Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọpụpụ 13:1-22

13  Jehova gwakwara Mozis, sị:  “Dooro m ihe ọ bụla bụ́ oké e bu ụzọ mụọ nsọ, bụ́ nke meghere akpa nwa n’etiti ụmụ Izrel, n’etiti mmadụ nakwa n’etiti anụmanụ. Ọ bụ nke m.”+  Mozis wee gwa ndị Izrel, sị: “Ka a na-echeta taa nke ọ bụ na ya ka unu si n’Ijipt pụọ,+ n’ụlọ ndị ohu, n’ihi na Jehova ji ike aka ya si ebe a kpọpụta unu.+ Ya mere, a gaghị eri ihe ọ bụla e tinyere ihe na-eko achịcha.+  Taa, unu na-apụ n’ọnwa Ebib.+  Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova kpọbatara gị n’ala ndị Kenan na nke ndị Het na nke ndị Amọraịt na nke ndị Haịvaịt na nke ndị Jibọs,+ bụ́ nke ọ ṅụụrụ nna nna gị hà iyi inye gị,+ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,+ mgbe ahụ ị ga-eme ememme a n’ọnwa a.  Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko+ ụbọchị asaa, ụbọchị nke asaa ga-abụkwa ememme a na-emere Jehova.+  A ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa ahụ;+ a gaghị ahụ achịcha koro eko n’aka gị,+ a gaghịkwa ahụ ihe na-eko achịcha n’ime ókèala gị niile.+  Ị ga-agwakwa nwa gị n’ụbọchị ahụ, sị, ‘Ọ bụ n’ihi ihe ahụ Jehova meere m mgbe m si n’Ijipt pụta.’+  Ọ ga-abụrụ gị ihe ịrịba ama n’aka gị nakwa ihe ncheta n’agbata anya gị abụọ,+ ka iwu Jehova wee dịrị n’ọnụ gị;+ n’ihi na Jehova ji aka dị ike kpọpụta gị n’Ijipt.+ 10  Ị ga na-edebekwa ụkpụrụ a n’oge ya a kara aka site n’afọ ruo n’afọ.+ 11  “Ọ ga-erukwa na mgbe Jehova kpọbatara gị n’ala ndị Kenan,+ dị nnọọ ka ọ ṅụụrụ gị iyi, ṅụọkwara nna nna gị hà,+ mgbe o nyere gị ya, 12  ị ga-ewere onye ọ bụla nke meghere akpa nwa nye Jehova,+ ihe ọ bụla e bu ụzọ mụọ, bụ́ nwa anụmanụ,+ nke ga-abụ nke gị. Ndị bụ́ oké dịịrị Jehova.+ 13  Ị ga-eji atụrụ gbara ịnyịnya ibu ọ bụla e bu ụzọ mụọ, ọ bụrụkwa na ị gaghị agbara ya, ị ga-agbaji ya olu.+ Unu ga-agbarakwa nwa ọ bụla mmadụ bu ụzọ mụọ n’ime ụmụ unu ndị ikom.+ 14  “Ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na nwa gị mesịa jụọ gị,+ sị, ‘Gịnị ka ihe a pụtara?’ ị ga-asị ya, ‘Jehova ji ike aka ya kpọpụta anyị n’Ijipt,+ n’ụlọ ndị ohu.+ 15  O wee ruo na Fero kwesiri olu ike na ya agaghị ahapụ anyị,+ Jehova wee gbuo nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt,+ malite na nwa mmadụ bu ụzọ mụọ ruo na nwa anụmanụ bu ụzọ mụọ.+ Ọ bụ ya mere m ji achụrụ Jehova oké ọ bụla meghere akpa nwa n’àjà,+ m na-agbarakwa onye ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ime ụmụ m ndị ikom.’+ 16  Ọ ga-abụ ihe ịrịba ama n’aka gị, bụrụkwa ihe ị ga-ekegide n’egedege ihu gị,+ n’agbata anya gị abụọ, n’ihi na Jehova ji ike aka ya kpọpụta anyị n’Ijipt.”+ 17  O wee ruo na mgbe Fero hapụrụ ụmụ Izrel, Chineke edughị ha gaa n’ụzọ ala ndị Filistia, ọ bụ ezie na ọ dị nso, n’ihi na Chineke sịrị: “Ndị a nwere ike inwe mwute mgbe ha hụrụ agha wee laghachi n’Ijipt.”+ 18  N’ihi ya, Chineke mere ka ndị Izrel gaa gburugburu n’ụzọ ala ịkpa nke Oké Osimiri Uhie.+ Ma a haziri ụmụ Izrel n’usoro dị ka ndị agha mgbe ha si n’ala Ijipt na-apụ.+ 19  Mozis chịkwaara ọkpụkpụ Josef, n’ihi na o mere ka ụmụ Izrel ṅụọrọ ya iyi, sị: “Chineke aghaghị iche ihu ya n’ebe unu nọ,+ chịrịkwanụ ọkpụkpụ m pụọ n’ebe a.”+ 20  Ha wee si na Sọkọt pụọ wee maa ụlọikwuu n’Itam na nsọtụ ala ịkpa ahụ.+ 21  Jehova ji ogidi ígwé ojii na-ebutere ha ụzọ n’ehihie, jirikwa ogidi ọkụ na-ebutere ha ụzọ n’abalị iji duru ha na-aga,+ iji na-enye ha ìhè ha ga-eji na-aga n’ehihie nakwa n’abalị.+ 22  Ogidi ígwé ojii ahụ adịghị esi n’ihu ụmụ Izrel apụ n’ehihie, ogidi ọkụ ahụ adịghịkwa apụ n’abalị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji