Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọrụ Ndịozi 2:1-47

2  Ka ụbọchị ememme Pentikọst+ na-aga n’ihu, ha niile zukọrọ n’otu ebe.  Na mberede, a nụrụ ụzụ si n’eluigwe dị nnọọ ka oké ifufe nke na-efesi ike, o wee ju ụlọ ahụ dum bụ́ ebe ha niile nọ ala.+  Ha hụkwara ihe ndị dị ka ire ọkụ.+ E kesasịkwara ha, otu dịkwa n’isi onye nke ọ bụla n’ime ha.  Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ,+ malite ikwu okwu n’asụsụ+ dị iche iche, dị nnọọ ka mmụọ nsọ nọ na-enye ha ike ikwu okwu.  Dị ka ihe si dịrị, e nwere ndị Juu nọ na Jeruselem,+ bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke,+ ndị si ná mba niile dị n’okpuru eluigwe.  Ya mere, mgbe a nụrụ ụzụ a, ìgwè mmadụ gbakọtara ma nọrọ ná mgbagwoju anya, n’ihi na onye ọ bụla nụrụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ nke ya.  N’ezie, o juru ha anya, ha malitekwara ịtụgharị uche, sị: “Leedị, ndị a niile na-ekwu okwu bụ ndị Galili,+ ọ̀ bụ na ha abụghị?  Ma olee otú o si bụrụ na onye ọ bụla n’ime anyị na-anụ asụsụ nke ya, bụ́ asụsụ anyị na-asụ kemgbe a mụrụ anyị?  Ndị Patia na ndị Midia+ na ndị Ilam,+ nakwa ndị bi na Mesopotemia, nakwa na Judia+ na Kapadoshia,+ Pọntọs+ na mpaghara Eshia,+ 10  nakwa Frijia+ na Pamfilia,+ Ijipt na mpaghara ụfọdụ nke Libia, nke dị nso na Saịrini, na ndị si Rom bịa ịnọ nwa oge, ma ndị Juu ma ndị a tọghatara atọghata,+ 11  ndị Krit+ na ndị Arebia,+ anyị na-anụ ka ha na-ekwu okwu n’asụsụ anyị banyere ihe ndị dị ebube nke Chineke.” 12  Ee, o juru ha niile anya, gbagwojuokwa ha anya. Ha wee na-agwa ibe ha, sị: “Gịnị ka nke a pụtara?” 13  Otú ọ dị, ndị ọzọ kwara ha emo wee malite sị: “Ha aṅụjuwo mmanya dị ụtọ afọ.”+ 14  Ma Pita biliri ọtọ, ya na ndịozi iri na otu+ ahụ, o welikwara olu ya ma gwa ha, sị: “Ndị Judia na unu niile ndị bi na Jeruselem,+ maranụ nke a, ṅaakwanụ ntị n’ihe m na-ekwu. 15  N’eziokwu, mmanya adịghị egbu ndị a,+ dị ka unu na-eche, n’ihi na ọ bụ awa nke atọ* n’ụbọchị. 16  Kama nke ahụ, nke a bụ ihe e kwuru site n’ọnụ Joel onye amụma, 17  ‘“N’oge ikpeazụ,” ka Chineke na-ekwu, “m ga-awụkwasị mmụọ m+ n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla, ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebukwa amụma, ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ, ndị agadi unu ga-arọkwa nrọ;+ 18  ọbụnakwa n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwoke na n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwaanyị ka m ga-awụkwasị mmụọ m n’ụbọchị ndị ahụ, ha ga-ebukwa amụma.+ 19  M ga-eme ka e nwee ihe ebube n’eluigwe nakwa ihe ịrịba ama n’ụwa, ọbara na ọkụ na anwụrụ ọkụ.+ 20  A ga-eme ka anyanwụ+ ghọọ ọchịchịrị, meekwa ka ọnwa ghọọ ọbara tupu oké ụbọchị dị ebube nke Jehova abịa.+ 21  Onye ọ bụla nke na-akpọku aha Jehova ka a ga-azọpụta.”’+ 22  “Ndị ikom Izrel, nụrụnụ okwu ndị a: Jizọs Onye Nazaret,+ nwoke nke Chineke gosiri unu n’ihu ọha site n’ọrụ ndị dị ike+ na ihe ebube na ihe ịrịba ama ndị Chineke mere site n’aka ya n’etiti unu,+ dị nnọọ ka unu onwe unu maara, 23  nwoke a, onye e nyefere dị ka ihe Chineke kpebiri na ihe o bu ụzọ mara si dị,+ ka unu kpọgidere n’osisi site n’aka ndị na-emebi iwu wee gbuo ya.+ 24  Ma Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ+ site n’ịtọpụ agbụ nke ọnwụ,+ n’ihi na o kweghị omume na ọnwụ ga-ejidesi ya ike.+ 25  N’ihi na Devid kwuru banyere ya, sị, ‘Jehova nọ mgbe niile n’ihu m; n’ihi na ọ nọ m n’aka nri ka e wee ghara ime ka m maa jijiji ma ọlị.+ 26  N’ihi ya, obi tọrọ m ụtọ, ire m ji oké ọṅụ kwuo okwu. Ọbụna anụ ahụ́ m ga-enwekwa olileanya;+ 27  n’ihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m n’ime Hedis, ị gaghịkwa ekwe ka onye na-eguzosi ike n’ebe ị nọ ree ure.+ 28  I mewo ka m mara ụzọ ndụ, ị ga-ejikwa ihu gị mee ka m jupụta n’ezi obi ụtọ.’+ 29  “Ụmụnna m, o ziri ezi iji nkwuwa okwu gwa unu okwu banyere onyeisi ezinụlọ bụ́ Devid, na ọ nwụrụ,+ e liekwa ya, ili ya dịkwa n’etiti anyị ruo taa. 30  Ya mere, ebe ọ bụ onye amụma, marakwa na Chineke ṅụụrụ ya iyi na ya ga-eme ka otu n’ime ụmụ ya nọkwasị n’ocheeze ya,+ 31  ọ hụrụ ya tupu oge eruo ma kwuo okwu banyere mbilite n’ọnwụ Kraịst, na a hapụghị ya n’ime Hedis, anụ ahụ́ ya ereghịkwa ure.+ 32  Jizọs a ka Chineke kpọlitere n’ọnwụ, bụ́ eziokwu nke anyị niile bụ ndị àmà ya.+ 33  Ya mere, ebe e buliri ya elu ka ọ nọrọ n’aka nri Chineke,+ o wee nata mmụọ nsọ ahụ e kwere ná nkwa site n’aka Nna ya,+ ọ wụpụwo ihe a nke unu na-ahụ ma na-anụ. 34  N’ezie, Devid arịgoghị n’eluigwe,+ ma ya onwe ya sịrị, ‘Jehova gwara Onyenwe m, sị: “Nọdụ ala n’aka nri m,+ 35  ruo mgbe m debere ndị iro gị ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ gị.”’+ 36  Ya mere, ka ụlọ Izrel dum mara n’ezie na Chineke mere ya Onyenwe anyị+ na Kraịst, bụ́ Jizọs a, onye unu kpọgidere n’osisi.”+ 37  Ma mgbe ha nụrụ nke a, ọ dụrụ ha adụ n’obi,+ ha wee gwa Pita na ndịozi ndị ọzọ, sị: “Ụmụnna anyị, gịnị ka anyị ga-eme?”+ 38  Pita gwara ha, sị: “Chegharịanụ,+ ka e meekwa onye ọ bụla n’ime unu baptizim+ n’aha+ Jizọs Kraịst ka e wee gbaghara unu mmehie unu,+ unu ga-anatakwa mmụọ nsọ ahụ a na-enye n’efu.+ 39  N’ihi na ọ bụ unu na ụmụ unu na ndị niile nọ n’ebe dị anya+ ka e kwere nkwa ahụ,+ bụ́ ndị niile Jehova bụ́ Chineke anyị ga-akpọtara onwe ya.”+ 40  O kwuru ọtụtụ ihe ndị ọzọ wee gbaa àmà nke ọma. Ọ gbakwara ha ume, sị: “Bụrụnụ ndị a ga-azọpụta n’ọgbọ a gbagọrọ agbagọ.”+ 41  Ya mere, e mere ndị ji obi ha niile nabatara okwu ya baptizim,+ a tụkwasịkwara ihe dị ka puku mkpụrụ obi atọ n’ụbọchị ahụ.+ 42  Ha nọkwa na-ege ntị n’ozizi ndịozi, ha na ibe ha ana-ekerịta ihe,+ na-erikọ nri,+ na-ekpekọkwa ekpere.+ 43  Egwu wee malite ịtụ mkpụrụ obi ọ bụla. Ndịozi malitekwara ime ọtụtụ ihe ebube na ihe ịrịba ama.+ 44  Ndị niile ghọrọ ndị kwere ekwe nọkọrọ ọnụ, ha nwekọkwara ihe niile ọnụ.+ 45  Ha na-erekwa ihe onwunwe+ ha na akụ̀ ha ma na-ekesara mmadụ niile ihe ha retara n’ihe ndị a, dị nnọọ ka mkpa onye ọ bụla si dị.+ 46  Kwa ụbọchị, ha na-eji otu obi anọ mgbe niile n’ụlọ nsọ,+ ha na-erikwa ihe oriri n’ụlọ ibe ha, jirikwa oké ọṅụ+ na ezi obi na-eri nri, 47  na-enye Chineke otuto, na-enwetakwa ihu ọma mmadụ niile.+ N’otu mgbe ahụ, Jehova nọkwa na-atụkwasịrị+ ha kwa ụbọchị ndị a na-azọpụta.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọrụ 2:15*  Ihe dị ka n’elekere itoolu nke ụtụtụ.