Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

1 Jọn 1:1-10

1  Onye ahụ nke bụ́ okwu nke ndụ,+ onye dị site ná mmalite,+ onye anyị nụrụ ihe o kwuru,+ onye anyị ji anya anyị hụ,+ onye anyị leruru anya,+ onye aka anyị metụkwara,+  (ee, e mere ka ndụ ahụ pụta ìhè,+ anyị ahụwo ya ma na-agba àmà,+ na-akọkwara unu banyere ndụ ebighị ebi+ ahụ nke si n’aka Nna ahụ, nke e mere ka ọ pụta ìhè n’ebe anyị nọ,)  ọ bụ ihe anyị hụrụ, nke anyị nụkwara, ka anyị na-akọrọ unu,+ ka anyị na unu wee na-emekọrịta ihe.+ Ọ bụkwa Nna ahụ na Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst+ ka anyị na ha na-enwe mmekọrịta a.+  Ya mere, anyị na-edetara unu ihe ndị a ka ọṅụ anyị wee zuo ezu.+  Nke a bụ ozi anyị nụrụ n’ọnụ ya, nke anyị na-ezikwa unu,+ na Chineke bụ ìhè,+ ọ dịghịkwa ihe jikọrọ ya na ọchịchịrị ma ọlị.+  Ọ bụrụ na anyị asị: “Anyị na ya na-emekọrịta ihe,” ma anyị ana-eje ije n’ọchịchịrị,+ anyị na-agha ụgha, anyị adịghịkwa eme ihe kwekọrọ n’eziokwu ahụ.+  Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị na-eje ije n’ìhè ahụ, dị ka ya onwe ya nọ n’ìhè ahụ,+ anyị na ibe anyị na-emekọrịta ihe,+ ọbara+ Jizọs bụ́ Ọkpara ya na-asachapụ+ anyị mmehie niile.+  Ọ bụrụ na anyị asị: “Anyị enweghị mmehie,”+ anyị na-eduhie onwe anyị,+ eziokwu adịghịkwa n’ime anyị.  Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị,+ o kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume, nke mere na ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume niile.+ 10  Ọ bụrụ na anyị asị: “Anyị emehietụbeghị,” anyị na-eme ya onye ụgha, okwu ya adịghịkwa n’ime anyị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji