Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọrụ Ndịozi 11:1-30

11  Ma, ndịozi na ụmụnna nọ na Judia nụrụ na ndị mba ọzọ+ anatawokwa okwu Chineke.  Ya mere, mgbe Pita gbagotere Jeruselem, ndị na-akwado ibi úgwù+ malitere ịrụ ya ụka,  na-ekwu na ọ banyere n’ụlọ ndị ikom a na-ebighị úgwù, sorokwa ha rie ihe.  Pita bidoro ikwu okwu wee gaa n’ihu ịkọwara ha ihe niile, sị:  “Anọ m n’obodo Jọpa na-ekpe ekpere, n’ọhụụ, ahụrụ m otu arịa ka ọ na-agbadata dị ka nnukwu ibé ákwà linin nke e ji isi anọ ya aka, nke e si n’eluigwe na-ewedata, o rutekwara m nso nke ọma.  Ka m nọ na-ele anya n’ime ya, eleruru m anya ma hụ anụ ndị nwere ụkwụ anọ, bụ́ ndị bi n’ụwa, na anụ ọhịa na ihe ndị na-akpụ akpụ na anụ ufe niile nke eluigwe.+  Anụkwara m ka otu olu sịrị m: ‘Bilie, Pita, gbuo rie!’+  Ma m sịrị, ‘Ọ dịghị ma ọlị, Onyenwe anyị, n’ihi na ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ihe na-adịghị ọcha abatụbeghị m n’ọnụ.’+  Na nke ugboro abụọ ya, olu ahụ nke si n’eluigwe zara, sị, ‘Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.’+ 10  Nke a mere nke ugboro atọ ya, e wee dọrọghachi ihe niile gaa n’eluigwe.+ 11  Lee! ozugbo ahụ, e nwere ndị ikom atọ guzo n’ihu ụlọ ahụ anyị nọ n’ime ya, ha bụ ndị e si na Sesaria zite ka ha bịakwute m.+ 12  Ya mere, mmụọ nsọ+ gwara m ka m soro ha gawa, n’enweghị obi abụọ ọ bụla. Ma ụmụnna isii ndị a sokwa m gaa, anyị wee banye n’ime ụlọ nwoke ahụ.+ 13  “Ọ kọọrọ anyị otú o si hụ mmụọ ozi ka o guzo n’ụlọ ya wee sị: ‘Ziga ndị ikom na Jọpa ka ha gaa kpọọ Saịmọn, onye a na-akpọkwa Pita,+ 14  ọ ga-agwakwa gị ihe ndị ahụ bụ́ ihe ndị a pụrụ isite na ha zọpụta gị na ezinụlọ gị.’+ 15  Ma mgbe m malitere ikwu okwu, mmụọ nsọ dakwasịrị ha dị nnọọ ka ọ dakwasịkwara anyị ná mmalite.+ 16  M wee cheta okwu Onyenwe anyị, ihe ọ na-ekwu n’oge gara aga, sị, ‘Jọn ji mmiri mee baptizim,+ ma a ga-eji mmụọ nsọ mee unu baptizim.’+ 17  Ya mere, ọ bụrụ na Chineke nyere ha otu onyinye ahụ a na-enye n’efu dị ka o nyekwara anyị bụ́ ndị kweere n’Onyenwe anyị Jizọs Kraịst,+ ònye ka m bụ na m ga-enwe ike igbochi Chineke ime ihe?”+ 18  Ma mgbe ha nụrụ ihe ndị a, ha kwetara,+ ha wee nye Chineke otuto,+ sị: “Ọ bụrụ otú ahụ, Chineke enyewo ndị mba ọzọ ohere ichegharị ka ha onwe ha kwa wee nweta ndụ.”+ 19  N’ihi ya, ndị a chụsasịrị+ n’ihi mkpagbu nke malitere n’ihe banyere Stivin garuru Finishia+ na Saịprọs+ na Antiọk, ma ha agwaghị onye ọ bụla okwu Chineke ma e wezụga naanị ndị Juu.+ 20  Otú ọ dị, e nwere ụfọdụ n’ime ha bụ́ ndị Saịprọs na ndị Saịrini bụ́ ndị bịara Antiọk ma malite ịgwa ndị na-asụ Grik+ okwu, na-ezisa ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.+ 21  Aka Jehova+ dịnyekwaara ha, ọnụ ọgụgụ dịkwa ukwuu bụ́ ndị ghọrọ ndị kwere ekwe chigharịkwuuru Onyenwe anyị.+ 22  Akụkọ banyere ha ruru ọgbakọ dị na Jeruselem ntị, ha wee zipụ Banabas+ ka ọ gaa Antiọk. 23  Mgbe ọ bịarutere wee hụ obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ,+ ọ ṅụrịrị ọṅụ+ ma malite ịgba ha niile ume ka ha jiri obi ha kpebisie ike ịnọgide n’ime Onyenwe anyị;+ 24  n’ihi na ọ bụ ezi mmadụ ma jupụta na mmụọ nsọ na okwukwe. Ìgwè mmadụ dị ukwuu wee kwere n’Onyenwe anyị.+ 25  Ya mere, ọ gawara Tasọs+ ka ọ chọọ Sọl nke ọma,+ 26  mgbe ọ chọtara ya, ọ kpọtakwara ya Antiọk. Ya mere, ruo otu afọ zuru ezu, ha na ha na-ezukọta n’ọgbakọ, ha zikwara ìgwè mmadụ dị ukwuu ihe. Ọ bụkwa n’Antiọk ka e bu ụzọ site ná nduzi Chineke gụọ ndị na-eso ụzọ Jizọs aha bụ́ Ndị Kraịst.+ 27  Ma n’ụbọchị ndị a, ndị amụma+ si na Jeruselem gbadata Antiọk. 28  Otu n’ime ha, onye aha ya bụ Agabọs,+ biliri wee site n’ike mmụọ nsọ gosi na oké ụnwụ ga-ada n’elu ụwa dum mmadụ bi;+ bụ́ ụnwụ nke dara n’oge Klọdiọs. 29  Ya mere, ndị na-eso ụzọ Jizọs kpebisiri ike, onye ọ bụla n’ime ha dị ka o nwere ike inye,+ izigara ụmụnna bi na Judia ihe enyemaka;+ 30  ha mekwara otú a, wee zigara ya ndị okenye site n’aka Banabas na Sọl.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji