Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Ndị Eze 10:1-29

10  Eze nwaanyị Shiba+ nọ na-anụ akụkọ banyere Sọlọmọn n’ihe metụtara aha Jehova.+ O wee jiri ajụjụ ndị na-agbagwoju anya bịa ịnwale ya.+  N’ikpeazụ, ọ bịarutere Jeruselem ya na oké ìgwè mmadụ so ya,+ kamel+ ndị bu mmanụ bọlsọm+ na ọlaedo dị nnọọ ukwuu na nkume ndị dị oké ọnụ ahịa; o wee bịakwute Sọlọmọn malite ịgwa ya ihe niile dị ya n’obi.+  Sọlọmọn wee zaa ya ihe niile ọ jụrụ ya.+ Ọ dịghị ihe ọ bụla siiri eze ike ịza nwaanyị ahụ.+  Mgbe eze nwaanyị Shiba hụrụ amamihe niile nke Sọlọmọn+ na ụlọ o wuru,+  na ihe oriri na-adị na tebụl+ ya na otú ndị na-ejere ya ozi si anọdụ ala na otú ndị na-ejere ya ozi n’oge nri si eje ozi na ejiji ha na ihe ọṅụṅụ+ ya na àjà nsure ọkụ ọ na-achụ mgbe niile n’ụlọ Jehova, o riri ya ọnụ.+  O wee sị eze: “Ihe m nọ n’ala m nụ banyere gị nakwa banyere amamihe gị bụ eziokwu.+  Ekwetaghị m ihe e kwuru ruo mgbe m bịara ka m jiri anya m hụ; ma, lee! a gwarughị m ọkara ya.+ Amamihe na ịba ụba gị akarịwo ihe a na-anụ bụ́ nke m nụkwara.+  Obi ụtọ na-adịrị ndị gị;+ obi ụtọ+ na-adịrị ndị a na-ejere gị ozi bụ́ ndị na-eguzo n’ihu gị mgbe niile, na-ege ntị n’amamihe gị!+  Ka Jehova bụ́ Chineke gị bụrụ onye a gọziri agọzi,+ bụ́ onye nwere mmasị+ n’ebe ị nọ site n’ime ka ị nọkwasị n’ocheeze Izrel;+ n’ihi na Jehova hụrụ Izrel n’anya ruo mgbe a na-akaghị aka,+ nke mere na ọ họpụtara gị ịbụ eze+ ka ị na-ekpe ikpe ziri ezi+ ma na-eme ezi omume.”+ 10  O wee nye+ eze ọlaedo dị otu narị talent na iri abụọ+ na mmanụ bọlsọm+ dị nnọọ ukwuu na nkume dị oké ọnụ ahịa. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ e butere mmanụ bọlsọm dị ukwuu ka nke ahụ eze nwaanyị Shiba buteere Eze Sọlọmọn. 11  Ọtụtụ ụgbọ mmiri+ Haịram ndị si Ofa+ bute ọlaedo sikwa Ofa bute osisi algọm+ n’ebe ọ dị ukwuu nakwa nkume ndị dị oké ọnụ ahịa.+ 12  Eze wee jiri osisi algọm ndị ahụ rụọ obere idé nke ụlọ Jehova+ na nke ụlọ eze, jirikwa ha rụọ une+ na ụbọ+ akwara maka ndị na-abụ abụ. E butetụbeghị osisi algọm ndị há otú a, a hụbeghịkwa ndị há otú a ruo taa. 13  Eze Sọlọmọn nyekwara eze nwaanyị Shiba ihe niile masịrị ya bụ́ ndị ọ rịọrọ ya, n’agụnyeghị ihe Eze Sọlọmọn ji mmesapụ aka+ nye ya. E mesịa, ọ tụgharịrị wee laa n’ala ya, ya na ndị na-ejere ya ozi.+ 14  Ọlaedo+ a na-ebutere Sọlọmọn n’otu afọ dị narị talent ọlaedo isii na iri isii na isii n’ịdị arọ,+ 15  n’agụnyeghị ihe ndị na-agba ahịa na-eweta na uru si n’aka ndị ahịa na ndị eze+ niile nke ndị Arab+ na ndị gọvanọ n’ala ahụ. 16  Eze Sọlọmọn wee jiri ọlaedo a gwara agwa+ rụọ narị nnukwu ọta abụọ (o ji narị shekel ọlaedo isii machie nnukwu ọta nke ọ bụla),+ 17  jirikwa ọlaedo a gwara agwa rụọ narị obere ọta atọ (o ji maịna ọlaedo atọ machie obere ọta nke ọ bụla).+ Eze wee debe ha n’Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+ 18  Eze jikwa ọdụ́+ rụọ otu nnukwu ocheeze+ ma were ọlaedo a nụchara anụcha machie ya.+ 19  Ebe e si arịgo ocheeze ahụ nwere nzọụkwụ isii, ocheeze ahụ nwekwara ihe mkpuchi dị gburugburu n’azụ ya, ebe a na-anọdụ ọdụ nwekwara ebe a na-atụkwasị aka n’akụkụ ya abụọ, ọdụm abụọ+ guzokwa n’akụkụ ebe ndị ahụ a na-atụkwasị aka.+ 20  Ọdụm iri na abụọ guzokwa n’elu nzọụkwụ isii ahụ, n’akụkụ ya abụọ. Ọ dịghị alaeze ọzọ rụrụ nke dị ka ya.+ 21  E ji ọlaedo mee arịa niile Eze Sọlọmọn ji aṅụ ihe ọṅụṅụ, e jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa+ mee arịa niile dị n’Ụlọ Oké Ọhịa Lebanọn.+ Ọ dịghị ihe ọ bụla e ji ọlaọcha mee; a gụrụ ya dị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ ma ọlị n’ụbọchị Sọlọmọn. 22  N’ihi na eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri Tashish+ na-agba n’elu oké osimiri ya na ọtụtụ ụgbọ mmiri Haịram. Otu ugboro n’afọ atọ, ọtụtụ ụgbọ mmiri Tashish na-ebu ọlaedo+ na ọlaọcha, ọdụ́+ na adaka na ekwuru, alọta. 23  Ya mere, Eze Sọlọmọn nwere akụnụba+ na amamihe+ karịa ndị eze niile ọzọ nọ n’ụwa. 24  Ndị niile nọ n’ụwa na-achọkwa ịbịa n’ihu Sọlọmọn ka ha gee ntị n’amamihe ya, nke Chineke tinyere n’obi ya.+ 25  Kwa afọ,+ onye ọ bụla n’ime ha na-eweta onyinye,+ bụ́ ihe ndị e ji ọlaọcha mee+ na ihe ndị e ji ọlaedo mee na uwe na ihe agha+ na mmanụ bọlsọm, ịnyịnya na ịnyịnya ibu.+ 26  Sọlọmọn wee na-enweta ụgbọ ịnyịnya na ịnyịnya agha; o wee nwee otu puku ụgbọ ịnyịnya na narị anọ nakwa puku ịnyịnya agha iri na abụọ.+ O wee debe ha n’obodo dị iche iche a na-edebe ụgbọ ịnyịnya nakwa n’ebe dị eze nso na Jeruselem.+ 27  Eze wee mee ka ọlaọcha dịrị ọtụtụ ka nkume na Jeruselem,+ o mekwara ka osisi sida dịrị ọtụtụ+ ka osisi sịkamọ ndị dị na Shefila. 28  Sọlọmọn sikwa n’Ijipt na-azụbata ịnyịnya, ọ bụkwa ndị na-azụrụ eze ahịa na-azụbata ìgwè ịnyịnya ndị ahụ.+ 29  A na-eji narị mkpụrụ ego ọlaọcha isii esi n’Ijipt azụbata otu ụgbọ ịnyịnya, a na-ejikwa otu narị mkpụrụ ego ọlaọcha na iri ise azụbata otu ịnyịnya; ọ bụkwa otú ahụ ka ndị eze niile nke ndị Het+ na ndị eze Siria si azụbata ha. Ọ bụ n’aka ndị eze a ka ha si azụbata ha.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji