Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọpụpụ 1:1-22

1  Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Izrel ndị ha na Jekọb so bata n’Ijipt; nwoke ọ bụla na ezinụlọ ya batara:+  Ruben,+ Simiọn,+ Livaị+ na Juda,+  Ịsaka,+ Zebulọn+ na Benjamin,+  Dan+ na Naftalaị,+ Gad+ na Asha.+  Mkpụrụ obi niile ndị si n’úkwù Jekọb+ pụta wee dịrị mkpụrụ obi iri asaa, ma Josef nọrịị anọ n’Ijipt.+  E mesịa, Josef nwụrụ,+ tinyere ụmụnne ya niile nakwa ọgbọ ahụ dum.  Ụmụ Izrel wee mụọ ọmụmụ wee malite ịdị nnọọ ọtụtụ; ha nọkwa na-amụba ma na-adịwanye nnọọ ike nke ukwuu, nke mere na ha jupụtara n’ala ahụ.+  Ka oge na-aga, eze ọhụrụ nke na-amaghị Josef malitere ịchị Ijipt.+  O wee gwa ndị ya, sị: “Lee! Ndị Izrel dị ọtụtụ ma dị ike karịa anyị.+ 10  Ngwanụ! Ka anyị jiri akọ meso ha ihe,+ ma ọ́ bụghị ya ha ga-amụba, ọ ga-erukwa na ọ bụrụ na e buso anyị agha, ha ga-esonyere ndị kpọrọ anyị asị, ha ga-ebusokwa anyị agha wee si n’obodo a laa.” 11  Ha wee mee ka ndị isi ọrụ mmanye bụrụ ndị isi ha iji na-emegbu ha n’ibu arọ ha na-ebu;+ ha wee na-ewugasị obodo ịbụrụ Fero ebe nkwakọba ihe, ya bụ, Paịtọm na Ramsis.+ 12  Ma ka ha na-emegbu ha karị otú ahụ ka ha na-amụbakwu ma na-agbasawanye n’ebe niile, nke mere na oké ụjọ jidere ha n’ihi ụmụ Izrel.+ 13  N’ihi ya, ndị Ijipt ji ọchịchị aka ike mee ka ụmụ Izrel gbaa ohu.+ 14  Ha wee na-eme ka ndụ na-elu ha ilu site n’ime ka ha na-arụgbu onwe ha n’ọrụ n’ịkpụ ájá ụrọ+ na brik, nakwa ịrụgbu onwe ha n’ọrụ n’ụdị ọrụ ọ bụla a na-arụ n’ubi,+ ee, n’ụdị ọrụ ọ bụla ha ji ọchịchị aka ike mee ka ha na-arụrụ ha dị ka ndị ohu.+ 15  E mesịa, eze Ijipt gwara ụmụ nwaanyị Hibru na-aghọ́ nwa,+ aha otu n’ime ha bụ Shifra, aha onye nke ọzọ abụrụ Pua, 16  ee, ọ gwara ha, sị: “Mgbe unu na-enyere ụmụ nwaanyị Hibru aka ịmụ nwa, unu ewee hụ ha n’oche ịmụ nwa, ọ bụrụ na ọ bụ nwoke, gbuonụ ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ nwaanyị, hapụnụ ya ndụ.” 17  Otú ọ dị, ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa na-atụ egwu ezi Chineke,+ ha emeghịkwa dị ka eze Ijipt gwara ha,+ kama ha na-ahapụ ụmụ nwoke ndụ.+ 18  Ka oge na-aga, eze Ijipt kpọrọ ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa wee sị ha: “Gịnị mere unu ji mee ihe a, unu wee hapụ ụmụ nwoke ndụ?”+ 19  Ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa wee gwa Fero, sị: “Ọ bụ n’ihi na ụmụ nwaanyị Hibru adịghị ka ụmụ nwaanyị Ijipt. N’ihi na ha gbasiri ike, ha na-amụcha nwa tupu nwaanyị na-aghọ́ nwa abịakwute ha.” 20  Chineke wee meere ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa ihe ọma;+ ụmụ Izrel wee na-abawanye ụba ma na-adịwanye nnọọ ike. 21  O wee ruo na ezi Chineke mesịrị mee ka ụmụ nwaanyị ahụ na-aghọ́ nwa nwee ezinụlọ n’ihi na ha na-atụ egwu ya.+ 22  N’ikpeazụ, Fero nyere ndị ya niile iwu, sị: “Unu ga-atụba nwa nwoke ọ bụla a mụrụ ọhụrụ n’osimiri Naịl, ma unu ga-ahapụ nwa nwaanyị ọ bụla ndụ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji