Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọrụ Ndịozi 12:1-25

12  N’ihe dị ka n’oge ahụ, Herọd bụ́ eze malitere imeso ụfọdụ n’ime ndị nọ n’ọgbakọ mmeso ọjọọ.+  O ji mma agha+ gbuo Jems nwanne Jọn.+  Ebe ọ hụrụ na ọ dị ndị Juu mma,+ o jidekwuru Pita. (Dị ka o si dị, ụbọchị ndị ahụ bụ ụbọchị ememme achịcha na-ekoghị eko.)+  Mgbe o jidere ya, ọ tụbara ya n’ụlọ mkpọrọ,+ nyefee ya n’aka ìgwè ndị agha anọ dị mmadụ anọ anọ bụ́ ndị na-agbanwerịta onwe ha iche ya nche, ebe o bu n’uche ịkpọpụtara ya ndị Juu ma ememme ngabiga gasịa.+  N’ihi ya, e debere Pita n’ụlọ mkpọrọ; ma ọgbakọ ahụ nọ na-ekpekusi Chineke ekpere+ ike maka ya.  Mgbe Herọd na-aga ịkpọpụta ya, n’abalị ahụ Pita bu ụdọ ìgwè abụọ e kere ya na-ehi ụra n’agbata ndị agha abụọ, ndị nche nọkwa n’ọnụ ụzọ na-eche ụlọ mkpọrọ ahụ nche.  Ma, lee! mmụọ ozi Jehova guzoro nso,+ ìhè nwukwara n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ kụtụrụ Pita aka n’akụkụ, kpọtee ya,+ sị: “Bilie ọsọ ọsọ!” Agbụ ígwè e kere ya n’aka wee dapụsịa.+  Mmụọ ozi+ ahụ sịrị ya: “Kee ihe n’úkwù gị, yirikwa akpụkpọ ụkwụ gị.” O wee mee otú ahụ. N’ikpeazụ, ọ sịrị ya: “Yiri uwe elu gị,+ soro m.”  O wee pụọ, soro ya na-aga, ma ọ maghị na ihe ahụ nke na-eme site n’aka mmụọ ozi ahụ na-eme n’ìhè. N’eziokwu, o chere na ya na-ahụ ọhụụ.+ 10  Ka ha gafeere ìgwè ndị nche mbụ na nke abụọ ha rutere n’ọnụ ụzọ ámá e ji ígwè mee nke e si abanye n’ime obodo, nke a meghekwaara ha n’onwe ya.+ Mgbe ha pụsịkwara ha gbadakwuru n’otu okporo ámá, ozugbo ahụkwa mmụọ ozi ahụ hapụrụ ya. 11  Mgbe Pita ghọtara onwe ya, ọ sịrị: “Ugbu a ka m maara n’ezie na Jehova zitere mmụọ ozi+ ya wee napụta+ m n’aka Herọd nakwa n’ihe niile ndị Juu nọ na-atụ anya ya.” 12  Mgbe o chesịrị echiche banyere ya, ọ gara n’ụlọ Meri nne Jọn, onye a na-akpọkwa Mak,+ bụ́ ebe ọtụtụ mmadụ zukọtara na-ekpe ekpere. 13  Mgbe ọ kụrụ aka n’ọnụ ụzọ ámá, otu nwa agbọghọ na-eje ozi, onye aha ya bụ Roda, bịara ịmara onye na-akụ aka, 14  ozugbo ọ ghọtara na ọ bụ olu Pita, ọṅụ ekweghị ya meghee ọnụ ụzọ ámá ahụ, kama ọ gbabara n’ime ụlọ ma kọọ na Pita guzo n’ihu ọnụ ụzọ ámá ahụ. 15  Ha sịrị ya: “Ara na-agba gị.” Ma ọ nọgidere na-ekwusi ike na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị. Ha malitere ịsị: “Ọ bụ mmụọ ozi ya.”+ 16  Ma Pita nọgidere n’ebe ahụ na-akụ aka. Mgbe ha meghere ụzọ, ha hụrụ ya, o wee ju ha anya. 17  Ma o feere+ ha aka ka ha ghara ikwu okwu, o wee kọọrọ ha n’ụzọ zuru ezu otú Jehova si kpọpụta ya n’ụlọ mkpọrọ, o wee sị: “Kọọrọnụ Jems+ na ụmụnna ihe ndị a.” Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ pụrụ gawa ebe ọzọ. 18  Otú ọ dị, mgbe chi bọrọ,+ e nwere ọgba aghara dị ukwuu n’etiti ndị agha ahụ banyere ihe mere Pita. 19  Herọd+ chọsiri ya ike, mgbe ọ na-achọtaghị ya, ọ gbara ndị nche ahụ ajụjụ ma nye iwu ka a kpụpụ ha ma nye ha ntaramahụhụ;+ o wee si na Judia gbadaa Sesaria ma nọtụ n’ebe ahụ. 20  Ma Herọd nọ na-eweso ndị Taya na ndị Saịdọn iwe dị ukwuu. Ya mere, ha ji otu obi bịakwute ya, mgbe ha mesịkwara ka Blastọs, bụ́ onye na-elekọta ụlọ ihi ụra eze, kweta, ha malitere ịrịọ ka ha kpezie, n’ihi na e si ná mba onye eze ahụ na-enye mba ha ihe oriri.+ 21  Ma n’ụbọchị a kara aka, Herọd yiiri uwe onye eze ma nọdụ ala n’oche ikpe wee malite ịgwa ha okwu n’ihu ọha. 22  Ndị ahụ zukọtara malitere iti mkpu, sị: “Ọ bụ olu chi, ọ bụghị olu mmadụ!”+ 23  Mmụọ ozi Jehova tiri ya ihe ozugbo,+ n’ihi na o nyeghị Chineke otuto ahụ;+ ikpuru tagburu ya, o wee kubie ume. 24  Ma okwu+ Jehova nọ na-eto eto ma na-agbasa.+ 25  Ma mgbe Banabas+ na Sọl zigachara ihe enyemaka+ ahụ dum na Jeruselem, ha laghachiri, ha kpọkwaara Jọn,+ onye a na-akpọ Mak.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji