Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 34:1-29

34  Jehova wee gwa Mozis okwu ọzọ, sị:  “Nye ụmụ Izrel iwu, sị ha, ‘Unu na-abanye n’ala Kenan.+ Ọ bụ ala a, bụ́ ala Kenan, ka unu ga-eketa+ dị ka ókè ya niile si dị.+  “‘Akụkụ ndịda unu ga-amalite n’ala ịkpa Zin n’akụkụ Idọm,+ ókè ndịda unu ga-amalite na nsọtụ Oké Osimiri Nnu+ n’ebe ọwụwa anyanwụ.  Ókè unu ga-esi na ndịda ụzọ e si agbago Akrabim+ tụgharịa wee gafere ruo Zin, ọ ga-ejedebe na ndịda Kedesh-bania;+ ọ ga-eru Heza-ada,+ gaferekwa ruo Azmọn.  Ókè ahụ ga-atụgharị n’Azmọn gawa ruo ndagwurugwu Ijipt,+ ọ ga-ejedebe n’Oké Osimiri.+  “‘Osimiri Ukwu na ikpere mmiri ya ga-abụrụ unu ókè+ n’ebe ọdịda anyanwụ. Nke a ga-abụ ókè unu n’ebe ọdịda anyanwụ.  “‘Nke a ga-abụ ókè unu n’ebe ugwu: Unu ga-amalite n’Osimiri Ukwu kpaa ókè ya ruo n’Ugwu Họọ.+  Unu ga-akpa ókè ya malite n’Ugwu Họọ ruo n’ebe e si abanye Hemat,+ ókè ya ga-ejedebe na Zidad.+  Ókè ya ga-eru Zifrọn, ọ ga-ejedebekwa na Heza-inan.+ Nke a ga-abụ ókè unu n’ebe ugwu. 10  “‘Unu ga-akpa ókè unu nke ebe ọwụwa anyanwụ malite na Heza-inan ruo Shifam. 11  Ókè ahụ ga-amalite na Shifam wee gbadaa ruo Ribla nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Eyin, ókè ahụ ga-agbadakwa ruo ná mkpọda nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ oké osimiri Kineret.+ 12  Ókè ahụ ga-agbada ruo Jọdan, ọ ga-ejedebekwa n’Oké Osimiri Nnu.+ Nke a ga-abụ ala+ unu dị ka ókè ya niile si dị gbaa gburugburu.’” 13  Mozis wee nye ụmụ Izrel iwu, sị: “Ọ bụ ala a ka unu ga-eke n’etiti onwe unu site n’ife nza+ ka ọ bụrụ nke unu, dị nnọọ ka Jehova nyere n’iwu ka e nye ebo itoolu na ọkara.+ 14  N’ihi na ebo ụmụ Ruben, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, na ebo ụmụ Gad, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, enwetala ihe nketa ha, ọkara ebo Manase kwa enwetala nke ha.+ 15  Ebo abụọ na ọkara ahụ enwetala ihe nketa ha n’ógbè Jọdan n’akụkụ Jeriko, n’ebe ọwụwa anyanwụ.”+ 16  Jehova wee gwa Mozis okwu ọzọ, sị: 17  “Ndị a bụ aha ndị ga-ekere unu ala ahụ ka ọ bụrụ nke unu, Elieza+ onye nchụàjà na Jọshụa nwa Nọn.+ 18  Unu ga-akpọrọ otu onyeisi n’ebo nke ọ bụla maka ike ala ahụ ka ọ bụrụ nke unu.+ 19  Ndị a bụ aha ndị ikom ahụ: Keleb nwa Jefọne,+ onye si n’ebo Juda;+ 20  Shemuel nwa Amaịhọd, onye si n’ebo Simiọn;+ 21  Elaịdad nwa Kislọn, onye si n’ebo Benjamin;+ 22  onyeisi bụ́ Bọkaị nwa Jọglaị, onye si n’ebo ụmụ Dan;+ 23  onyeisi bụ́ Haniel nwa Ịfọd, onye ụmụ Josef mụrụ,+ onye si n’ebo ụmụ Manase;+ 24  onyeisi bụ́ Kemuel nwa Shiftan, onye si n’ebo ụmụ Ifrem;+ 25  onyeisi bụ́ Elizefan nwa Panak, onye si n’ebo ụmụ Zebulọn;+ 26  onyeisi bụ́ Paltiel nwa Azan, onye si n’ebo ụmụ Ịsaka;+ 27  onyeisi bụ́ Ahaịhọd nwa Shilomaị, onye si n’ebo ụmụ Asha;+ 28  onyeisi bụ́ Pedahel nwa Amaịhọd, onye si n’ebo ụmụ Naftalaị.”+ 29  Ọ bụ ndị a ka Jehova nyere iwu ka ha mee ka ụmụ Izrel nweta ala n’ala Kenan.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji