Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 28:1-31

28  Jehova wee gwa Mozis okwu ọzọ, sị:  “Nye ụmụ Izrel iwu, sị ha, ‘Unu ga-ahụ na unu na-ewetara m onyinye m, achịcha m,+ maka àjà a na-esure n’ọkụ ka ọ bụụrụ m ihe na-esi ísì ụtọ,+ n’oge ha a kara aka.’+  “Sịkwa ha, ‘Nke a bụ àjà a na-esure n’ọkụ nke unu ga na-achụrụ Jehova: ụmụ ebule abụọ ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, kwa ụbọchị, ka ha bụrụ àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile.+  Ị ga-achụ otu ebule n’àjà n’ụtụtụ, chụọkwa ebule nke ọzọ n’àjà ná mgbede,+  tinyere otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa+ ntụ ọka* e gwere nke ọma ka ọ bụrụ àjà ọka+ nke a gwara otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin mmanụ a sụpụtara ná mkpụrụ oliv;+  àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile,+ bụ́ nke a chụrụ n’Ugwu Saịnaị ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ, bụ́ àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ,+  ya na àjà ihe ọṅụṅụ ya,+ a ga-eji otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin chụọ otu nwa ebule n’àjà.+ Wụpụrụ Jehova àjà ihe ọṅụṅụ nke bụ́ mmanya na-egbu egbu+ n’ebe nsọ ya.  Ị ga-achụ nwa ebule nke ọzọ n’àjà ná mgbede. Ị ga-achụ ya n’àjà, ya na àjà ọka nke dị ka nke a na-achụ n’àjà n’ụtụtụ, tinyere àjà ihe ọṅụṅụ ya nke dị ka nke ahụ, ka ọ bụrụ àjà a na-esure n’ọkụ, nke na-esi ísì ụtọ nye Jehova.+  “‘Otú ọ dị, n’ụbọchị izu ike,+ ihe a ga-eji chụọ àjà bụ ụmụ ebule abụọ ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, tinyere ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma, ka ọ bụrụ àjà ọka a gwara mmanụ, ya na àjà ihe ọṅụṅụ ya, 10  ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ ụbọchị izu ike nke a na-achụ kwa ụbọchị izu ike, ya na àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile,+ tinyere àjà ihe ọṅụṅụ ya.+ 11  “‘Ná mbido ọnwa unu ọ bụla, unu ga-eji ụmụ oké ehi abụọ na otu ebule, ụmụ ebule asaa ahụ́ dị mma, ndị gbara otu afọ otu afọ, chụọrọ Jehova àjà nsure ọkụ,+ 12  tinyere ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma, ka ọ bụrụ àjà ọka+ a gwara mmanụ maka nke ọ bụla n’ime oké ehi ndị ahụ nakwa ụzọ abụọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma, ka ọ bụrụ àjà ọka a gwara mmanụ maka otu ebule,+ 13  nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma, ka ọ bụrụ àjà ọka a gwara mmanụ maka nwa ebule nke ọ bụla, ka ọ bụrụ àjà nsure ọkụ, nke na-esi ísì ụtọ,+ àjà a na-esurere Jehova n’ọkụ. 14  A ga-eji ọkara otu+ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin mmanya chụọ otu oké ehi n’àjà, jiri otu ụzọ n’ụzọ atọ+ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin chụọ ebule ahụ n’àjà ma jiri otu ụzọ n’ụzọ anọ+ nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ hin chụọ otu nwa ebule n’àjà, dị ka àjà ihe ọṅụṅụ ha. Nke a bụ àjà nsure ọkụ a ga na-achụ n’ọnwa n’ọnwa, n’ọnwa niile dị n’afọ.+ 15  A ga na-achụkwa otu nwa ewu+ n’àjà ka ọ bụrụ àjà mmehie a chụụrụ Jehova, ma e wezụga àjà nsure ọkụ ahụ a na-achụ mgbe niile, ya na àjà ihe ọṅụṅụ ya.+ 16  “‘A ga na-eme ememme ngabiga+ Jehova n’ọnwa mbụ, n’abalị iri na anọ n’ọnwa ahụ. 17  A ga-eme ememme n’abalị iri na ise n’ọnwa ahụ. A ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa.+ 18  A ga-enwe mgbakọ+ dị nsọ n’ụbọchị nke mbụ. Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.+ 19  Unu ga-eweta ụmụ oké ehi abụọ na otu ebule na ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ+ ka ha bụrụ àjà a na-esure n’ọkụ, bụ́ àjà nsure ọkụ+ a chụụrụ Jehova. Ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma.+ 20  Dị ka àjà ọka+ ha bụ́ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, unu ga-achụ ụzọ atọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa n’àjà maka otu oké ehi, chụọkwa ụzọ abụọ n’ụzọ iri+ n’àjà maka ebule ahụ. 21  Ị ga-achụ otu ụzọ n’ụzọ iri n’àjà+ maka nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ; 22  tinyere otu ewu maka àjà mmehie iji kpuchiere unu mmehie.+ 23  Unu ga-achụ ihe ndị a n’àjà, ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ n’ụtụtụ, nke bụ́ maka àjà nsure ọkụ+ ahụ a na-achụ mgbe niile.+ 24  Ihe ndị a ka unu ga na-achụ n’àjà kwa ụbọchị ruo ụbọchị asaa dị ka ihe oriri,+ bụ́ àjà a na-esure n’ọkụ, nke na-esi ísì ụtọ nye Jehova.+ A ga-achụ ya na àjà nsure ọkụ ahụ a na-achụ mgbe niile, tinyere àjà ihe ọṅụṅụ ya. 25  N’ụbọchị nke asaa, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ.+ Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.+ 26  “‘N’ụbọchị mkpụrụ mbụ kara aka,+ mgbe unu na-ewetara Jehova àjà ọka ọhụrụ, n’oge ememme izu+ unu, unu ga-enwe mgbakọ dị nsọ. Unu arụla ụdị ọrụ ọ bụla siri ike.+ 27  Unu ga-eweta ụmụ oké ehi abụọ, otu ebule, ụmụ ebule asaa ndị gbara otu afọ otu afọ ka ha bụrụ àjà nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nye Jehova;+ 28  nakwa àjà ọka ha bụ́ ntụ ọka e gwere nke ọma, nke a gwara mmanụ, ụzọ atọ n’ụzọ iri ga-abụ maka otu oké ehi, ụzọ abụọ n’ụzọ iri+ ga-abụ maka otu ebule, 29  otu ụzọ n’ụzọ iri+ ga-abụ maka nke ọ bụla n’ime ụmụ ebule asaa ahụ; 30  otu nwa ewu maka iji kpuchiere unu mmehie.+ 31  Unu ga-achụ ha n’àjà,+ ma e wezụga àjà nsure ọkụ a na-achụ mgbe niile, ya na àjà ọka ya. Ha ga-abụ ndị ahụ́ dị mma,+ ha na àjà ihe ọṅụṅụ ha.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọg 28:5*  Ọka a na-ekwu okwu ya ebe a bụ ụdị dị ka ọka wit na ọka bali.