unu ụzọ kasị mma.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji