Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọrụ Ndịozi 22:1-30

22  “Ụmụnna+ m na ndị bụ́ nna m, nụrụnụ ihe m na-ekwu+ n’ihu unu ugbu a iji zara ọnụ m.”  (Ma, mgbe ha nụrụ na ọ na-agwa ha okwu n’asụsụ Hibru,+ ha nọọrọ nwayọọ karị, o wee sị:)  “Abụ m onye Juu,+ onye a mụrụ na Tasọs nke Silishia,+ ma agụrụ m akwụkwọ n’obodo a n’ụkwụ Gameliel,+ a kụziiri m otú e si agbasosi Iwu nna nna anyị hà ike,+ m na-anụrụ Chineke ọkụ n’obi+ dị nnọọ ka unu niile na-anụ ọkụ n’obi taa.  Akpagbukwara m ndị na-eso Ụzọ a ruo n’ókè igbu ha egbu,+ na-eke ma ndị ikom ma ndị inyom agbụ, na-atụbakwa ha n’ụlọ mkpọrọ,+  dị ka nnukwu onye nchụàjà na ìgwè ndị okenye+ dum pụrụ ịgbara m akaebe. Anatakwara m akwụkwọ ozi+ dị iche iche n’aka ha ka m nye ụmụnna nọ na Damaskọs, anọkwa m na-aga ka m kpụta ndị niile nọ n’ebe ahụ n’agbụ bịa Jeruselem ka a taa ha ahụhụ.  “Ma ka m nọ na-eme njem na-abịaru Damaskọs nso, n’ihe dị ka n’etiti ehihie, na mberede, ìhè dị ukwuu si n’eluigwe nwuo gburugburu m.+  Adara m n’ala wee nụ ka otu olu na-asị m, ‘Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?’+  Azara m, sị, ‘Ònye ka ị bụ, Onyenwe m?’ O wee gwa m sị, ‘Abụ m Jizọs onye Nazaret, onye ị na-akpagbu.’+  Ma, ndị ikom mụ na ha so+ hụrụ ìhè ahụ n’ezie ma ha anụghị olu onye ahụ na-agwa m okwu.+ 10  Ya mere, m sịrị, ‘Gịnị ka m ga-eme,+ Onyenwe m?’ Onyenwe anyị wee sị m, ‘Bilie, banye na Damaskọs, n’ebe ahụkwa a ga-agwa gị ihe niile a kaworo aka ka i mee.’+ 11  Ma ebe m na-apụghị ịhụ ihe ọ bụla n’ihi ìhè ahụ nke dị ebube, abịarutere m Damaskọs, ọ bụkwa ndị mụ na ha so sekpụ m n’aka.+ 12  “Ma Ananayas, nwoke nke na-asọpụrụ Chineke dị ka Iwu ahụ si dị, bụ́ onye ndị Juu niile bi n’ebe ahụ na-akọ akụkọ ọma banyere ya,+ 13  bịakwutere m. O guzoro n’akụkụ m wee sị m, ‘Sọl, nwanna m, hụwa ụzọ!’+ M wee welie anya lee ya n’otu oge awa ahụ. 14  O wee sị, ‘Chineke nke nna nna anyị hà+ ahọrọwo gị+ ka ị bịa mara uche ya, hụ+ Onye ezi omume ahụ,+ nụkwa okwu ọnụ ya,+ 15  n’ihi na ị ga-abụ onye àmà ya nye mmadụ niile banyere ihe ị hụrụ na ihe ị nụrụ.+ 16  Ugbu a kwa, gịnị mere i ji egbu oge? Bilie, ka e mee gị baptizim,+ sachapụkwa+ mmehie gị site n’ịkpọku aha ya.’+ 17  “Ma mgbe m laghachiri Jeruselem,+ nọrọ n’ụlọ nsọ na-ekpe ekpere, ahụrụ m ọhụụ,+ 18  m wee hụ Onyenwe anyị ka ọ na-asị m, ‘Mee ngwa, si na Jeruselem pụọ ọsọ ọsọ, n’ihi na ha agaghị ekwere+ àmà ị na-agba banyere m.’ 19  M wee sị, ‘Onyenwe anyị, ha onwe ha maara nke ọma na m na-atụbu ndị kwere na gị+ mkpọrọ,+ na-apịakwa ha ihe n’ụlọ nzukọ dị iche iche; 20  mgbe a nọkwa na-awụfu ọbara Stivin+ bụ́ onye àmà gị, mụ onwe m guzokwa n’akụkụ na-enye nkwado+ ma na-eche uwe elu nke ndị na-egbu ya nche.’ 21  N’agbanyeghịkwa nke ahụ, ọ gwara m, sị, ‘Gawa, n’ihi na m ga-eziga gị ná mba ndị dị anya.’”+ 22  Ha nọkwa na-ege ya ntị ruo mgbe o kwuru ihe a, ha wee tie mkpu, sị: “Wepụnụ nwoke dị otú a n’ụwa, n’ihi na o kwesịghị ịdị ndụ!”+ 23  Ebe ha nọkwa na-eti mkpu ma na-atụsasị uwe elu ha, na-ekpolikwa uzuzu elu,+ 24  ọchịagha ahụ nyere iwu ka a kpọbata ya n’ogige ndị agha ma kwuo na a ga-eji ịpịa ihe gbaa ya ajụjụ, ka ya wee mara n’ụzọ zuru ezu ihe mere ha ji na-eti mkpu+ megide ya n’ụzọ dị otú a. 25  Ma mgbe ha gbatịrị Pọl ka a pịa ya ụtarị, ọ gwara onyeisi ndị agha guzo n’ebe ahụ, sị: “Iwu ọ̀ kwadoro ka unu pịa onye Rom+ nke a na-amaghị ikpe ihe?” 26  Ma mgbe onyeisi ndị agha ahụ nụrụ ihe a, ọ gakwuuru ọchịagha ahụ, sị ya: “Gịnị ka ị chọrọ ime? Ị ma na nwoke a bụ onye Rom.” 27  Ya mere, ọchịagha ahụ bịakwutere ya, sị ya: “Gwa m, Ị̀ bụ onye Rom?”+ O wee sị: “Ee.” 28  Ọchịagha ahụ zara ya, sị: “Eji m ego buru ibu zụta ikike a nke ịbụ nwa amaala.” Pọl wee sị: “Ma m nwetara ikike a site n’ọmụmụ.”+ 29  Ya mere, ozugbo ahụ, ndị ikom ahụ ndị chọrọ iji mmekpọ ọnụ gbaa ya ajụjụ si n’ebe ọ nọ pụọ; ọchịagha ahụ tụkwara egwu mgbe ọ chọpụtara na ọ bụ onye Rom+ nakwa na ya ekeworị ya agbụ. 30  Ya mere, n’echi ya, ebe ọ chọrọ ịmara kpọmkwem ihe mere ndị Juu ji na-ebo ya ebubo, ọ tọpụrụ ya ma nye ndị isi nchụàjà na Sanhedrin dum iwu ka ha zukọọ. O wee kpọdata Pọl ma mee ka o guzoro n’etiti ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji