Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Eze 14:1-31

14  N’oge ahụ, Abaịja nwa Jeroboam dara ọrịa.+  Ya mere, Jeroboam sịrị nwunye ya: “Biko, bilie jigharịa ejiji+ ka a ghara ịmata na ị bụ nwunye Jeroboam, gaakwa Shaịlo. Lee! N’ebe ahụ ka Ahaịja+ onye amụma nọ. Ọ bụ ya gwara m okwu banyere mụ ịghọ eze nke ndị a.+  Werekwa ogbe achịcha+ iri na achịcha ndị a ghasara ihe n’elu na otu karama+ mmanụ aṅụ, gakwuru ya.+ Ọ bụ ya ga-agwa gị ihe ga-eme nwa okoro a.”+  Nwunye Jeroboam wee mee otú ahụ. Ya mere, o biliri gaa Shaịlo+ wee bịarute n’ụlọ Ahaịja. Ma Ahaịja enweghị ike ịhụ ụzọ, n’ihi na o kpuola ìsì n’ihi afọ ndụ ya.+  Ma Jehova gwara Ahaịja, sị: “Lee nwunye Jeroboam ka ọ na-abịa ịjụ gị ase banyere nwa ya nwoke; n’ihi na ọ na-arịa ọrịa. Otú a na otú a ka ị ga-azaghachi ya. Ọ ga-erukwa na ozugbo ọ bịarutere, ọ ga na-eme onwe ya ka a ghara ịmata onye ọ bụ.”+  O wee ruo na ozugbo Ahaịja nụrụ ụda ụkwụ ya ka ọ na-abata n’ọnụ ụzọ, ọ malitere ịsị: “Batawa, gị nwunye Jeroboam.+ Gịnị mere i ji na-eme onwe gị ka a ghara ịmata onye ị bụ ebe ọ bụ na e dunyere m ka m zie gị ozi siri ike?  Lawa, gwa Jeroboam, sị, ‘Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru: “N’ihi na m si n’etiti ndị gị bulie gị elu, ka m wee mee gị onye ndú nke ndị m bụ́ Izrel,+  m wee dọkapụ+ alaeze n’ụlọ Devid ma nye gị ya, ma ị dịghị ka ohu m Devid, bụ́ onye debere ihe m nyere n’iwu, onye jikwa obi ya dum soro m site n’ime naanị ihe ziri ezi n’anya m,+  kama ị malitere ime ihe ọjọọ karịa ndị niile bu gị ụzọ, i wee gaa meere onwe gị chi ọzọ+ na ihe oyiyi a wụrụ awụ+ iji kpasuo m iwe,+ ọ bụkwa m ka i wezụgara n’azụ gị;+ 10  n’ihi nke ahụ, lee, m ga-eme ka ọdachi dakwasị ụlọ Jeroboam, m ga-ebipụkwa onye ọ bụla bụ́ nwoke+ nke si n’ahụ́ Jeroboam, onye na-enweghị enyemaka na onye na-abaghị n’ihe n’Izrel;+ n’ezie, m ga-ekpochapụ ụlọ Jeroboam,+ dị nnọọ ka mmadụ si ekpopụ nsị ruo mgbe e kpopụchara ya.+ 11  Onye si n’ahụ́ Jeroboam nke nwụrụ n’obodo, nkịta ga-eri ya;+ onye nke nwụrụ n’ọhịa, anụ ufe nke eluigwe ga-eri ya,+ n’ihi na Jehova n’onwe ya ekwuwo ya.”’ 12  “Ma gị onwe gị, bilie laa n’ụlọ gị. Mgbe ị ga-azọbata ụkwụ n’obodo, nwa ahụ ga-anwụ. 13  Izrel dum ga-akwara ya ákwá arịrị+ ma lie ya, n’ihi na n’ime ndị ezinụlọ Jeroboam, ọ bụ naanị onye a ga-aba n’ebe ili ozu; n’ihi na Jehova bụ́ Chineke Izrel ahụwo ihe dị mma n’ime ya n’ụlọ Jeroboam.+ 14  Jehova ga-emekwa ka eze biliere ya+ ịchị Izrel bụ́ onye ga-ebipụ ụlọ Jeroboam n’ụbọchị ahụ, ọ́ bụrụkwanụ ugbu a?+ 15  Jehova ga-ebibikwa Izrel, dị nnọọ ka ahịhịa amị na-aṅagharị na mmiri;+ ọ ga-efopụkwa+ Izrel n’ezi ala a+ nke o nyere ndị nna nna ha, ọ ga-achụsasịkwa+ ha, ha agafee Osimiri Yufretis,+ n’ihi na ha emewo ogwe osisi+ ha ndị dị nsọ, wee na-akpasu Jehova iwe.+ 16  Ọ ga-agbahapụ Izrel+ n’ihi mmehie niile Jeroboam mehiere, ndị o jikwa mee ka Izrel mehie.”+ 17  Nwunye Jeroboam wee bilie lawa, lọrute Teza.+ Mgbe o rutere n’ọnụ ụzọ ụlọ ha, nwa okoro ahụ nwụrụ. 18  Ha wee lie ya, Izrel dum wee kwaara ya ákwá arịrị, dị ka Jehova kwuru site n’ọnụ ohu ya bụ́ Ahaịja onye amụma. 19  Ihe ndị ọzọ metụtara Jeroboam, otú o si buo agha+ na otú o si chịa, e dere ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Izrel. 20  Ụbọchị niile Jeroboam chịrị dị afọ iri abụọ na abụọ, e mesịa, o sooro nna nna ya hà dinaa;+ Nedab+ nwa ya nwoke wee malite ịchị n’ọnọdụ ya. 21  Ma Rehoboam+ nwa Sọlọmọn ghọrọ eze na Juda. Rehoboam gbara afọ iri anọ na otu mgbe ọ malitere ịchị, afọ iri na asaa ka ọ chịrị na Jeruselem, bụ́ obodo+ Jehova họọrọ n’ime ebo+ niile nke Izrel ka aha ya dịrị na ya.+ Aha nne ya bụ Neama, nwaanyị Amọn.+ 22  Juda wee na-eme ihe jọrọ njọ n’anya Jehova,+ nke mere na ha kpaliri+ ya ikwo ekworo karịa otú ndị nna nna ha niile kpaliri ya site ná mmehie niile ha mere.+ 23  Ha onwe ha kwa wee na-ewuru onwe ha ebe dị elu+ na ogidi nsọ+ na ogwe osisi dị nsọ+ n’elu ugwu ọ bụla dị elu+ nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ.+ 24  E nwere ọbụna ndị ikom bụ́ ndị akwụna ụlọ arụsị n’ala ahụ.+ Ha mere omume dị ka ihe arụ niile nke mba ndị ahụ si dị bụ́ ndị Jehova chụpụrụ n’ihu ụmụ Izrel.+ 25  O wee ruo n’ihe dị ka afọ nke ise nke ọchịchị Eze Rehoboam na Shaịshak+ eze Ijipt busoro Jeruselem agha. 26  O wee bukọrọ akụ̀ dị n’ụlọ Jehova na akụ̀ dị n’ụlọ eze;+ o buuru ihe niile.+ O wee buru ọta ọlaedo niile Sọlọmọn rụrụ.+ 27  Eze Rehoboam wee were ọla kọpa rụọ ọta iji dochie ha, o wee nyefee ha n’aka ndị isi ndị ọgba ọsọ,+ bụ́ ndị nche ọnụ ụzọ ụlọ eze.+ 28  Mgbe ọ bụla eze bịara n’ụlọ Jehova, ndị ọgba ọsọ na-eburu ha, ha na-ebughachikwa ha n’ụlọ nche nke ndị ọgba ọsọ.+ 29  Ihe ndị ọzọ metụtara Rehoboam na ihe niile o mere, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ+ ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda? 30  Agha dịkwa mgbe niile n’etiti Rehoboam na Jeroboam.+ 31  N’ikpeazụ, Rehoboam sooro nna nna ya hà dinaa, e wee lie ya n’ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid.+ Aha nne ya bụ Neama, nwaanyị Amọn.+ Abaịjam+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji