Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Jọn 2:1-29

2  Ụmụntakịrị m, m na-edetara unu ihe ndị a ka unu wee ghara ime mmehie.+ Ma, ọ bụrụ na onye ọ bụla emee mmehie, anyị nwere onye na-enyere anyị aka,+ onye ya na Nna anyị nọ, ya bụ, Jizọs Kraịst, onye ezi omume.+  Ọ bụ àjà+ ime udo+ maka mmehie anyị,+ ma ọ bụghị naanị maka mmehie anyị,+ kama, ọ bụkwa maka mmehie nke ụwa dum.+  Anyị ga-eji nke a mara na anyị amarawo ya, ya bụ, ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-edebe ihe ndị o nyere n’iwu.+  Onye na-asị: “Amarawo m ya,”+ ma ọ dịghị edebe ihe o nyere n’iwu,+ ọ bụ onye ụgha, eziokwu adịghị n’ime ya.+  Ma onye ọ bụla nke na-edebe okwu ya,+ n’eziokwu, ọ bụ n’ime ya ka e meworo ka ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ zuo okè.+ Anyị ji nke a mara na anyị na ya dị n’otu.+  Onye na-asị na ya na ya dị n’otu+ ji ụgwọ ịnọgide na-eje ije dị ka onye ahụ jere.+  Ndị m hụrụ n’anya, ihe m na-edetara unu abụghị iwu ọhụrụ, kama ọ bụ iwu ochie+ nke unu nụrụ site ná mmalite.+ Iwu ochie nke a bụ okwu ahụ unu nụrụ.  M na-edetakwara unu iwu ọhụrụ, ya bụ, ihe mere eme nke bụ́ eziokwu banyere ya nakwa banyere unu, n’ihi na ọchịchịrị+ na-agabiga, ezi ìhè+ amalitelarị inwu.  Onye na-asị na ya nọ n’ìhè, ma kpọọ nwanna ya asị,+ ọ nọ n’ọchịchịrị ruo ugbu a.+ 10  Onye hụrụ nwanna ya n’anya nọ n’ìhè,+ ọ dịghịkwa ihe na-eme ka ọ sụọ ngọngọ.+ 11  Ma onye kpọrọ nwanna ya asị nọ n’ọchịchịrị, ọ na-ejegharịkwa n’ọchịchịrị,+ ọ maghịkwa ebe ọ na-eje,+ n’ihi na ọchịchịrị emewo ka anya ya kpuo ìsì. 12  Ụmụntakịrị, m na-edetara unu akwụkwọ, n’ihi na a gbagharawo unu mmehie unu n’ihi aha ya.+ 13  Ndị bụ́ nna, m na-edetara unu akwụkwọ, n’ihi na unu amarawo onye ahụ nke dị site ná mmalite.+ Ụmụ okorobịa,+ m na-edetara unu akwụkwọ, n’ihi na unu emeriwo ajọ onye ahụ.+ Ụmụntakịrị,+ m na-edetara unu akwụkwọ, n’ihi na unu amarawo Nna ahụ.+ 14  Ndị bụ́ nna,+ m na-edetara unu akwụkwọ, n’ihi na unu amarawo onye ahụ nke dị site ná mmalite.+ Ụmụ okorobịa, m na-edetara unu akwụkwọ, n’ihi na unu siri ike,+ okwu Chineke dịkwa n’ime unu,+ unu emeriwokwa ajọ onye ahụ.+ 15  Unu ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna anyị adịghị n’ime ya;+ 16  n’ihi na ihe niile dị n’ụwa,+ ya bụ, ọchịchọ nke anụ ahụ́+ na ọchịchọ nke anya+ na oké ngosi nke ihe mmadụ ji ebi ndụ,+ esighị n’ebe Nna anyị nọ, kama o si n’ụwa.+ 17  Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa,+ ma onye na-eme uche+ Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.+ 18  Ụmụntakịrị, ọ bụ oge awa ikpeazụ,+ dịkwa nnọọ ka unu nụrụ na onye na-emegide Kraịst na-abịa,+ ọbụna ugbu a, e nwewo ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst;+ nke bụ́ ihe anyị ji mara na ọ bụ oge awa ikpeazụ. 19  Ha si n’ebe anyị nọ pụọ, ma anyị na ha abụghị otu;+ n’ihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara eso anyị nọrọ.+ Ma ha pụrụ ka e wee mee ka ọ pụta ìhè na anyị na mmadụ niile abụghị otu.+ 20  Onye nsọ ahụ tekwara unu mmanụ;+ unu niile nwere ihe ọmụma.+ 21  M na-edetara unu akwụkwọ, ọ bụghị n’ihi na unu amaghị eziokwu ahụ,+ kama n’ihi na unu maara ya,+ nakwa n’ihi na ọ dịghị okwu ụgha nke si n’eziokwu ahụ.+ 22  Ònye bụ onye ụgha ma ọ bụghị onye na-asị na Jizọs abụghị Kraịst?+ Ọ bụ onye a bụ onye na-emegide Kraịst,+ ya bụ, onye na-agọnahụ Nna ahụ na Ọkpara ya.+ 23  Onye ọ bụla nke na-agọnahụ Ọkpara ahụ enweghị Nna ahụ.+ Onye nke na-ekwupụta+ Ọkpara ahụ nwekwara Nna ahụ.+ 24  Ma unu onwe unu, ka ihe unu nụrụ site ná mmalite dịgide n’ime unu.+ Ọ bụrụ na ihe unu nụrụ site ná mmalite adịgide n’ime unu, unu na Ọkpara ahụ ga-adị n’otu,+ unu na Nna ahụ ga-adịkwa n’otu.+ 25  Nke a bụkwa ihe ahụ e kwere ná nkwa, nke ya onwe ya kwere anyị ná nkwa, ya bụ, ndụ ebighị ebi ahụ.+ 26  Ihe ndị a ka m na-edetara unu banyere ndị ahụ na-agbalị iduhie unu.+ 27  Ma mmanụ ahụ o tere+ unu onwe unu dị n’ime unu, ọ dịghịkwa unu mkpa ka onye ọ bụla na-akụziri unu ihe;+ ma mmanụ ahụ o tere unu bụ eziokwu,+ ọ bụghị okwu ụgha, ọ na-akụzikwara unu ihe niile.+ Dị ka ọ kụziiri unu, unu na ya dịrị n’otu.+ 28  Ya mere, ụmụntakịrị,+ unu na ya dịrị n’otu,+ ka anyị wee nwee nkwuwa okwu+ mgbe a ga-eme ka ọ pụta ìhè,+ gharakwa ịbụ ndị e menyere ihere, e wee mee ka ha pụọ n’ebe ọ nọ n’oge ọnụnọ ya.+ 29  Ọ bụrụ na unu maara na ọ bụ onye ezi omume,+ unu maara na e si na ya mụọ onye ọ bụla nke na-eme ezi omume.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji