Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọrụ Ndịozi 5:1-42

5  Otú ọ dị, otu nwoke, nke aha ya bụ Ananayas, ya na Safaịra nwunye ya, rere otu ihe onwunwe ha  ma zochie ụfọdụ n’ime ihe ha retara, nwunye ya makwaara ihe o mere, o wee weta naanị otu akụkụ ma debe ya n’ụkwụ ndịozi.+  Ma Pita sịrị: “Ananayas, gịnị mere Setan+ ji mee ka obi sie gị ike ịghara mmụọ nsọ+ ụgha+ na izochi ụfọdụ n’ime ihe unu retara ala ahụ?  Mgbe ị na-erebeghị ya, ọ̀ bụ na ọ bụghị nke gị? Mgbe i rere ya, ọ̀ bụ na ọ dịghị n’aka gị? Gịnị mere i ji zube ime ihe dị otú a n’obi gị? Ị ghaworo Chineke+ ụgha,+ ọ bụghị mmadụ.”  Mgbe ọ nụrụ okwu ndị a, Ananayas dara n’ala ma kubie ume.+ Oké egwu+ wee jide ndị niile nụrụ ya.  Ma ụmụ okorobịa biliri, fụchie ya ákwà,+ bupụkwa ya ma lie ya.  Ma mgbe ihe dị ka awa atọ gasịrị, nwunye ya batara, n’amaghị ihe merenụ.  Pita sịrị ya: “Gwa m, ọ̀ bụ ego ole a ka unu abụọ rere ala ahụ?” Ọ sịrị: “Ee, ọ bụ ego ole a.”  Ya mere, Pita sịrị ya: “Gịnị mere unu abụọ ji kwekọrịta itinye mmụọ Jehova n’ule?+ Lee! Ụkwụ ndị liri di gị nọ n’ọnụ ụzọ, ha ga-ebupụkwa gị.” 10  Ọ dara n’ala ozugbo ahụ n’ụkwụ ya ma kubie ume.+ Mgbe ụmụ okorobịa ahụ batara, ha hụrụ na ọ nwụọla, ha wee bupụ ya ma lie ya n’akụkụ di ya. 11  N’ihi ya, oké egwu jidere ọgbakọ ahụ dum na ndị niile nụrụ ihe ndị a. 12  Ndịozi nọkwa na-eme ọtụtụ ihe ịrịba ama na ihe ebube n’etiti ndị mmadụ;+ ha niile jikwa otu obi nọrọ na veranda nwere ogidi nke Sọlọmọn.+ 13  N’eziokwu, e nweghị otu onye n’ime ndị ọzọ nke nwere obi ike isonyere ha;+ ka o sina dị, ndị mmadụ nọ na-ajasi ha mma ike.+ 14  A nọkwa na-enwekwu ndị kwere n’Onyenwe anyị, bụ́ ìgwè mmadụ nke gụnyere ma ndị ikom ma ndị inyom;+ 15  ha wee kpọpụta ndị ọrịa ọbụna n’okporo ámá ma tọgbọ ha n’ebe ahụ n’elu ihe ndina dị iche iche, ka ọ ga-abụ, mgbe Pita na-agafe, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ka onyinyo ya dakwasị otu onye n’ime ha.+ 16  Ìgwè mmadụ ndị sikwa n’obodo ndị dị Jeruselem gburugburu nọgidere na-agbakọta. Ha na-ebu ndị ọrịa na ndị mmụọ na-adịghị ọcha na-enye nsogbu abịa. A na-agwọkwa ha niile. 17  Ma nnukwu onye nchụàjà na ndị niile ha na ya nọ, ya bụ, òtù ndị Sadusii e nwere mgbe ahụ, biliri, ekworo jukwara ha obi.+ 18  Ha wee jide ndịozi ahụ ma tụba ha n’ụlọ mkpọrọ ọha mmadụ.+ 19  Ma n’abalị, mmụọ ozi Jehova+ meghere ibo ụzọ nke ụlọ mkpọrọ ahụ,+ kpọpụta ha ma sị: 20  “Gawanụ, mgbe unu guzoro n’ụlọ nsọ, nọgidenụ na-agwa ndị mmadụ okwu niile metụtara ndụ a.”+ 21  Mgbe ha nụsịrị nke a, ha banyere n’ụlọ nsọ mgbe chi bọrọ ma malite izi ihe. Ma mgbe nnukwu onye nchụàjà ahụ na ndị ha na ya so bịarutere, ha kpọkọrọ Sanhedrin na ìgwè ndị okenye niile nke ụmụ Izrel,+ ha zikwara ozi ka a gaa n’ụlọ nga kpọta ha. 22  Ma mgbe ndị ọrụ nche ahụ rutere n’ebe ahụ, ha ahụghị ha n’ụlọ mkpọrọ ahụ. Ya mere, ha laghachiri kọọrọ ha, 23  sị: “Anyị hụrụ ụlọ nga ahụ ka a kpọchisiri ya ike, hụkwa ndị nche ka ha guzo n’ọnụ ụzọ, ma mgbe anyị meghere ụzọ, anyị ahụghị onye ọ bụla n’ime ya.” 24  Mgbe onyeisi ndị nche ụlọ nsọ na ndị isi nchụàjà nụrụ okwu ndị a, ọ gbagwojuru ha anya ihe ihe ndị a ga-apụta.+ 25  Ma otu nwoke bịarutere ma kọọrọ ha, sị: “Lee! Ndị ikom unu tụbara n’ụlọ mkpọrọ nọ n’ụlọ nsọ, ha guzo na-ezi ndị mmadụ ihe.”+ 26  Mgbe ahụ, onyeisi ndị nche ụlọ nsọ ahụ na ndị ọrụ ya pụrụ wee kpọta ha, ma ha emeghị ya n’ike, ebe ha na-atụ egwu+ ka ndị mmadụ ghara ịtụ ha nkume. 27  Ya mere, ha kpọtara ha ma mee ka ha guzoro ọtọ n’ụlọ nzukọ Sanhedrin. Nnukwu onye nchụàjà wee jụọ ha, 28  sị: “Anyị nyesiri unu iwu ike+ ka unu kwụsị ịdị na-ezi ihe n’aha a, n’agbanyeghịkwa nke ahụ, lee! unu emewo ka ozizi unu jupụta Jeruselem,+ unu kpebikwara ime ka ọbara+ nwoke a dị anyị n’isi.” 29  Pita na ndịozi ndị ọzọ wee zaa, sị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.+ 30  Chineke nna nna anyị hà kpọlitere+ Jizọs, bụ́ onye unu gburu, kwụwa ya n’elu osisi.+ 31  Chineke buliri onye a elu ka ọ nọrọ n’aka nri ya+ dị ka Onye Nnọchiteanya Ukwu+ na Onye Nzọpụta,+ ka Izrel wee chegharịa,+ ka e wee gbaghara ha mmehie ha.+ 32  Anyị bụkwa ndị àmà nke ihe ndị a,+ otú a kwa ka ọ dị mmụọ nsọ,+ nke Chineke nyere ndị na-erubere ya isi dị ka onye na-achị achị.” 33  Mgbe ha nụrụ ihe a, ọ dụrụ ha adụ n’obi nke ukwuu, ha wee na-achọ igbu ha.+ 34  Ma otu nwoke biliri na Sanhedrin, onye Farisii aha ya bụ Gameliel,+ bụ́ onye na-akụzi Iwu, onye ndị Juu niile na-asọpụrụ, ma nye iwu ka a kpọpụ ndị ikom ahụ n’èzí ruo nwa oge.+ 35  O wee sị ha: “Ndị ikom Izrel,+ lezienụ anya n’ihe unu bu n’uche ime banyere ndị a. 36  Dị ka ihe atụ, tupu ụbọchị ndị a, Tiudas biliri, na-ekwu na o nwere ihe ya bụ,+ ọtụtụ ndị, ihe dị ka narị anọ, sonyeere òtù ya.+ Ma e gburu ya, e mekwara ka ndị niile na-erubere ya isi gbasasịa wee ghọọ ihe efu. 37  Mgbe nke ya gasịrị, Judas onye Galili biliri n’oge a na-edeba aha n’akwụkwọ,+ ọ dọtakwara ndị sooro ya. Ma nwoke ahụ lakwara n’iyi, a chụsasịkwara ndị niile na-erubere ya isi n’ebe niile. 38  Ya mere, ka ihe si kwụrụ ugbu a, ana m agwa unu, Unu etinyela aka n’ihe metụtara ndị a, kama hapụnụ ha; (n’ihi na, ọ bụrụ na atụmatụ a ma ọ bụ ọrụ a si n’aka mmadụ, a ga-eme ka ọ daa;+ 39  ma ọ bụrụ na o si n’aka Chineke,+ unu agaghị emeli ka ha daa;)+ ma ọ bụghị ya, ọ pụrụ ịbụ na unu na-alụso Chineke ọgụ.”+ 40  Ha wee gee ya ntị, ha kpọkwara ndịozi ahụ, pịa ha ihe,+ ma nye ha iwu ka ha kwụsị ikwu okwu n’aha Jizọs,+ wee hapụ ha ka ha laa. 41  Ya mere, ha si n’ihu Sanhedrin ahụ pụọ, na-aṅụrị ọṅụ+ n’ihi na a gụwo ha ná ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-emenye ihere n’ihi aha ya.+ 42  Kwa ụbọchị, n’ụlọ nsọ na site n’ụlọ ruo n’ụlọ,+ ha nọ na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị,+ na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, bụ́ Jizọs.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji