Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 30:1-16

30  Mozis wee gwa ndị isi+ nke ebo ụmụ Izrel, sị: “Nke a bụ ihe Jehova nyere n’iwu:  Ọ bụrụ na mmadụ ekwe Jehova nkwa+ ma ọ bụ ṅụọ iyi+ na o nwere ihe mkpụrụ obi ya ga na-asọ nsọ,+ ya emebila ihe o kwuru.+ Dị ka ihe niile si ya n’ọnụ pụta si dị, otú ahụ ka ọ ga-eme.+  “Ọ bụrụkwa na nwaanyị ekwe Jehova nkwa+ ma ọ bụ ṅụọ iyi n’ụlọ nna ya mgbe ọ ka bụ agbọghọbịa na o nwere ihe ya ga na-asọ nsọ,  nna ya ewee nụ nkwa o kwere ma ọ bụ iyi ọ ṅụrụ na o nwere ihe mkpụrụ obi ya ga na-asọ nsọ, nna ya ewee gba ya nkịtị, iyi niile ọ ṅụrụ agaghị agbanwe, iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na o nwere ihe mkpụrụ obi ya ga na-asọ nsọ+ agaghị agbanwe.  Ma ọ bụrụ na nna ya gbochiri ya n’ụbọchị ọ nụrụ nkwa niile o kwere ma ọ bụ iyi ọ ṅụrụ na o nwere ihe mkpụrụ obi ya ga na-asọ nsọ, ọ ga-agbanwe, ma Jehova ga-agbaghara nwaanyị ahụ, n’ihi na nna ya gbochiri ya ime ya.+  “Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ nọ na di mgbe o kwere nkwa,+ ma ọ bụ, egbugbere ọnụ ya ekwe nkwa n’echeghị echiche na o nwere ihe mkpụrụ obi ya ga-eme,  di ya ewee nụ ya ma gba ya nkịtị n’ụbọchị ọ nụrụ ya, nkwa nwaanyị ahụ kwere agaghị agbanwe, ma ọ bụ, iyi ọ ṅụrụ na o nwere ihe mkpụrụ obi ya ga na-asọ nsọ agaghị agbanwe.+  Ma ọ bụrụ na di ya gbochiri ya+ n’ụbọchị ọ nụrụ ya, ọ kagbuola nkwa nwaanyị ahụ kwere ma ọ bụ nkwa nke si ya n’egbugbere ọnụ pụta nke o kwere n’echeghị echiche na o nwere ihe mkpụrụ obi ya ga-eme, Jehova ga-agbaghara nwaanyị ahụ.+  “Ma a bịa ná nkwa nwaanyị di ya nwụrụ ma ọ bụ nwaanyị a gbara alụkwaghịm kwere, ihe ọ bụla o kwuru na mkpụrụ obi ya ga-eme agaghị agbanwe. 10  “Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ bụ n’ụlọ di ya ka ọ nọ kwe nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi na o nwere ihe mkpụrụ obi ya ga na-asọ nsọ,+ 11  di ya anụ ya ma gba ya nkịtị, o gbochighị ya; nkwa niile nwaanyị ahụ kwere agaghị agbanwe, ma ọ bụ, iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na o nwere ihe mkpụrụ obi ya ga na-asọ nsọ agaghị agbanwe. 12  Ma ọ bụrụ na di ya kagburu ha kpamkpam n’ụbọchị ọ nụrụ ihe ọ bụla egbugbere ọnụ ya kwere ná nkwa ma ọ bụ ihe ọ ṅụrụ n’iyi na mkpụrụ obi ya ga na-asọ nsọ, ha ga-agbanwe.+ Di ya akagbuola ha, Jehova ga-agbaghara nwaanyị ahụ.+ 13  Nkwa ọ bụla o kwere ma ọ bụ iyi ọ bụla ọ ṅụrụ na ọ dị ihe ya ga na-asọ nsọ iji mekpaa mkpụrụ obi ya ahụ́,+ di ya ga-eme ka ọ dị irè ma ọ̀ bụ di ya ga-akagbu ya. 14  Ma ọ bụrụ na di ya agba ya nnọọ nkịtị site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị, nwoke ahụ emewo ka nkwa ya niile ma ọ bụ iyi niile ọ ṅụrụ ịsọ ihe nsọ dịrị irè.+ O mewo ka ha dị irè n’ihi na ọ gbara ya nkịtị n’ụbọchị ọ nụrụ ha. 15  Ọ bụrụkwa na di ya akagbuo ha kpamkpam mgbe ọ nụsịrị ha, ọ ga-eburu njehie nwaanyị ahụ.+ 16  “Ọ bụ ụkpụrụ ndị a ka Jehova nyere Mozis n’iwu, dị ka ihe ga-adị n’etiti di na nwunye,+ n’etiti nna na nwa ya nwaanyị mgbe ọ bụ nwa agbọghọ nke bi n’ụlọ nna ya.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji