Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Eze 11:1-43

11  Eze Sọlọmọn hụkwara ọtụtụ nwunye si mba ọzọ+ n’anya, tinyere ada Fero,+ ndị inyom Moab,+ Amọn,+ Idọm,+ Saịdọn+ na Het,+  ndị si ná mba ndị ahụ Jehova gwara ụmụ Izrel banyere ha, sị: “Abanyela n’etiti ha,+ ha onwe ha ekwesịghịkwa ịbata n’etiti unu; n’eziokwu, ha ga-enweta obi unu iso chi ha.”+ Ọ bụ ha ka Sọlọmọn rapaara n’ahụ́+ ịhụ ha n’anya.  O wee nwee narị nwunye asaa, ndị bụ́ ada ndị eze, na narị ndị iko atọ; ndị nwunye ya wee jiri nke nta nke nta+ mee ka obi ya chigharịa.  O wee ruo mgbe Sọlọmọn na-eme agadi+ na ndị nwunye ya mere ka obi ya chigharịa+ soro chi ọzọ dị iche iche;+ obi ya dum adịghịkwa+ n’ebe Jehova bụ́ Chineke ya nọ dị ka obi Devid nna ya dịrị.  Sọlọmọn wee malite iso Ashtọret+ bụ́ chi nwaanyị ndị Saịdọn nakwa Milkọm+ bụ́ ihe arụ nke ndị Amọn.  Sọlọmọn wee malite ime ihe jọrọ njọ+ n’anya Jehova, o soghịkwa Jehova n’ụzọ zuru ezu dị ka Devid bụ́ nna ya soro.+  Ọ bụ mgbe ahụ ka Sọlọmọn wuuru Kimọsh+ ebe dị elu,+ bụ́ ihe arụ+ nke Moab, n’ugwu+ dị n’ihu+ Jeruselem, wuokwara Molek bụ́ ihe arụ nke ụmụ Amọn.  Ọ bụkwa otú ahụ ka o meere ndị nwunye ya niile si mba ọzọ+ bụ́ ndị na-esure ihe nsure ọkụ ma na-achụrụ chi ha àjà.+  Jehova wee weso Sọlọmọn oké iwe,+ n’ihi na obi ya apụwo n’ebe Jehova bụ́ Chineke Izrel nọ,+ bụ́ onye pụtara ìhè n’ihu ya ugboro abụọ.+ 10  Ọ bụkwa banyere ihe a ka o nyere ya iwu ka ọ ghara iso chi ọzọ dị iche iche;+ ma o debeghị ihe ahụ Jehova nyere ya n’iwu. 11  Jehova wee sị Sọlọmọn: “N’ihi ihe a i mere wee ghara idebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ m nke m nyere gị n’iwu, aghaghị m ịdọkapụ alaeze a n’aka gị, m ga-enyekwa ya onye na-ejere gị ozi.+ 12  Otú ọ dị, agaghị m eme ya n’ụbọchị gị,+ n’ihi Devid nna gị.+ Ọ bụ n’aka nwa gị nwoke ka m ga-adọkapụ ya.+ 13  Naanị na ọ bụghị alaeze a dum ka m ga-adọkapụ.+ Otu ebo ka m ga-enye nwa gị nwoke, n’ihi ohu m Devid,+ nakwa n’ihi Jeruselem bụ́ nke m họọrọ.”+ 14  Jehova wee mee ka e nwee onye ga na-eguzogide+ Sọlọmọn,+ ya bụ, Hedad onye Idọm bụ́ nwa eze. Ọ nọ n’Idọm.+ 15  O wee ruo mgbe Devid meriri Idọm,+ mgbe Joab bụ́ onyeisi ndị agha gbagotere ili ndị e gburu egbu, na ọ nwara igbu nwoke ọ bụla nọ n’Idọm.+ 16  (N’ihi na ọ bụ ọnwa isii ka Joab na Izrel niile biri n’ebe ahụ ruo mgbe o bipụrụ nwoke ọ bụla nọ n’Idọm.) 17  Hedad wee gbapụ, ya na ụfọdụ ndị ikom Idọm bụ́ ndị na-ejere nna ya ozi, ịgbaga Ijipt, mgbe Hedad bụ nwata. 18  Ha wee si na Midian+ pụta ma bata na Peran wee kpọrọ ndị ikom na Peran+ ka ha sonyere ha, ha wee bata n’Ijipt bịakwute Fero eze Ijipt, bụ́ onye nyere ya ụlọ. O kwukwara ka a na-enye ya nri, o nyekwara ya ala. 19  Ihe Hedad wee na-amasị Fero nke ukwuu,+ nke na ọ kpọnyere ya nwunye,+ bụ́ nwanne nwunye nke ya, nwanne Tapenes bụ́ nwunye eze. 20  Ka oge na-aga, nwanne Tapenes mụtaara ya Genubat bụ́ nwa ya nwoke, Tapenes wee kwụsị ya ara+ n’ime ụlọ Fero; Genubat wee nọgide n’ụlọ Fero n’etiti ụmụ Fero. 21  Hedad wee nọrọ n’Ijipt nụ na Devid esorowo nna nna ya hà dinaa,+ na Joab bụ́ onyeisi ndị agha anwụwokwa.+ Ya mere, Hedad sịrị Fero: “Hapụ m+ ka m laa n’ala m.” 22  Ma Fero sịrị ya: “Gịnị kọrọ gị n’oge a mụ na gị nọ nke mere i ji na-achọ ịla n’ala gị?” O wee zaa, sị: “Ọ dịghị ihe kọrọ m; kama i kwesịrị ịhapụ m ka m laa.” 23  Chineke wee mee ka e nwee onye ọzọ ga na-eguzogide ya,+ ya bụ, Rizọn nwa Elayada, onye gbapụrụ n’aka Hadadiza+ eze Zoba+ bụ́ onyenwe ya. 24  O wee na-akpọkọta ndị ikom ka ha dụnyere ya úkwù, o wee ghọọ onyeisi ìgwè ọ lụọ ọ gbalaga, mgbe Devid gburu ha.+ Ya mere, ha gara Damaskọs+ wee biri n’ime ya, malitekwa ịchị na Damaskọs. 25  O wee ghọọ onye na-eguzogide Izrel n’ụbọchị niile nke Sọlọmọn,+ tinyere ihe ọjọọ Hedad mere; ọ kpọkwara Izrel asị+ mgbe ọ nọ na-achị Siria. 26  E nwekwara Jeroboam+ nwa Nibat onye Ifrem si Zereda, bụ́ onye na-ejere Sọlọmọn ozi,+ aha nne ya bụ Zerua, nwaanyị di ya nwụrụ. Ya onwe ya kwa malitere inupụrụ eze isi.+ 27  Ọ bụ nke a mere o ji nupụrụ eze isi: Sọlọmọn wuru Milo.*+ O mechikwara ebe ndị ghe oghe ná mgbidi nke dị n’Obodo Devid bụ́ nna ya.+ 28  Nwoke ahụ bụ́ Jeroboam bụ dimkpa, bụrụ dike.+ Mgbe Sọlọmọn hụrụ na nwa okorobịa ahụ na-arụsi ọrụ ike,+ o mere ya onye na-elekọta+ ọrụ niile a manyere+ ụlọ Josef+ ịrụ. 29  O wee ruo nnọọ n’oge ahụ na Jeroboam si na Jeruselem pụọ, Ahaịja+ onye Shaịlo+ bụ́ onye amụma wee hụ ya n’okporo ụzọ, Ahaịja yikwa uwe ọhụrụ n’ahụ́ ya; ha abụọ nọkwa naanị ha n’ọhịa. 30  Ahaịja wee chịrị uwe ọhụrụ ahụ o yi ma dọwaa+ ya ụzọ iri na abụọ.+ 31  O wee sị Jeroboam: “Chịrị iberibe iri; n’ihi na nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Lee m na-adọkapụ alaeze n’aka Sọlọmọn, m ga-enyekwa gị ebo iri.+ 32  Ọ bụ otu ebo+ ga-abụ nke ya n’ihi ohu m Devid+ nakwa n’ihi Jeruselem,+ bụ́ obodo m họọrọ n’ebo niile nke Izrel. 33  Ihe kpatara ya bụ na ha ahapụwo m+ ma malite ịkpọrọ Ashtọret+ bụ́ chi nwaanyị ndị Saịdọn isiala, tinyere Kimọsh+ bụ́ chi Moab na Milkọm+ bụ́ chi ụmụ Amọn; ha ejeghịkwa ije n’ụzọ m site n’ime ihe ziri ezi n’anya m na idebe ụkpụrụ m na mkpebi ikpe m dị ka Devid nna ya. 34  Ma agaghị m anapụ alaeze ahụ dum n’aka ya, n’ihi na m ga-eme ka ọ bụrụ onyeisi ruo ụbọchị niile nke ndụ ya, n’ihi ohu m Devid bụ́ onye m họọrọ,+ n’ihi na o debere ihe ndị m nyere n’iwu nakwa ụkpụrụ m. 35  M ga-anapụ ọbụbụeze n’aka nwa ya nwoke ma were ya nye gị, ya bụ, ebo iri.+ 36  M ga-enyekwa nwa ya otu ebo, ka ohu m Devid wee nwee oriọna mgbe niile n’ihu m na Jeruselem,+ bụ́ obodo m họọrọ ime ka aha m dịrị na ya.+ 37  Ọ bụkwa gị ka m ga-akpọrọ, n’ezie, ị ga-achịkwa ebe niile na-agụ mkpụrụ obi gị agụụ,+ ị ga-aghọkwa eze Izrel. 38  Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na i rube isi n’ihe niile m ga-enye gị n’iwu, i wee jee ije n’ụzọ m, meekwa ihe ziri ezi n’anya m site n’idebe ụkpụrụ m na ihe ndị m nyere n’iwu, dị nnọọ ka ohu m Devid mere,+ m ga-anọnyekwara gị,+ m ga-ewukwara gị ụlọ nke na-adịgide adịgide, dị nnọọ ka m wuuru Devid,+ m ga-enyekwa gị Izrel. 39  M ga-ewedakwa ụmụ Devid n’ala n’ihi nke a,+ naanị na ọ gaghị abụ ruo mgbe niile.’”+ 40  Sọlọmọn wee malite ịchọ igbu Jeroboam.+ Ya mere, Jeroboam biliri wee gbaga+ n’Ijipt gbakwuru Shaịshak+ eze Ijipt, ọ nọkwa n’Ijipt ruo mgbe Sọlọmọn nwụrụ. 41  Ma ihe ndị ọzọ metụtara Sọlọmọn na ihe niile o mere nakwa amamihe ya, ọ̀ bụ na e deghị ha n’akwụkwọ e dekọrọ ihe Sọlọmọn mere? 42  Ụbọchị Sọlọmọn chịrị Izrel dum n’ime Jeruselem dị afọ iri anọ.+ 43  Sọlọmọn wee soro nna nna ya hà dinaa,+ e wee lie ya n’Obodo Devid+ nna ya; Rehoboam+ nwa ya wee malite ịchị n’ọnọdụ ya.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

1Ez 11:27*  Otú e si dee ya n’asụsụ Hibru bụ “mkputamkpu ala.”