Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Eze 9:1-28

9  O wee ruo na ozugbo Sọlọmọn wuchara ụlọ+ Jehova na ụlọ eze+ na ihe niile dị Sọlọmọn ezi mma nke o nwere mmasị ịrụ,+  Jehova wee pụta ìhè n’ihu Sọlọmọn nke ugboro abụọ, otú ahụ o si pụta ìhè n’ihu ya na Gibiọn.+  Jehova wee sị ya: “Anụwo m ekpere+ gị na arịrịọ ị rịọrọ ka e meere gị amara bụ́ nke ị rịọrọ n’ihu m. Emewo m ka ụlọ a i wuru dị nsọ+ site n’ime ka aha m dịrị na ya+ ruo mgbe a na-akaghị aka; anya m+ na obi m ga-adịkwa na ya mgbe niile.+  Ọ bụrụ na i jee ije+ n’ihu m, dị nnọọ ka Devid+ nna gị jere, n’obi na-eguzosi ike n’ezi ihe+ nakwa n’izi ezi+ site n’ime ihe niile m nyere gị n’iwu+ ma debe ụkpụrụ+ m na mkpebi ikpe m,+  m ga-emekwa ka ocheeze nke alaeze gị n’Izrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dị nnọọ ka m kwere Devid nna gị nkwa, sị, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe nwoke si n’ahụ́ gị nọ n’ocheeze Izrel.’+  Ọ bụrụ na unu onwe unu na ụmụ unu akwụsị iso m+ ma ghara idebe iwu m na ụkpụrụ m bụ́ ndị m nyere unu, unu ewee gaa fee chi ọzọ+ ma na-akpọrọ ha isiala,  m ga-ebipụkwa Izrel n’elu ala ahụ m nyere ha;+ m ga-esikwa n’ihu m tụfuo ụlọ ahụ nke m doro nsọ nye aha m,+ Izrel ga-aghọkwa ihe e ji atụ ilu+ na ihe ịkwa emo n’etiti ndị niile.  Ụlọ a ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe.+ Onye ọ bụla nke na-agafe ya ga-ekporopụ anya,+ ọ ga-afụkwa mkpọrọhịhị, sị, ‘N’ihi gịnị ka Jehova ji mee ala a na ụlọ a otú ahụ?’+  Ha ga-asịkwa, ‘Ọ bụ n’ihi na ha hapụrụ Jehova bụ́ Chineke ha bụ́ onye kpọpụtara ndị nna nna ha n’ala Ijipt,+ ha wee soro chi ọzọ+ dị iche iche wee kpọọrọ ha isiala ma fee ha. Ọ bụ ya mere Jehova ji mee ka ọdachi a dum dakwasị ha.’”+ 10  O wee ruo mgbe afọ iri abụọ gwụchara, bụ́ nke Sọlọmọn ji wuo ụlọ abụọ ahụ, ụlọ Jehova+ na ụlọ eze,+ 11  (Haịram+ bụ́ eze Taya bunyere Sọlọmọn+ ogwe osisi sida na ogwe osisi junipa, nakwa ọlaedo ruo n’ókè ọ masịrị ya,)+ na Eze Sọlọmọn nyere Haịram obodo iri abụọ n’ala Galili n’oge ahụ.+ 12  N’ihi ya, Haịram si na Taya gawa ịhụ obodo ndị ahụ Sọlọmọn nyere ya, ma ha adịchaghị mma n’anya ya.+ 13  O wee sị: “Olee ụdị obodo ndị dị ihe a i nyere m, nwanne m?” E wee kpọọ ha Ala Kebul ruo taa. 14  Ka nke a na-eme, Haịram zigaara eze otu narị talent ọlaedo na iri abụọ.+ 15  Nke a bụ ihe ndekọ banyere ndị a kpọọrọ ịrụ ọrụ mmanye+ bụ́ ndị Eze Sọlọmọn manyere ịrụ ụlọ Jehova+ na ụlọ nke ya na Milo*+ na mgbidi+ Jeruselem na Hezọ+ na Megido+ na Giza.+ 16  (Fero bụ́ eze Ijipt agbagoteworị wee weghara Giza ma gbaa ya ọkụ, o wee gbuo ndị Kenan+ bi n’obodo ahụ. O wee nye ya ada ya, bụ́ nwunye Sọlọmọn, ka ọ bụrụ ihe o ji duo ya ụlọ.)+ 17  Sọlọmọn wee wuo Giza na Bet-horọn Ndịda,+ 18  na Belat+ na Tema nke dị n’ala ịkpa, n’ala ahụ, 19  na obodo niile a na-akwakọba ihe+ bụ́ ndị ghọrọ nke Sọlọmọn nakwa obodo ụgbọ ịnyịnya+ na obodo ndị bụ́ maka ndị na-agba ịnyịnya, na ihe ndị dị Sọlọmọn+ ezi mma bụ́ ndị o nwere ọchịchọ iwu na Jeruselem nakwa na Lebanọn nakwa n’ala dum ọ na-achị. 20  Ma ndị niile fọdụrụnụ ná ndị Amọraịt,+ ndị Het,+ ndị Perizaịt,+ ndị Haịvaịt+ na ndị Jibọs,+ bụ́ ndị na-esoghị n’ụmụ Izrel,+ 21  ụmụ ha ndị fọdụrụnụ n’ala ahụ mgbe ha nwụworo bụ́ ndị ụmụ Izrel na-enweghị ike ibibi,+ ruo taa, Sọlọmọn nọ na-amanye ha ka ha na-arụ ọrụ a na-amanye ndị ohu ịrụ.+ 22  Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel Sọlọmọn ji mere ohu;+ n’ihi na ọ bụ ha bụ ndị agha na ndị na-ejere ya ozi na ndị o mere ndị isi na ndị na-esote ndị isi agha ya na ndị isi nke ndị na-anya ụgbọ ịnyịnya ya na ndị isi nke ndị na-agba ịnyịnya ya.+ 23  Ọ bụ ndị a bụ ndị isi nke ndị na-anọchite anya eze, bụ́ ndị isi ọrụ Sọlọmọn, narị mmadụ ise na iri ise, bụ́ ndị ndú nke ndị na-arụ ọrụ ahụ.+ 24  Otú ọ dị, ada Fero+ si n’Obodo Devid+ pụta gaa n’ụlọ nke ya, nke o wuuru ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ rụrụ Milo.+ 25  Sọlọmọn wee na-achụ àjà nsure ọkụ na àjà udo ugboro atọ+ n’afọ n’elu ebe ịchụàjà nke o wuuru Jehova,+ a na-esurekwa ihe nsure ọkụ n’ebe ịchụàjà ahụ,+ nke dị n’ihu Jehova; o wee wuchaa ụlọ ahụ.+ 26  E nwekwara ọtụtụ ụgbọ mmiri ndị Eze Sọlọmọn rụrụ n’Iziọn-giba,+ bụ́ nke dị n’akụkụ Ilọt,+ n’ụsọ Oké Osimiri Uhie, n’ala Idọm.+ 27  Haịram wee jiri ọtụtụ ụgbọ mmiri ndị ahụ na-eziga ndị na-ejere ya ozi,+ ndị ọrụ ụgbọ mmiri, bụ́ ndị oké osimiri doro anya, ha na ndị na-ejere Sọlọmọn ozi. 28  Ha wee gaa Ofa+ bute narị talent ọlaedo+ anọ na iri abụọ n’ebe ahụ ma bulatara ya Eze Sọlọmọn.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

1Ez 9:15*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mkputamkpu ala.”