Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 33:1-56

33  Otú a ka ụmụ Izrel ndị si n’ala Ijipt+ pụta n’ụsụụ n’ụsụụ+ si mee njem ha dị ka Mozis na Erọn si duo ha.+  Mozis wee na-edekọ ebe dị iche iche ha si kwalie, site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ, dị ka Jehova nyere n’iwu; otú a ka ha si mee njem ha, site n’otu ebe ha si kwalie ruo n’ebe ọzọ:+  Ha wee si na Ramesis+ kwalie n’ọnwa nke mbụ, n’abalị iri na ise n’ọnwa nke mbụ.+ Kpọmkwem n’ụbọchị na-esote ụbọchị ememme ngabiga,+ ụmụ Izrel weliri aka ha elu pụọ n’ihu ndị Ijipt dum.+  Ka nke a na-eme, ndị Ijipt nọ na-eli ndị Jehova gburu n’etiti ha, ya bụ, ụmụ niile e bu ụzọ mụọ;+ Jehova mekwara ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ chi ha dị iche iche.+  Ụmụ Izrel wee si na Ramesis+ kwalie maa ụlọikwuu na Sọkọt.+  Ha wee si na Sọkọt kwalie wee maa ụlọikwuu n’Itam,+ nke dị na nsọtụ ala ịkpa ahụ.  Ha wee si n’Itam kwalie ma tụgharịa chee ihu na Paịhahaịrọt,+ nke chere Bel-zifọn+ ihu; ha wee maa ụlọikwuu n’ihu Migdọl.+  E mesịa, ha si na Paịhahaịrọt kwalie wee si n’etiti oké osimiri+ gafee banye n’ala ịkpa+ ma gaa njem ruo ụbọchị atọ n’ala ịkpa Itam,+ ha wee maa ụlọikwuu na Mera.+  Ha wee si na Mera kwalie wee bịarute n’Ilim.+ N’Ilim, e nwere isi iyi iri na abụọ na nkwụ iri asaa. Ha wee maa ụlọikwuu n’ebe ahụ. 10  Ha wee si n’Ilim kwalie maa ụlọikwuu n’akụkụ Oké Osimiri Uhie. 11  E mesịa, ha si n’Oké Osimiri Uhie kwalie wee maa ụlọikwuu n’ala ịkpa Sin.+ 12  Ha wee si n’ala ịkpa Sin kwalie maa ụlọikwuu na Dọfka. 13  E mesịa, ha si na Dọfka kwalie wee maa ụlọikwuu n’Elọsh. 14  Ha wee si n’Elọsh kwalie maa ụlọikwuu na Refidim.+ Ma ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ n’ebe ahụ. 15  E mesịa, ha si na Refidim kwalie wee maa ụlọikwuu n’ala ịkpa Saịnaị.+ 16  E mesịa, ha si n’ala ịkpa Saịnaị kwalie wee maa ụlọikwuu na Kibrọt-hateeva.+ 17  Ha wee si na Kibrọt-hateeva kwalie maa ụlọikwuu na Hazirọt.+ 18  E mesịa, ha si na Hazirọt kwalie wee maa ụlọikwuu na Ritma. 19  Ha wee si na Ritma kwalie maa ụlọikwuu na Rimọn-pirez. 20  Ha wee si na Rimọn-pirez kwalie maa ụlọikwuu na Libna. 21  E mesịa, ha si na Libna kwalie wee maa ụlọikwuu na Riza. 22  Ha wee si na Riza kwalie maa ụlọikwuu na Kiheleta. 23  Ha wee si na Kiheleta kwalie maa ụlọikwuu n’Ugwu Shifa. 24  E mesịa, ha si n’Ugwu Shifa kwalie wee maa ụlọikwuu+ na Hareda. 25  Ha wee si na Hareda kwalie maa ụlọikwuu na Makhilọt. 26  Ha wee si na Makhilọt kwalie+ maa ụlọikwuu na Tehat. 27  E mesịa, ha si na Tehat kwalie wee maa ụlọikwuu na Tira. 28  Ha wee si na Tira kwalie maa ụlọikwuu na Mitka. 29  E mesịa, ha si na Mitka kwalie wee maa ụlọikwuu na Hashmona. 30  Ha wee si na Hashmona kwalie maa ụlọikwuu na Mosirọt. 31  Ha wee si na Mosirọt kwalie maa ụlọikwuu na Bene-jeekan.+ 32  E mesịa, ha si na Bene-jeekan kwalie wee maa ụlọikwuu na Họọ-hagidgad. 33  Ha wee si na Họọ-hagidgad kwalie maa ụlọikwuu na Jọtbata.+ 34  E mesịa, ha si na Jọtbata kwalie wee maa ụlọikwuu n’Abrona. 35  Ha wee si n’Abrona kwalie maa ụlọikwuu n’Iziọn-giba.+ 36  E mesịa, ha si n’Iziọn-giba kwalie wee maa ụlọikwuu n’ala ịkpa Zin,+ ya bụ, Kedesh. 37  E mesịa, ha si na Kedesh kwalie wee maa ụlọikwuu n’Ugwu Họọ,+ n’ókè nke ala Idọm. 38  Erọn onye nchụàjà wee gbagoo n’Ugwu Họọ dị ka Jehova nyere ya n’iwu, o wee nwụọ n’ebe ahụ n’afọ nke iri anọ mgbe ụmụ Izrel pụtasịrị n’ala Ijipt, n’ọnwa nke ise, n’abalị mbụ n’ọnwa ahụ.+ 39  Erọn gbara otu narị afọ na iri abụọ na atọ mgbe ọ nwụrụ n’Ugwu Họọ. 40  Onye Kenan, bụ́ eze Erad,+ wee nụ na ụmụ Izrel abịala, mgbe o bi na Negeb,+ n’ala Kenan. 41  Ka oge na-aga, ha si n’Ugwu Họọ+ kwalie wee maa ụlọikwuu na Zalmona. 42  E mesịa, ha si na Zalmona kwalie wee maa ụlọikwuu na Punọn. 43  Ha wee si na Punọn kwalie maa ụlọikwuu n’Obọt.+ 44  Ha wee si n’Obọt kwalie maa ụlọikwuu n’Aịye-abarim n’ókè Moab.+ 45  E mesịa, ha si n’Aịyim kwalie wee maa ụlọikwuu na Daịbọn-gad.+ 46  E mesịa, ha si na Daịbọn-gad kwalie wee maa ụlọikwuu n’Almọn-diblateyim. 47  Ha wee si na n’Almọn-diblateyim+ kwalie maa ụlọikwuu n’ugwu Abarim+ n’ihu Nibo.+ 48  N’ikpeazụ, ha si n’ugwu Abarim kwalie wee maa ụlọikwuu na mbara ọzara Moab+ nke dị n’akụkụ Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko. 49  Ha wee na-ebi n’ụlọikwuu n’akụkụ Jọdan malite na Bet-jeshimọt+ ruo n’Ebel-shitim+ nke dị na mbara ọzara Moab. 50  Jehova wee gwa Mozis okwu na mbara ọzara Moab nke dị n’akụkụ Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko,+ sị: 51  “Gwa ụmụ Izrel okwu, sị ha, ‘Unu ga-agafe Jọdan wee banye n’ala Kenan.+ 52  Chụpụnụ ndị niile bi n’ala ahụ n’ihu unu ma bibie ihe oyiyi niile ha ji nkume mee,+ bibiekwanụ ihe oyiyi niile ha ji ígwè wụọ,+ laakwanụ ebe nsọ ha niile dị elu n’iyi.+ 53  Unu ga-enweta ala ahụ ma biri n’ime ya, n’ihi na ọ bụ unu ka m ga-enye ala ahụ ka ọ bụrụ nke unu.+ 54  Keenụ ala ahụ n’etiti onwe unu site n’ife nza+ ka ọ bụrụ nke unu n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ Unu ga-enye ezinụlọ dị ọtụtụ ihe nketa dị ukwuu, unu ga-enyekwa ezinụlọ dị ole na ole ihe nketa dị obere.+ Ebe ọ bụla nza mara, ebe ahụ ga-aghọ nke ya.+ Ọ bụ n’ebo n’ebo ndị nna unu ka unu ga-enweta ala.+ 55  “‘Ma ọ bụrụ na unu achụpụghị ndị bi n’ala ahụ n’ihu unu,+ ndị unu hapụrụ n’ime ha ga-aghọ ogwu n’anya unu, ghọọkwa ogwu n’akụkụ abụọ unu, ha ga na-awakpo unu n’ala unu ga-ebi.+ 56  Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka m bu n’obi ime ha, otú ahụ ka m ga-eme unu.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji