Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Eze 3:1-28

3  Sọlọmọn wee ghọọ ọgọ+ Fero, bụ́ eze Ijipt, o wee lụrụ ada+ Fero ma kpọlata ya n’Obodo Devid,+ ruo mgbe o wusịrị ụlọ ya+ na ụlọ Jehova+ nakwa mgbidi gbara Jeruselem gburugburu.+  Ma ndị Izrel nọ na-achụ àjà n’ebe ndị dị elu,+ n’ihi na ọ dịbeghị ụlọ e wuuru aha Jehova ruo n’oge ahụ.+  Sọlọmọn wee hụ Jehova n’anya+ site n’ije ije n’ụkpụrụ Devid bụ́ nna ya.+ Naanị na ọ bụ n’ebe ndị dị elu+ ka ọ na-achụ àjà mgbe niile, na-esurekwa àjà n’ọkụ.  Ya mere, eze gara Gibiọn+ ịchụ àjà n’ebe ahụ, n’ihi na ebe ahụ bụ nnukwu ebe dị elu.+ Sọlọmọn wee jiri otu puku anụ chụọ àjà nsure ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ahụ.+  Na Gibiọn Jehova pụtara ìhè+ n’ihu Sọlọmọn ná nrọ+ n’abalị; Chineke wee sị: “Rịọ ihe m ga-enye gị.”+  Sọlọmọn wee sị: “Gị onwe gị egosiwo obiọma*+ dị ukwuu n’ebe ohu gị Devid nna m nọ n’ihi na o jere ije n’ihu gị n’eziokwu nakwa n’ezi omume,+ jirikwa obi ziri ezi o nwere n’ebe ị nọ jee ije; i wee na-enwe obiọma a dị ukwuu n’ebe ọ nọ, nke mere na i nyere ya nwa nwoke ka ọ nọkwasị n’ocheeze ya dị ka ọ dị taa.+  Ma Jehova bụ́ Chineke m, gị onwe gị emewo ohu gị eze n’ọnọdụ Devid nna m, m ka bụkwa nwata.+ Amaghị m otú e si apụ apụ, amaghịkwa m otú e si abata abata.+  Ohu gị nọkwa n’etiti ndị gị ị họọrọ,+ bụ́ ìgwè mmadụ a na-apụghị ịgụ ọnụ ma ọ bụ ịgụta ọnụ n’ihi ịdị ọtụtụ.+  Nye ohu gị obi na-erube isi iji kpee ndị gị ikpe,+ iji mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ;+ n’ihi na ònye pụrụ ikpe ndị gị nke a na-enye nsogbu+ ikpe?”+ 10  Ihe a wee dị mma n’anya Jehova, maka na Sọlọmọn rịọrọ ihe a.+ 11  Chineke wee sị ya: “Ebe ọ bụ na ị rịọrọ ihe a, ị rịọghịkwara onwe gị ọtụtụ ụbọchị ma ọ bụ rịọrọ onwe gị akụnụba+ ma ọ bụ rịọ mkpụrụ obi ndị iro gị, ị rịọkwara ka e nye gị nghọta ị ga-eji na-anụ okwu ikpe dị iche iche,+ 12  lee! m ga-eme ihe i kwuru.+ Lee! M ga-enye gị obi nwere amamihe na nke na-aghọta ihe,+ nke mere na ọ dịtụbeghị onye dị ka gị dịworo ndụ tupu gị onwe gị, ọ dịghịkwa onye ga-ebili mgbe ị nwụsịrị nke ga-adị ka gị.+ 13  M ga-enyekwa gị ihe ndị ị na-arịọghị,+ ma akụnụba+ ma ebube, nke mere na a gaghị enwe eze ọ bụla nke ga-adị ka gị, n’ụbọchị gị niile.+ 14  Ọ bụrụkwa na i jee ije n’ụzọ m site n’idebe ụkpụrụ+ m na ihe m nyere n’iwu, dị nnọọ ka Devid bụ́ nna gị jere,+ m ga-emekwa ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo.”+ 15  Mgbe Sọlọmọn tetara,+ lee, ọ bụ nrọ. O wee bịa na Jeruselem ma guzoro n’ihu igbe+ ọgbụgba ndụ Jehova wee chụọ àjà nsure ọkụ na àjà udo,+ meekwara ndị niile na-ejere ya ozi+ oriri.+ 16  N’oge ahụ, ndị inyom abụọ, bụ́ ndị akwụna,+ bịakwutere eze wee guzoro n’ihu ya.+ 17  Otu n’ime ụmụ nwaanyị ahụ wee sị: “Biko, onyenwe m,+ mụ na nwaanyị a bi n’otu ụlọ, nke mere na mụ na ya nọ mgbe m mụrụ nwa n’ụlọ. 18  O wee ruo n’ụbọchị nke atọ mgbe m mụsịrị nwa, nwaanyị a mụrụ nwa. Anyị bi n’otu ebe. Ọ dịghị onye bịara abịa anyị na ya nọ n’ụlọ, ọ dịghị onye ọ bụla ọzọ nọ n’ụlọ ma e wezụga anyị abụọ. 19  E mesịa, nwa nwaanyị a nwụrụ n’abalị, n’ihi na o dinagidere ya. 20  Ya mere, o biliri n’etiti abalị wee kuru nwa m n’akụkụ m mgbe ohu gị nwaanyị na-arahụ ụra ma nyiwe ya n’obi ya, ma nyiwe nwa ya nwụrụ anwụ n’obi m. 21  Mgbe m biliri n’ụtụtụ inye nwa m ara,+ lee, ọ nwụrụ anwụ. Ya mere, m leruru ya anya nke ọma n’ụtụtụ, ma, lee! ọ bụghị nwa m nke m mụrụ.” 22  Ma nwaanyị nke ọzọ ahụ sịrị: “Ee e, nke dị ndụ bụ nwa m, nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị!” Ma nwaanyị a nọ na-asị: “Ee e, nke dị ndụ bụ nwa m, nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị.” Ha wee na-ekwu okwu n’ihu eze.+ 23  N’ikpeazụ, eze sịrị: “Onye nke a na-asị, ‘Nke a dị ndụ bụ nwa m, nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị!’ onye nke ọzọ na-asịkwa, ‘Ee e, nke nwụrụ anwụ bụ nwa gị, nke dị ndụ bụ nwa m!’” 24  Eze wee gaa n’ihu ịsị:+ “Wetaranụ m mma agha.” Ha wee weta mma agha n’ihu eze. 25  Eze wee sị: “Kpọwaanụ nwa ahụ dị ndụ abụọ, werenụ otu akụkụ nye otu nwaanyị, werekwanụ akụkụ nke ọzọ nye nwaanyị nke ọzọ.” 26  Ozugbo ahụ, nwaanyị nke nwa ya bụ nke dị ndụ sịrị eze (n’ihi na obi nwa+ mewere ya,+ nke mere na ọ sịrị): “Biko,+ onyenwe m! Nyenụ ya nwa ahụ dị ndụ. Unu egbula ya ma ọlị.” Ma nwaanyị nke ọzọ ahụ nọ na-asị: “Ọ gaghị abụ nke gị, ọ gaghịkwa abụ nke m. Kpọwaanụ ya!”+ 27  Eze wee zaa, sị: “Nyenụ ya nwa ahụ dị ndụ, unu egbula ya ma ọlị. Ọ bụ ya bụ nne ya.” 28  Izrel dum wee nụ ikpe ahụ eze kpere;+ ha wee tụọ egwu n’ihi eze,+ n’ihi na ha hụrụ na amamihe+ Chineke dị n’ime ya iji na-ekpe ikpe ziri ezi.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

1Ez 3:6*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”