Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 4:1-49

4  Jehova wee gwa Mozis na Erọn, sị:  “A ga-agụ ụmụ ndị ikom Kohat+ ọnụ n’etiti ụmụ Livaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị,  malite ná ndị gbara afọ iri atọ+ ruo ná ndị gbara afọ iri ise,+ ndị niile na-esonye n’ìgwè na-eje ozi,+ ịrụ ọrụ n’ụlọikwuu nzute.  “Nke a bụ ozi ụmụ Kohat ga na-eje n’ụlọikwuu nzute.+ Ọ bụ ihe kasị nsọ:  Erọn na ụmụ ya ga-abata mgbe ụmụ Izrel na-akwali, ha ga-atọtu ákwà mgbochi+ ahụ ma were ya sachie igbe+ ihe àmà.  Ha ga-ewere ihe mkpuchi e ji akpụkpọ anụ sil+ mee kpuchie ya, werekwa ibé ákwà na-acha anụnụ anụnụ sachie ya ma tinye okporo osisi ya.+  “Ha ga-ewerekwa ákwà na-acha anụnụ anụnụ sachie tebụl+ achịcha a na-eche n’ihu Chineke, ha ga-edokwasịkwa efere+ na iko na ọkwá,+ na ihe e ji awụsa àjà ihe ọṅụṅụ, n’elu ya; achịcha+ ahụ a na-edebe mgbe niile ga na-adị n’elu ya.  Ha ga-ewere ákwà na-acha uhie uhie+ sachie ha, ha ga-ewerekwa ihe mkpuchi e ji akpụkpọ anụ sil+ mee kpuchie ya ma tinye okporo osisi ya.+  Ha ga-ewerekwa ákwà na-acha anụnụ anụnụ sachie ihe ndọba+ oriọna ahụ na oriọna+ ya na ihe ịsọnyụ ọkụ+ ya na ihe ịgụ ọkụ+ ya na ite+ mmanụ ya niile ndị ha ji agbanye mmanụ n’oriọna ahụ mgbe niile. 10  Ha ga-etinye ya na arịa ya niile n’ihe mkpuchi e ji akpụkpọ anụ sil+ mee ma dọkwasị ya n’elu osisi e ji ebu ya. 11  Ha ga-ewere ákwà na-acha anụnụ anụnụ sachie ebe ịchụàjà+ ahụ e ji ọlaedo mee, werekwa ihe mkpuchi e ji akpụkpọ anụ sil+ mee kpuchie ya ma tinye okporo osisi ya.+ 12  Ha ga-achịrịkwa arịa+ niile ha ji eje ozi mgbe niile n’ebe nsọ ahụ, ha ga-achịba ha n’ime ákwà na-acha anụnụ anụnụ ma were ihe mkpuchi e ji akpụkpọ anụ sil+ mee sachie ha, dọkwasịkwa ha n’elu osisi e ji ebu ya. 13  “Ha ga-ekpopụ ntụ nke ya na abụba gwakọtara nke dị n’ebe ịchụàjà+ ahụ ma were ákwà e ji ajị anụ e sijiri odo odo mee sachie ya. 14  N’elu ya ka ha ga-edokwasị arịa ya niile ha na-eji eje ozi metụtara ya mgbe niile, tinyere ihe ịgụ ọkụ ya, ndụdụ ya, shọvel ya na ọkwá ya, arịa niile nke ebe ịchụàjà ahụ;+ ha ga-ewerekwa ihe mkpuchi e ji akpụkpọ anụ sil mee sachie ya ma tinye okporo osisi ya.+ 15  “Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-asachicha ebe nsọ+ ahụ na arịa+ niile nke ebe nsọ ahụ mgbe ụmụ Izrel na-akwali, e mesịa, ụmụ ndị ikom Kohat ga-abata iburu ha,+ ma ha agaghị emetụ+ ebe nsọ ahụ aka ka ha ghara ịnwụ. Ihe ndị a bụ ibu ụmụ Kohat ga na-ebu n’ụlọikwuu nzute.+ 16  “Elieza nwa Erọn onye nchụàjà ga na-elekọta+ mmanụ+ ọkụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ na àjà ọka*+ a na-enye mgbe niile na mmanụ e ji ete mmadụ mmanụ,+ ọ ga na-elekọtakwa ụlọikwuu ahụ dum na ihe niile dị n’ime ya, ya bụ, ebe nsọ ahụ na arịa ya niile.” 17  Jehova wee gwa Mozis na Erọn okwu ọzọ, sị: 18  “Unu ekwela ka e bipụ ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Kohat+ n’etiti ndị Livaị. 19  Kama na-emerenụ ha ihe a ka ha wee dịrị ndụ ghara ịnwụ n’ihi ịbịarute nso n’ebe ihe ndị kasị nsọ dị.+ Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-abata, ha ga-ekenye onye ọ bụla n’ime ha ozi ọ ga na-eje na ihe ọ ga na-ebu. 20  Ha agaghị abata ịhụ ihe dị nsọ, ọbụnadị ịhụpere ya ahụpere, ọ bụrụ na ha hụ ya, ha ga-anwụ.”+ 21  Jehova wee gwa Mozis, sị: 22  “A ga-agụ ụmụ ndị ikom Geshọn+ ọnụ, ee, ha onwe ha, dị ka ụlọ nna ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 23  Ị ga-edeba aha ha n’akwụkwọ+ malite ná ndị gbara afọ iri atọ ruo ná ndị gbara afọ iri ise, ndị niile ga-esonye n’ìgwè na-eje ozi iji na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute. 24  Nke a bụ ọrụ dịịrị ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Geshọn n’ihe metụtara ije ozi na ibu ihe.+ 25  Ha ga na-ebu ákwà ụlọikwuu+ nke ụlọikwuu ahụ na ụlọikwuu nzute,+ ihe mkpuchi+ ya na ihe mkpuchi ahụ e ji akpụkpọ anụ sil mee,+ nke e ji kpuchie ya, na ákwà ngebichi+ ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute, 26  na ákwà ngechi+ ogige ya na ákwà ngebichi+ ọnụ ụzọ ogige ahụ nke gbara ụlọikwuu ahụ na ebe ịchụàjà ya gburugburu, na ụdọ ụlọikwuu ha na arịa niile e ji eje ozi metụtara ha, na ihe niile e ji arụ ọrụ mgbe niile. Otú a ka ha ga-esi na-eje ozi. 27  Ụmụ Geshọn+ ga na-eje ozi ha niile n’ihe metụtara ihe niile ha na-ebu na ozi niile ha na-eje, dị ka Erọn na ụmụ ya ndị ikom+ ga na-enye ha n’iwu, unu ga-ekenye ha ihe niile ha ga na-ebu ka ọ bụrụ ọrụ dịịrị ha. 28  Ọ bụ ya bụ ozi ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Geshọn+ ga na-eje n’ụlọikwuu nzute, ọ bụ Ịtama+ nwa Erọn bụ́ onye nchụàjà ga na-elekọta ọrụ dịịrị ha. 29  “Ma ị ga-edeba aha ụmụ ndị ikom Meraraị+ n’akwụkwọ, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị. 30  Ị ga-edeba aha ha n’akwụkwọ malite ná ndị gbara afọ iri atọ ruo ná ndị gbara afọ iri ise, ndị niile ga-esonye n’ìgwè na-eje ozi iji na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute.+ 31  Nke a bụ ọrụ dịịrị ha, ya bụ, ihe ha ga na-ebu,+ dị ka ozi niile ha ga na-eje n’ụlọikwuu nzute si dị: awara osisi+ nke ụlọikwuu ahụ na osisi ntụhie+ ya na ogidi+ ya na ntọala ya ndị nwere oghere,+ 32  na ogidi+ niile nke ogige ya gbaa gburugburu na ntọala ha ndị nwere oghere+ na mkpọ́+ ụlọikwuu ha na ụdọ ụlọikwuu ha na ngwongwo ha niile na ozi niile metụtara ha. N’aha n’aha ka unu ga-ekenye ha ngwongwo ha ga na-ebu, ka ọ bụrụ ihe ha ga na-ebu.+ 33  Ọ bụ ya bụ ozi ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Meraraị+ ga na-eje, dị ka ozi niile ha ga na-eje n’ụlọikwuu nzute si dị, nke Ịtama nwa Erọn onye nchụàjà+ ga na-elekọta.” 34  Mozis na Erọn na ndị isi+ nzukọ ahụ wee deba aha ụmụ Kohat+ n’akwụkwọ, n’ezinụlọ n’ezịnụlọ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, 35  malite ná ndị gbara afọ iri atọ+ ruo ná ndị gbara afọ iri ise,+ ndị niile sonyere n’ìgwè na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute.+ 36  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, wee dịrị puku mmadụ abụọ, narị asaa na iri ise.+ 37  Ọ bụ ndị a bụ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ+ n’ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Kohat, ya bụ, ndị niile na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute, ndị Mozis na Erọn debara aha ha n’akwụkwọ dị ka Jehova nyere n’iwu site n’ọnụ Mozis. 38  Ma ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’etiti ụmụ Geshọn,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, 39  malite ná ndị gbara afọ iri atọ ruo ná ndị gbara afọ iri ise, ndị niile sonyere n’ìgwè na-eje ozi ije ozi n’ụlọikwuu nzute,+ 40  ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, wee dịrị puku abụọ, narị isii na iri atọ.+ 41  Ọ bụ ndị a bụ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Geshọn, ya bụ, ndị niile na-eje ozi n’ụlọikwuu nzute, ndị Mozis na Erọn debara aha ha n’akwụkwọ dị ka Jehova+ nyere n’iwu. 42  Ma ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Meraraị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, 43  malite ná ndị gbara afọ iri atọ ruo ná ndị gbara afọ iri ise, ndị niile na-esonye n’ìgwè na-eje ozi ije ozi n’ụlọikwuu nzute,+ 44  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, wee dịrị puku mmadụ atọ na narị abụọ.+ 45  Ọ bụ ndị a bụ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ dị iche iche nke ụmụ Meraraị, ndị Mozis na Erọn debara aha ha n’akwụkwọ dị ka Jehova nyere n’iwu site n’ọnụ Mozis.+ 46  Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ, bụ́ ndị Mozis na Erọn na ndị isi Izrel debara aha ha n’akwụkwọ dị ka ndị Livaị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, 47  malite ná ndị gbara afọ iri atọ ruo ná ndị gbara afọ iri ise,+ ndị niile na-abịa ịrụ ọrụ siri ike na ọrụ ibu ihe n’ụlọikwuu nzute,+ 48  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha dị puku mmadụ asatọ, narị ise na iri asatọ.+ 49  E debara aha ha n’akwụkwọ site n’aka Mozis dị ka Jehova nyere n’iwu, onye nke ọ bụla dị ka ozi ọ na-eje na ibu ọ na-ebu si dị; e debara aha ha n’akwụkwọ dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọg 4:16*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.