Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọrụ Ndịozi 17:1-34

17  Ha wee mee njem gafee Amfipọlis na Apọlonịa, bịarute Tesalonaịka,+ bụ́ ebe e nwere ụlọ nzukọ ndị Juu.  Ya mere, dị ka Pọl na-emekarị,+ ọ bakwuuru ha, ya na ha nọ na-atụgharị uche n’Akwụkwọ Nsọ ruo ụbọchị izu ike atọ,+  na-akọwa ma jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi na ọ dị mkpa ka Kraịst taa ahụhụ,+ ka o sikwa ná ndị nwụrụ anwụ bilie,+ na-asị: “Ọ bụ onye a bụ Kraịst,+ ya bụ, Jizọs a, onye m na-ekwusara unu.”  N’ihi ya, ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị kwere ekwe,+ sorokwa Pọl na Saịlas+ na-akpakọrịta, ìgwè ndị Grik bara ụba bụ́ ndị na-efe Chineke na ọtụtụ ndị inyom a ma ama mere otú ahụ.  Ma ebe ndị Juu na-ekwo ekworo,+ ha kpọọrọ ụfọdụ ndị ikom ọjọọ n’etiti ndị na-akwụgharị n’ọma ahịa, ha wee ghọọ otu ìgwè mmadụ, wee mee ka obodo ahụ jupụta n’oké ụzụ.+ Ha wakpokwara ụlọ Jesin+ wee na-achọ inyefe ha n’aka ìgwè ahụ na-akpa aghara.  Ma mgbe ha na-ahụghị ha, ha dọkpụụrụ Jesin na ụmụnna ụfọdụ gakwuru ndị na-achị obodo, na-eti mkpu, sị: “Ndị a, bụ́ ndị kpuworo elu ụwa mmadụ bi ihu,+ nọkwa n’ebe a,  Jesin nabatakwara ha nke ọma. Ndị a niile na-emekwa ihe megidere iwu+ Siza, na-ekwu na e nwere eze ọzọ,+ bụ́ Jizọs.”  N’ezie, ha kpasuru ìgwè mmadụ ahụ na ndị na-achị obodo mgbe ha nụrụ ihe ndị a;  mgbe ha bukwa ụzọ natasịa ihe ibé zuru ezu n’aka Jesin na ndị nke ọzọ, ha hapụrụ ha ka ha laa. 10  Ozugbo o ruru n’abalị,+ ụmụnna zipụrụ ma Pọl ma Saịlas ka ha gaa Beria. Mgbe ha garuru, ha banyere n’ụlọ nzukọ ndị Juu. 11  Ndị Beria nwere ezi obi karịa ndị bi na Tesalonaịka, n’ihi na ha ji oké ịnụ ọkụ n’obi nabata okwu Chineke, na-enyocha+ Akwụkwọ Nsọ+ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a hà dị otú ahụ.+ 12  Ya mere, ọtụtụ n’ime ha ghọrọ ndị kwere ekwe, otú a kwa ka ọ dị ọtụtụ ndị inyom na ndị ikom Grik a na-akwanyere ùgwù.+ 13  Ma mgbe ndị Juu ndị si Tesalonaịka nụrụ na Pọl kwusakwara okwu Chineke na Beria, ha bịakwara ebe ahụ ka ha kpalie+ ma kpasuo+ ọha mmadụ. 14  Mgbe ahụ, ụmụnna zipụrụ Pọl ozugbo ka ọ garuo oké osimiri;+ ma Saịlas na Timoti nọgidere n’ebe ahụ. 15  Otú ọ dị, ndị na-edupụ Pọl duuru ya ruo Atens, mgbe ha natasịrị iwu ka Saịlas na Timoti+ bịakwute ya ngwa ngwa o kwere omume, ha lawara. 16  Ma ka Pọl nọ na-echere ha n’Atens, o wutere ya na mmụọ+ ya mgbe ọ hụrụ na obodo ahụ jupụtara n’arụsị. 17  N’ihi ya, ọ malitere iso ndị Juu+ na ndị ọzọ bụ́ ndị na-efe Chineke na-atụgharị uche n’ụlọ nzukọ. Kwa ụbọchị, ọ na-esokwa ndị nọ n’ọma ahịa+ atụgharị uche. 18  Ma ụfọdụ ndị ọkà ihe ọmụma, bụ́ ndị òtù Epikurọs na ndị òtù Stoik,+ malitere ịrụ ya ụka, ụfọdụ na-asị: “Gịnị ka onye ekwurekwu a chọrọ ikwu?”+ Ndị ọzọ na-asị: “O yiri onye na-ekwusa banyere chi ndị mba ọzọ.” Ọ bụ n’ihi na ọ na-ezisa ozi ọma banyere Jizọs na mbilite n’ọnwụ ya.+ 19  Ha wee jide ya, kpụrụ ya gaa n’Ariopagọs, sị ya: “Ànyị nwere ike ịmara ihe ozizi ọhụrụ+ a nke i na-ezi bụ? 20  N’ihi na ị na-akụzi ihe ndị anyị na-anụtụbeghị ná ntị. Ya mere, anyị chọrọ ịmara ihe ihe ndị a pụtara.”+ 21  N’eziokwu, ndị Atens, tinyere ndị mba ọzọ niile bịara ịnọtụ nwa oge n’ebe ahụ adịghị eji oge ezumike ha eme ihe ọzọ ma e wezụga ịkọ ma ọ bụ ige ntị n’ihe ọhụrụ. 22  Ma Pọl guzoro ọtọ n’etiti Ariopagọs+ wee sị: “Ndị Atens, ahụrụ m na, n’ihe niile, o yiri ka ùnu na-ekpere chi dị iche iche+ karịa ndị ọzọ. 23  Dị ka ihe atụ, mgbe m na-agafe ma na-eleru anya nke ọma n’ihe unu na-enye nsọpụrụ, ahụkwara m otu ebe ịchụàjà nke ihe e dere n’elu ya bụ: ‘Nye Chi A Na-amaghị Ama.’ Ya mere, ihe unu na-efe n’amaghị ama, ọ bụ ya ka m na-ekwusara unu. 24  Chineke nke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, ebe ọ bụ Onyenwe eluigwe na ụwa,+ ọ dịghị ebi n’ụlọ nsọ ndị e ji aka wuo,+ 25  aka ụmụ mmadụ adịghịkwa ejere ya ozi dị ka à ga-asị na o nwere ihe na-akpa ya,+ n’ihi na ya onwe ya na-enye mmadụ niile ndụ+ na ume+ na ihe niile. 26  O sitekwara n’otu mmadụ+ mee mba ọ bụla+ nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum,+ o kpebikwara oge+ dị iche iche a kara aka, kpaakwara ebe obibi nke ụmụ mmadụ ókè.+ 27  ka ha wee chọọ Chineke,+ ka ha wee sọọ ìsì ma chọta ya n’ezie,+ ọ bụ ezie na ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ. 28  N’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-ejegharị, na-adị ndụ,+ ọbụna dị ka ụfọdụ ndị na-ede abụ uri+ n’etiti unu kwuru, ‘N’ihi na anyị bụkwa ndị ọ mụrụ.’ 29  “Ya mere, ebe ọ bụ na anyị bụ ndị Chineke mụrụ,+ anyị ekwesịghị iche na Chineke+ yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume, dị ka ihe a kpụrụ akpụ site na nkà na nchepụta nke mmadụ.+ 30  N’eziokwu, Chineke elefuruwo oge amaghị ihe dị otú ahụ anya,+ ma ugbu a ọ na-agwa ihe a kpọrọ mmadụ na ha niile kwesịrị ichegharị n’ebe niile.+ 31  N’ihi na o wepụtawo otu ụbọchị nke o zubere ikpe+ elu ụwa mmadụ bi ikpe n’ezi omume site n’aka otu nwoke onye ọ họpụtara, o nyewokwa mmadụ niile ihe ga-emesi ha obi ike, ebe ọ bụ na o mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.”+ 32  Mgbe ha nụrụ banyere mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ụfọdụ malitere ịkwa emo,+ ebe ndị ọzọ sịrị: “Anyị ga-anụ banyere nke a ọbụna n’oge ọzọ.” 33  Ya mere, Pọl si n’etiti ha pụọ, 34  ma ndị ikom ụfọdụ sonyeere ya wee ghọọ ndị kwere ekwe, ụfọdụ n’ime ha bụ Dayọnisiọs, bụ́ ọkàikpe nke ụlọikpe Ariopagọs,+ na otu nwaanyị aha ya bụ Damaris, na ndị ọzọ ma e wezụga ndị a.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji