Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọpụpụ 5:1-23

5  E mesịa, Mozis na Erọn gara wee gwa Fero,+ sị: “Nke a bụ ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru, ‘Hapụ ndị m ka ha gaa meere m ememme n’ala ịkpa.’”+  Ma Fero sịrị: “Ònye bụ Jehova,+ nke mere m ga-eji rube isi n’ihe o kwuru wee hapụ ndị Izrel ka ha laa?+ Amaghị m onye Jehova bụ ma ọlị,+ agaghịkwa m ahapụ ndị Izrel ka ha laa.”+  Otú ọ dị, ha gara n’ihu ịsị: “Chineke ndị Hibru agwawo anyị okwu.+ Biko, anyị chọrọ ịga njem ga-ewe ụbọchị atọ n’ala ịkpa ka anyị wee chụọrọ Jehova bụ́ Chineke anyị àjà;+ ma ọ́ bụghị ya, ọ pụrụ iji ọrịa na-efe efe ma ọ bụ mma agha tie anyị ihe otiti.”+  Eze Ijipt wee sị ha: “Mozis na Erọn, gịnị mere unu ji na-eme ka ndị unu hapụ ọrụ ha?+ Gaanụ buwe ibu arọ unu!”+  Fero gara n’ihu ịsị: “Lee! Ndị a adịla ọtụtụ n’ala a,+ unu na-emekwa ka ha kwụsị ibu ibu arọ ha.”+  Ngwa ngwa n’ụbọchị ahụ, Fero nyere ndị na-amanye ndị Izrel ịrụ ọrụ nakwa ndị isi ha+ iwu, sị:  “Kwụsịnụ ikpokọta ahịhịa ọka* na-enye ndị Izrel dị ka unu na-emebu ka ha jiri ya na-akpụ brik.+ Ha jiri aka ha gaa kpokọtara onwe ha ahịhịa ọka.  Unu ga na-amanyekwa ha ịkpụ brik ole a chọrọ ka ha na-akpụ, dị ka ha na-akpụbu. Unu esepụrụla ha ihe ọ bụla, n’ihi na ha dị umengwụ.+ Ọ bụ ya mere ha ji na-eti mkpu, na-asị: ‘Anyị chọrọ ịla, anyị chọrọ ịchụrụ Chineke anyị àjà!’+  Meenụ ka ọrụ ndị ikom ahụ na-arụ dị arọ, ka ha rụọkwa ya, ka ha ghara ịṅa ntị n’okwu ụgha.”+ 10  Ndị na-amanye ndị Izrel ịrụ ọrụ+ na ndị isi ha wee gaa gwa ndị Izrel, sị: “Nke a bụ ihe Fero kwuru, ‘Agakwaghị m na-enye unu ahịhịa ọka. 11  Gaanụ jiri aka unu kpota ahịhịa ọka n’ebe ọ bụla unu nwere ike inweta ya, n’ihi na a gaghị esepụrụ unu ihe ọ bụla n’ihe unu na-arụ.’”+ 12  N’ihi ya, ndị Izrel gasasịrị n’ala Ijipt dum ịga kpokọta okporo ọka ha ga-eji mere ahịhịa ọka. 13  Ndị na-amanye ha ịrụ ọrụ nọ na-enye ha nsogbu,+ sị: “Rụchaanụ ọrụ unu, onye ọ bụla rụchaa ọrụ dịịrị ya n’ụbọchị, dị nnọọ ka mgbe a na-enye unu ahịhịa ọka.”+ 14  E mesịa, a pịara+ ndị isi+ ụmụ Izrel ihe, bụ́ ndị ndị isi ọrụ Fero mere ndị isi ha, na-asị: “Gịnị mere unu akpụchaghị brik+ ole e kenyere unu dị ka unu na-akpụbu, ma ụnyaahụ ma taa?”+ 15  N’ihi ya, ndị isi+ ụmụ Izrel gara wee malite ịkwasara Fero ákwá, na-asị: “Gịnị mere i ji emeso ndị ohu gị otú a? 16  E nyeghị ndị ohu gị ahịhịa ọka, ma ha na-asị, ‘Kpụọnụ brik!’ lee, a na-apịa ndị ohu gị ihe, ọ bụ ezie na ọ bụ ndị gị ka ụta dịịrị.”+ 17  Ma ọ sịrị: “Unu dị umengwụ, unu dị umengwụ!+ Ọ bụ ya mere unu ji asị, ‘Anyị chọrọ ịla, anyị chọrọ ịchụrụ Jehova àjà.’+ 18  Gaanụ rụwa ọrụ! Ọ bụ ezie na a gaghị enye unu ahịhịa ọka, ma unu ga-akpụ brik ole a gwara unu.”+ 19  Ndị isi ụmụ Izrel wee hụ na ha nọ n’ọnọdụ ọjọọ n’okwu ahụ+ bụ́: “Unu esepụla ihe ọ bụla na brik ole onye ọ bụla na-akpụ kwa ụbọchị.”+ 20  E mesịa, ha zutere Mozis na Erọn,+ bụ́ ndị guzo n’ebe ahụ izute ha mgbe ha hụchara Fero wee na-apụta. 21  Ozugbo ahụ, ha sịrị ha: “Ka Jehova lee unu anya wee kpee unu ikpe,+ ebe ọ bụ na unu emewo ka anyị sie ísì ọjọọ+ n’ihu Fero nakwa n’ihu ndị na-ejere ya ozi iji nye ha mma agha ka ha gbuo anyị.”+ 22  Mozis wee chigharịkwuru Jehova,+ sị: “Jehova, gịnị mere i ji kpatara ndị a ihe ọjọọ?+ Gịnị mere i ji ziga m?+ 23  N’ihi na malite n’oge m gara n’ihu Fero ikwu okwu n’aha gị,+ o mewo ndị a ihe ọjọọ,+ ị napụtaghịkwa ndị gị ma ọlị.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọpụ 5:7*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.