Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọrụ Ndịozi 3:1-26

3  Ma Pita na Jọn nọ na-agbago n’ụlọ nsọ maka oge awa ekpere, bụ́ oge awa nke itoolu,*+  e bukwa otu nwoke dara ngwọrọ site n’afọ nne ya,+ ha na-adọbakwa ya kwa ụbọchị n’akụkụ ọnụ ụzọ ụlọ nsọ bụ́ nke a na-akpọ Ọnụ Ụzọ Mara Mma,+ ka o wee na-arịọ ndị na-abanye n’ụlọ nsọ ahụ onyinye ebere.+  Mgbe ọ hụrụ ka Pita na Jọn na-achọ ịbanye n’ụlọ nsọ ahụ, ọ malitere ịrịọ ka ha nye ya onyinye ebere.+  Ma Pita, ya na Jọn, legidere ya anya+ wee sị ya: “Lee anyị anya.”  O wee legide ha anya, na-atụ anya inweta ihe n’aka ha.  Otú ọ dị, Pita sịrị: “Enweghị m ọlaọcha na ọlaedo, ma ihe m nwere ka m na-enye gị:+ N’aha Jizọs Kraịst onye Nazaret,+ jee ije!”+  Mgbe ahụ, o jidere ya n’aka nri+ ma selite ya. Ozugbo ahụ, e mere ka ọbụ ụkwụ ya na ọkpụkpụ nkwonkwo ụkwụ ya gbasie ike.+  O wee malie elu,+ guzoro ọtọ ma malite ije ije. O sokwaara ha banye n’ụlọ nsọ,+ na-eje ije ma na-amali elu, na-enyekwa Chineke otuto.  Mmadụ niile+ hụkwara ya ka ọ na-eje ije ma na-enye Chineke otuto. 10  Ha matakwara onye ọ bụ, na onye a bụ nwoke ahụ na-anọbu ala na-arịọ onyinye ebere n’Ọnụ Ụzọ Mara Mma+ nke ụlọ nsọ ahụ. Ihe ahụ meere ya wee ju ha anya, ha nwekwara oké mmetụta.+ 11  Ka nwoke ahụ nọ na-ejide Pita na Jọn aka, ha niile kwooro gaa n’ebe ha nọ, n’ebe a na-akpọ veranda nwere ogidi nke Sọlọmọn,+ ọ tụkwara ha n’anya nke ukwuu. 12  Mgbe Pita hụrụ nke a, ọ gwara ndị ahụ, sị: “Ndị ikom Izrel, gịnị mere ihe a ji na-eju unu anya, ma ọ bụ gịnị mere unu ji na-elegide anyị anya ka à ga-asị na ọ bụ ike anyị ma ọ bụ nsọpụrụ Chineke anyị ka anyị ji mee ka o jee ije?+ 13  Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb,+ ya bụ, Chineke nna nna anyị hà, emewo ka Ohu+ ya bụ́ Jizọs dị ebube,+ bụ́ onye unu onwe unu raara nye,+ gọnahụkwa ya n’ihu Paịlet, mgbe o kpebiri ịhapụ ya.+ 14  Ee, unu gọnahụrụ onye nsọ na onye ezi omume ahụ,+ unu rịọkwara ka a hapụrụ unu otu nwoke, bụ́ ogbu ọchụ,+ n’emeghị ya ihe ọ bụla, 15  ma unu gburu Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ.+ Ma Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite ya, bụ́ eziokwu nke anyị bụ ndị àmà ya.+ 16  N’ihi ya, site n’okwukwe anyị nwere n’aha ya, aha ya emewo ka nwoke a dị ike, bụ́ onye unu na-ahụ, onye unu makwaara, okwukwe e nwere n’ihi ya emewokwa ka ahụ́ dịchaa nwoke a mma n’ihu unu niile. 17  Ugbu a, ụmụnna m, amaara m na unu mere ya n’amaghị ama,+ dịkwa nnọọ ka ndị na-achị unu+ mere. 18  Ma Chineke esiwo otú a mezuo ihe ndị ọ kpọsara tupu oge eruo site n’ọnụ ndị amụma niile, na Kraịst ya ga-ata ahụhụ.+ 19  “Ya mere, chegharịanụ,+ chigharịakwanụ+ ka e wee hichapụ mmehie unu,+ ka oge inweta ume+ wee si n’ihu Jehova bịa, 20  ka o wee zitekwa Kraịst a họpụtaara unu, bụ́ Jizọs, 21  onye na-aghaghị ịnọgide n’eluigwe+ ruo oge a ga-eme ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ,+ bụ́ nke Chineke kwuru banyere ya site n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ+ nke oge gboo. 22  N’eziokwu, Mozis sịrị, ‘Jehova bụ́ Chineke ga-esi n’etiti ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka mụ onwe m.+ Geenụ ntị n’ihe niile ọ ga-agwa unu.+ 23  Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-adịghị ege Onye Amụma ahụ ntị, a ga-ebibi ya kpamkpam n’etiti ndị m.’+ 24  N’eziokwu, ndị amụma niile kwa, site na Samuel gaa n’ihu, nakwa ndị sochiri ha, bụ́ ndị niile kwuru okwu, kpọsara ụbọchị ndị a n’ụzọ doro anya.+ 25  Unu bụ ụmụ+ ndị amụma, bụrụkwa ndị nketa nke nkwa ọgbụgba ndụ ahụ nke Chineke na nna nna unu hà gbara, nke a gwara Ebreham, sị, ‘Site ná mkpụrụ gị ka a ga-agọzi ezinụlọ niile nke ụwa.’+ 26  Mgbe Chineke họpụtasịrị Ohu ya, ọ bụ unu ka o bu ụzọ+ zitere ya ka ọ gọzie unu site n’ime ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ omume ọjọọ ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọrụ 3:1*  Ihe dị ka n’elekere atọ nke ehihie.