Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Jọn 5:1-21

5  Onye ọ bụla nke kweere na Jizọs bụ Kraịst bụ onye a mụrụ site na Chineke,+ onye ọ bụla nke hụrụ Chineke bụ́ nna n’anya hụrụ ụmụ Chineke n’anya.+  Otú a ka anyị ga-esi mata na anyị hụrụ ụmụ Chineke+ n’anya,+ ya bụ, mgbe anyị hụrụ Chineke n’anya, na-emekwa ihe o nyere n’iwu.+  N’ihi na nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya+ pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu;+ ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ,+  n’ihi na ihe ọ bụla a mụrụ+ site na Chineke na-emeri ụwa.+ Ọ bụ okwukwe+ anyị bụ ihe anyị ji+ merie+ ụwa.  Ònye bụ onye ahụ meriworo+ ụwa+ ma ọ bụghị onye ahụ nke nwere okwukwe+ na Jizọs bụ Ọkpara Chineke?+  Ọ bụ onye a bụ onye bịara site na mmiri na ọbara, ya bụ, Jizọs Kraịst; ọ bụghị naanị site na mmiri,+ kama site na mmiri na ọbara.+ Ọ bụkwa mmụọ nsọ+ bụ ihe na-agba àmà, n’ihi na mmụọ ahụ bụ eziokwu ahụ.  N’ihi na e nwere ihe atọ na-agba àmà,  mmụọ nsọ+ na mmiri+ na ọbara,+ ha atọ na-ekwekọrịtakwa.+  Ọ bụrụ na anyị na-anabata àmà ndị mmadụ na-agba,+ àmà nke Chineke na-agba ka ukwuu, n’ihi na ihe a bụ àmà Chineke na-agba, ya bụ, àmà+ ọ gbara banyere Ọkpara ya. 10  A gbaworo onye ahụ nke nwere okwukwe n’ebe Ọkpara Chineke nọ àmà.+ Onye na-enweghị okwukwe n’ebe Chineke nọ emewo ya onye ụgha,+ n’ihi na o nweghị okwukwe n’àmà ahụ a gbara,+ nke Chineke gbara dị ka onye àmà+ banyere Ọkpara ya. 11  Ihe a bụkwa àmà ahụ a gbara, na Chineke nyere anyị ndụ ebighị ebi,+ ndụ a dịkwa n’ime Ọkpara ya.+ 12  Onye nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ a; onye na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ a.+ 13  M na-edetara unu ihe ndị a ka unu wee mara na unu nwere ndụ ebighị ebi,+ unu ndị nwere okwukwe n’aha Ọkpara Chineke.+ 14  Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ+ bụ na ihe ọ bụla nke anyị rịọrọ ya dị ka uche ya si dị, ọ na-anụ olu anyị.+ 15  Ọ bụrụkwa na anyị maara na ọ na-anụ olu anyị n’ihe ọ bụla anyị na-arịọ,+ anyị maara na anyị ga-enweta ihe niile anyị rịọrọ, ebe ọ bụ ya ka anyị rịọrọ ihe ndị ahụ.+ 16  Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ nwanna ya ka ọ na-eme mmehie nke na-adịghị eweta ọnwụ,+ ọ ga-arịọrọ ya arịrịọ, Chineke ga-enyekwa ya ndụ,+ ya bụ, ndị na-adịghị eme emehie ga-ewetara ha ọnwụ.+ Ọ dị mmehie nke na-eweta ọnwụ. Ọ bụghị banyere mmehie ahụ ka m na-agwa ya ka ọ rịọ arịrịọ.+ 17  Ajọ omume niile bụ mmehie;+ ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eweta ọnwụ. 18  Anyị maara na onye ọ bụla a mụrụ site na Chineke+ adịghị anọ na-eme mmehie, ma Onye ahụ+ a mụrụ site na Chineke na-eche ya nche, ajọ onye ahụ adịghịkwa ejide ya.+ 19  Anyị maara na anyị sitere na Chineke,+ ma ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.+ 20  Ma anyị maara na Ọkpara Chineke abịawo,+ o nyewokwa anyị ikike inwe nghọta+ ka anyị wee mara ezi onye ahụ.+ Anyị na ezi onye ahụ dịkwa n’otu,+ site n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. Onye a bụ ezi+ Chineke ahụ na ndụ ebighị ebi.+ 21  Ụmụntakịrị, kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji