Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọrụ Ndịozi 15:1-41

15  Ndị ikom ụfọdụ sikwa Judia+ bịa wee malite ịkụziri ụmụnna, sị: “Ọ bụrụ na e bighị unu úgwù+ dị ka omenala si n’aka Mozis si dị,+ a pụghị ịzọpụta unu.”  Ma mgbe ha na Pọl na Banabas nwere nghọtahie, rụọkwa ụka nke ukwuu, ha mere ndokwa ka Pọl na Banabas na ụfọdụ ndị ọzọ n’ime ha gakwuru ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem+ banyere arụmụka a.  Ya mere, mgbe ọgbakọ+ ahụ dupụsịrị ndị ikom a, ha gara ma Finishia ma Sameria, na-akọ n’ụzọ zuru ezu otú ndị mba ọzọ+ si na-echegharị, ha nọkwa na-eme ka ụmụnna niile na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu.+  Mgbe ha bịarutere Jeruselem, ọgbakọ ahụ na ndịozi na ndị okenye ji obiọma nabata ha,+ ha kọkwara ọtụtụ ihe Chineke mere site n’aka ha.+  Ma, ụfọdụ n’ime ndị nọ n’òtù ndị Farisii, bụ́ ndị kwere ekwe, biliri n’oche ha, sị: “Ọ dị mkpa ka e bie ha úgwù,+ nyekwa ha iwu ka ha na-edebe iwu Mozis.”+  Ndịozi na ndị okenye ahụ zukọtara ka ha leba anya n’okwu a.+  Ma mgbe ha rụsịrị ụka nke ukwuu,+ Pita biliri, sị ha: “Ụmụnna m, unu maara nke ọma na, site na mmalite, Chineke si n’etiti unu họrọ m, ka ndị mba ọzọ wee site n’ọnụ m nụ okwu banyere ozi ọma ma kwere;+  Chineke, onye maara obi,+ gbakwara akaebe site n’inye ha mmụọ nsọ,+ dị nnọọ ka o nyekwara anyị.  Ọ kpaghịkwa ókè ọ bụla ma ọlị n’etiti anyị na ha,+ kama o mere ka obi ha dị ọcha site n’okwukwe.+ 10  Ya mere, ugbu a, gịnị mere unu ji etinye Chineke n’ule site n’ịnyakwasị ndị na-eso ụzọ Jizọs yok n’olu,+ bụ́ nke nna nna anyị hà ma ọ bụ anyị onwe anyị na-ebulighị?+ 11  Kama nke ahụ, anyị nwere obi ike na a ga-azọpụta anyị site n’obiọma+ Onyenwe anyị Jizọs nke na-erughịrị mmadụ, n’otu ụzọ ahụ a ga-azọpụta ndị ahụ.”+ 12  N’ihi nke ahụ, ìgwè mmadụ ahụ dum gbachiri nkịtị, ha malitekwara ige Banabas na Pọl ntị ka ha na-akọ ọtụtụ ihe ịrịba ama na ihe ebube Chineke mere site n’aka ha n’etiti ndị mba ọzọ.+ 13  Mgbe ha kwụsịrị ikwu okwu, Jems kwuru, sị: “Ụmụnna m, geenụ m ntị.+ 14  Simiọn+ kọrọ nke ọma otú Chineke si chee ihu ya n’ebe ndị mba ọzọ nọ na nke mbụ ya, isi n’etiti ha wepụtara aha ya otu ndị.+ 15  Nke a na okwu Ndị Amụma kwekọrọ, dị nnọọ ka e dere, sị, 16  ‘Mgbe ihe ndị a gasịrị, m ga-alaghachi wee wughachi ụlọ ndò Devid nke dara ada; m ga-ewughachikwa mkpọmkpọ ebe ya ma wulite ya ọzọ,+ 17  ka ndị fọdụrụ n’ime ndị a wee chọsie Jehova ike, ha na ndị mba ọzọ niile, ndị a kpọkwasịrị aha m, ka Jehova kwuru, onye na-eme ihe ndị a,+ 18  bụ́ ihe ndị a maara site n’oge ochie.’+ 19  N’ihi ya, mkpebi m abụghị ka e nye ndị si ná ndị mba ọzọ na-echigharịkwute Chineke nsogbu,+ 20  kama ka e degara ha akwụkwọ ka ha na-ezere ihe ndị e ji arụsị merụọ,+ na-ezerekwa ịkwa iko+ na anụ a nyagburu anyagbu+ na ọbara.+ 21  N’ihi na site n’oge ochie, e nwere ndị na-ekwusa ihe e dere n’akwụkwọ Mozis n’obodo dị iche iche, n’ihi na a na-agụpụta ihe ndị ahụ n’ụlọ nzukọ dị iche iche kwa ụbọchị izu ike.”+ 22  Mgbe ahụ, ndịozi na ndị okenye nakwa ọgbakọ ahụ dum kwadoro iziga ndị ikom a họọrọ n’etiti ha Antiọk, ha na Pọl na Banabas, ya bụ, Judas onye a na-akpọ Basabas+ nakwa Saịlas, bụ́ ndị ikom na-edu ndú n’etiti ụmụnna; 23  ha sikwa n’aka ha dee, sị: “Ọ bụ ụmụnna unu, ya bụ, ndịozi na ndị okenye, na-edetara ụmụnna ndị nọ n’Antiọk+ na Siria na Silishia,+ bụ́ ndị si ná ndị mba ọzọ, akwụkwọ ozi: Anyị na-ekele unu! 24  Ebe ọ bụ na anyị nụrụ na ụfọdụ ndị si n’etiti anyị ejiriwo okwu ọnụ sogbuo unu,+ na-agbalị ibibi mkpụrụ obi unu, ọ bụ ezie na anyị enyeghị ha ntụziaka ọ bụla.+ 25  Anyị ji otu olu kwekọrịta.+ Anyị kwadokwara ịhọrọ ndị ikom a ga-ezitere unu, tinyere ndị anyị hụrụ n’anya, bụ́ Banabas na Pọl,+ 26  bụ́ ndị nyefere mkpụrụ obi ha n’ihi aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.+ 27  Ya mere, anyị na-ezite Judas na Saịlas,+ ka ha wee jirikwa okwu ọnụ kọọ otu ihe ahụ.+ 28  N’ihi na ọ dị mmụọ nsọ mma,+ dịkwa anyị onwe anyị mma ka anyị ghara ịtụkwasịkwuru unu ibu arọ,+ ma e wezụga ihe ndị a dị mkpa, 29  ya bụ, ịdị na-ezere ihe e ji chụọrọ arụsị àjà,+ na ọbara+ na anụ a nyagburu anyagbu+ na ịkwa iko.+ Ọ bụrụ na unu elezie anya zere ihe ndị a,+ ọ ga-adịrị unu mma. Nọrọnụ nke ọma!” 30  Ya mere, mgbe ha zipụrụ ndị ikom a, ha gara Antiọk, ha wee kpọkọta ìgwè mmadụ ahụ ma nye ha akwụkwọ ozi ahụ.+ 31  Mgbe ha gụsịrị ya, ha ṅụrịrị ọṅụ n’ihi agbamume ahụ.+ 32  Ebe Judas na Saịlas bụ ndị amụma,+ ha gbara ụmụnna ahụ ume, meekwa ka ha sie ike, site n’ịgwa ha ọtụtụ okwu.+ 33  Ya mere, mgbe ha nọtụrụ ebe ahụ, ụmụnna ahụ hapụrụ ha ka ha lawa n’udo,+ lakwuru ndị zitere ha. 34*  —— 35  Otú ọ dị, Pọl na Banabas nọgidere n’Antiọk,+ ha na ọtụtụ ndị ọzọ kwa, na-ezi ihe ma na-ezisa ozi ọma banyere okwu Jehova.+ 36  Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, Pọl sịrị Banabas: “Bịa ka anyị laghachi gaa leta ụmụnna anyị n’obodo niile anyị kwusara okwu Jehova, ka anyị hụ otú ha mere.”+ 37  N’aka nke ya, Banabas kpebisiri ike ịkpọrọkwa Jọn, bụ́ onye a na-akpọ Mak.+ 38  Ma Pọl echeghị na o kwesịrị ekwesị ịkpọrọ onye a ka o soro ha, ebe ọ bụ na ọ gbahapụrụ ha na Pamfilia,+ o soghịkwa ha gaa ọrụ ahụ. 39  Ha abụọ wee see ezigbo okwu, nke mere na ha kewara. Banabas+ wee kpọrọ Mak ma soro ụgbọ mmiri gawa Saịprọs.+ 40  Pọl họọrọ Saịlas+ ma gawa, mgbe ụmụnna nyefesịrị ya n’aka obiọma Jehova nke na-erughịrị mmadụ.+ 41  Ma ọ gara Siria na Silishia, na-ewusi ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ ike.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọrụ 15:34*  Lee ihe e dere n’ala ala peeji na Mt 17:21.