Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Eze 20:1-43

20  Ma Ben-hedad+ eze Siria chịkọtara ndị agha ya niile, ndị eze iri atọ na abụọ sokwa ya,+ tinyere ịnyịnya+ na ụgbọ ịnyịnya,+ o wee gbagoo nọchibido+ Sameria,+ buso ya agha.  O wee zigara Ehab eze Izrel ndị ozi+ n’obodo. O wee sị ya: “Nke a bụ ihe Ben-hedad kwuru,  ‘Ọlaọcha gị na ọlaedo gị bụ nke m, ndị nwunye gị na ụmụ gị, ndị kasị mma ile anya, bụ nke m.’”+  Eze Izrel wee zaa, sị: “Onyenwe m bụ́ eze, dị ka okwu gị si dị, abụ m nke gị, ihe niile m nwere bụkwa nke gị.”+  E mesịa, ndị ozi ahụ bịaghachiri wee sị: “Nke a bụ ihe Ben-hedad kwuru, ‘M ziri gị ozi, sị: “Ị ga-enye m ọlaọcha gị na ọlaedo gị na ndị nwunye gị na ụmụ gị.”  Ma ụdị ugbu a echi, m ga-ezitere gị ndị na-ejere m ozi, ha ga-enyocha ụlọ gị na ụlọ ndị na-ejere gị ozi nke ọma; ọ ga-erukwa na ihe ọ bụla dị mma+ n’anya gị ka ha ga-ewere, ha ga-ewerekwa ya pụọ.’”  Eze Izrel wee kpọọ ndị okenye niile nke ala+ ahụ òkù, sị: “Biko, tụleenụ ihe a ma hụrụ na ọ bụ ọdachi ka onye a na-achọ;+ n’ihi na o ziteere m ozi ka m kpọnye ya ndị nwunye m na ụmụ m, ka m nyekwa ya ọlaọcha m na ọlaedo m, ajụghịkwa m inye ya ha.”  Ndị okenye ahụ niile na ndị niile ahụ sịrị ya: “Emela ihe o kwuru, ekwekwala.”  O wee sị ndị ozi Ben-hedad: “Gwa onyenwe m bụ́ eze, sị, ‘M ga-eme ihe dum i ziri ohu gị na mbụ; ma nke a, enweghị m ike ime ya.’” Ndị ozi ahụ wee lawa, gaa kọọrọ ya otú ha si jee. 10  Ben-hedad wee zie ya sị: “Ka chi+ m mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya,+ ma ọ bụrụ na ájá Sameria ga-eju ọbụ aka ndị niile so m!”+ 11  Eze Izrel wee zaa, sị: “Gwanụ ya, sị, ‘Ka onye ka na-eke ekike+ agha eke ghara ịnya isi dị ka onye na-atọpụ ya atọpụ.’”+ 12  O wee ruo na ngwa ngwa ọ nụrụ okwu a, mgbe ya na ndị eze ahụ nọ na-aṅụ mmanya+ n’ụlọ ndò, ọ gwara ndị na-ejere ya ozi ozugbo, sị: “Jikerenụ!” Ha wee malite ijikere ibuso obodo ahụ agha. 13  Ma, lee! otu onye amụma bịakwutere Ehab eze Izrel+ wee sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru,+ ‘Ị̀ hụwo oké ìgwè mmadụ a dum? Lee, m ga-enyefe ha n’aka gị taa, ị ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’”+ 14  Ehab wee sị: “Ọ̀ bụ site n’aka onye?” o wee zaa, sị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ọ bụ site n’aka ụmụ okorobịa nke ndị isi ógbè dị iche iche a na-achị achị.’” N’ikpeazụ, ọ sịrị: “Ọ̀ bụ onye ga-amalite agha ahụ?” o wee zaa, sị: “Ọ bụ gị!” 15  O wee gụọ ụmụ okorobịa nke ndị isi ógbè dị iche iche a na-achị achị ọnụ, ha wee dị narị mmadụ abụọ na iri atọ na abụọ;+ mgbe ọ gụsịrị ha, ọ gụrụ mmadụ niile, bụ́ ụmụ Izrel niile, puku mmadụ asaa. 16  Ha wee pụwa n’ehihie mgbe Ben-hedad nọ n’ụlọ ndò na-aṅụbiga mmanya ókè,+ ya na ndị eze ahụ, ndị eze iri atọ na abụọ ahụ bụ́ ndị na-enyere ya aka. 17  Mgbe ụmụ okorobịa+ nke ndị isi ógbè dị iche iche bu ụzọ pụta, Ben-hedad zipụrụ ozi ozugbo ahụ; ha wee bịa gwa ya, sị: “E nwere ndị ikom si Sameria bịa.” 18  O wee sị: “Ọ bụrụ na ha bịara maka udo, jidenụ ha ná ndụ; ya abụrụkwanụ na ha bịara maka agha, ọ bụ ná ndụ ka unu ga-ejide ha.”+ 19  Ndị a bụ ndị si n’obodo pụta, ụmụ okorobịa nke ndị isi ógbè dị iche iche na ìgwè ndị agha so ha n’azụ. 20  Onye nke ọ bụla wee malite igbu onye ọ bụ ya na ya; ndị Siria+ wee gbaa ọsọ,+ ndị Izrel wee chụwa ha, ma Ben-hedad bụ́ eze Siria nọkwasịrị n’ịnyịnya gbaa ọsọ, ya na ndị na-agba ịnyịnya. 21  Ma eze Izrel pụrụ wee na-ebibi ịnyịnya na ụgbọ ịnyịnya ha,+ o wee sụọ ndị Siria akwụ. 22  E mesịa, onye amụma+ ahụ bịakwutere eze Izrel wee sị ya: “Lawa, mee onwe gị ka ị dị ike,+ tụlee ihe a ma mara ihe ị gaje ime;+ n’ihi na ná mmalite afọ, eze Siria ga-agbagote ibuso gị agha.”+ 23  Ma ndị na-ejere eze Siria ozi sịrị ya: “Chineke ha bụ Chineke ugwu.+ Ọ bụ ya mere ha ji kara anyị ike. Ya mere, ka anyị buso ha agha n’ala dị larịị ka anyị hụ ma ọ̀ bụ na anyị agaghị aka ha ike. 24  Meekwa nke a: Wepụ ndị eze,+ onye nke ọ bụla n’ọnọdụ ya ma were ndị gọvanọ dochie ha.+ 25  Ma gị onwe gị ga-agụpụtara onwe gị ìgwè ndị agha há ka ìgwè ndị agha gị e gburu egbu, jiri ịnyịnya dochie ịnyịnya, jirikwa ụgbọ ịnyịnya dochie ụgbọ ịnyịnya; ka anyị buso ha agha n’ala dị larịị ka anyị hụ ma ọ̀ bụ na anyị agaghị aka ha ike.”+ Ya mere, o gere ntị n’olu ha wee mee nnọọ otú ahụ. 26  O wee ruo ná mmalite afọ na Ben-hedad mere ka ndị Siria+ zukọta wee gaa n’Efek+ maka ibuso Izrel agha. 27  Ma a kpọkọtara ụmụ Izrel ma nye ha ihe ndị dị ha mkpa,+ ha wee malite ịpụ izute ha; ụmụ Izrel wee maa ụlọikwuu n’ihu ha dị ka obere ìgwè ewu abụọ, ebe ndị Siria n’onwe ha jupụtara elu ala ahụ.+ 28  Onye nke ezi Chineke+ bịaruru nso wee sị eze Izrel, ee, ọ gara n’ihu ịsị: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na ndị Siria sịrị: “Jehova bụ Chineke ugwu, ọ bụghị Chineke nke ndagwurugwu,” m ga-enyefe oké ìgwè mmadụ a dum n’aka gị,+ unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.’”+ 29  Ha wee nọrọ n’ụlọikwuu ruo ụbọchị asaa, cherịta ibe ha ihu.+ O wee ruo n’ụbọchị nke asaa na ha malitere ịlụ agha; ụmụ Izrel wee gbuo ndị Siria, otu narị puku ndị ikom ji ụkwụ aga, n’otu ụbọchị. 30  Ndị fọdụrụ wee gbaga Efek,+ n’ime obodo; mgbidi ya wee dakwasị puku ndị ikom iri abụọ na asaa fọdụrụnụ.+ Ma Ben-hedad gbalagara,+ n’ikpeazụ, ọ batakwara n’ime obodo wee banye n’ime ime+ ụlọ. 31  Ya mere, ndị na-ejere ya ozi sịrị ya: “Lee, anyị anụwo na ndị eze ụlọ Izrel bụ ndị eze obiọma.*+ Biko, ka anyị kee ákwà iru uju+ n’úkwù,+ keekwa eriri n’isi, ka anyị gakwurukwa eze Izrel. Ikekwe, ọ ga-ahapụ mkpụrụ obi gị ndụ.”+ 32  Ha wee kee ákwà iru uju n’úkwù, keekwa eriri n’isi, wee bịakwute eze Izrel, sị: “Ohu gị bụ́ Ben-hedad sịrị, ‘Biko, hapụ mkpụrụ obi m ndụ.’” O wee sị: “Ọ̀ ka dị ndụ? Nwanne m ka ọ bụ.” 33  Ya mere, ndị ikom+ ahụ weere ya dị ka ihe mgbaàmà, nabatakwa ya ngwa ngwa dị ka mkpebi si ya n’obi, ha wee sị: “Ben-hedad bụ nwanne gị.” O wee sị: “Kpọrọnụ ya bịa.” Ben-hedad wee gakwuru ya; o wee mee ka ọ rịgoro n’ụgbọ ịnyịnya ozugbo.+ 34  Ben-hedad wee sị ya: “M ga-enyeghachi gị obodo+ niile nna m naara nna gị; ị ga-enweta okporo ámá na Damaskọs dị ka nna m nwetara na Sameria.” Ehab wee sị, “Mụ na gị ga-agba ndụ+ tupu mụ ahapụ gị ka ị lawa.” Ya na ya wee gbaa ndụ, o wee hapụ ya ka ọ lawa. 35  Otu nwoke, nke bụ́ otu n’ime ụmụ ndị amụma,+ gwara enyi ya dị ka Jehova kwuru,+ sị: “Biko, tie m ihe.” Ma nwoke ahụ jụrụ iti ya ihe. 36  Ya mere, ọ sịrị ya: “Ebe ọ bụ na i geghị ntị n’olu Jehova, lee, ka ị na-apụ n’ebe m nọ, ọdụm ga-adọgbu gị.” E mesịa, o si n’ebe ọ nọ pụọ, ọdụm+ wee hụ ya ma dọgbuo ya.+ 37  O wee hụ nwoke ọzọ wee sị: “Biko, tie m ihe.” Nwoke ahụ wee tie ya ihe, tirụọ ya ahụ́. 38  Onye amụma ahụ gara guzoro otu ebe n’okporo ụzọ wee chere eze, o ji ákwà kechie anya ya ka a ghara ịmata ya.+ 39  O wee ruo na mgbe eze na-agafe, o tikuru eze, sị:+ “Ohu gị gara n’ebe agha kpụ ọkụ n’ọnụ; ma, lee! otu nwoke si n’ọgbọ agha na-apụ, o wee dutere m otu nwoke ma sị, ‘Chee nwoke a nche. O nwee ka e si chọọ ya achọ, a ga-eji mkpụrụ obi gị+ dochie anya mkpụrụ obi ya,+ ma ọ́ bụghị otú ahụ, ị ga-akwụ otu talent ọlaọcha.’+ 40  O wee ruo na ka ohu gị nọ na-eme nke a, na-emekwa nke ọzọ, lee, ọ gbara ọsọ.” Eze Izrel wee sị ya: “Otú ahụ ka ikpe gị ga-adị. Gị onwe gị ekpebiwo ya.”+ 41  O wee wepụ ákwà ahụ n’anya ya ọsọ ọsọ, eze Izrel wee mata ya, na ọ bụ otu n’ime ndị amụma.+ 42  O wee sị ya: “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘Ebe ọ bụ na ị hapụwo nwoke m kpebiri na a ga-ebibi+ ka o si n’aka gị laa, a ga-eji mkpụrụ obi gị dochie anya mkpụrụ obi ya,+ jirikwa ndị gị dochie anya ndị ya.’”+ 43  Eze Izrel wee lawa n’ụlọ ya ná mwute nakwa ná mgbarụ ihu,+ wee lọrute Sameria.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

1Ez 20:31*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”