Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 26:1-65

26  O wee ruo mgbe ihe otiti+ ahụ gasịrị na Jehova gwara Mozis na Elieza nwa Erọn onye nchụàjà, sị:  “Gụọnụ nzukọ ụmụ Izrel dum ọnụ malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, dị ka ụlọ nna ha si dị, bụ́ ndị niile toruru ịga agha n’Izrel.”+  Mozis na Elieza+ onye nchụàjà wee gwa ha okwu na mbara ọzara Moab+ nke dị n’akụkụ Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko,+ sị:  “Gụọnụ ha ọnụ malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu.”+ Ụmụ Izrel ndị si n’ala Ijipt pụta bụ ndị a:  Ruben, ọkpara Izrel;+ ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ruben: Ụmụ Henọk+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Henọk; ụmụ Palu+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Palu;  ụmụ Hezrọn+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Hezrọn; ụmụ Kamaị+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Kamaị.  Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ruben. N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku iri anọ na atọ, narị asaa na iri atọ.+  Nwa Palu bụ Elayab.  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Elayab: Nemuel na Detan na Abaịram. Detan+ na Abaịram+ a bụ ndị a na-akpọ òkù ịbịa nzukọ, bụ́ ndị nọ n’òtù Kora+ wee lụso Mozis na Erọn ọgụ, mgbe ha lụsoro Jehova ọgụ. 10  Ala wee meghee ọnụ ya loo ha.+ Ma Kora nwụrụ mgbe ndị òtù ya nwụrụ, mgbe ọkụ regburu narị ndị ikom abụọ na iri ise.+ Ha wee bụrụ ihe ịdọ aka ná ntị.+ 11  Otú ọ dị, ụmụ Kora anwụghị.+ 12  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Simiọn+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Nemuel+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Nemuel; ụmụ Jemin+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Jemin; ụmụ Jekin+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Jekin; 13  ụmụ Zira bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Zira; ụmụ Sheọl+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Sheọl. 14  Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Simiọn: puku mmadụ iri abụọ na abụọ na narị abụọ.+ 15  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Gad+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Zifọn bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Zifọn; ụmụ Hagaị bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Hagaị; ụmụ Shunaị bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Shunaị; 16  ụmụ Ọznaị bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Ọznaị; ụmụ Iraị bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Iraị; 17  ụmụ Arọd bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Arọd; ụmụ Arilaị+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Arilaị. 18  Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Gad. N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku mmadụ iri anọ na narị ise.+ 19  Ụmụ ndị ikom Juda+ bụ Ea+ na Onan.+ Otú ọ dị, Ea na Onan nwụrụ n’ala Kenan.+ 20  Ndị a wee bụrụ ụmụ ndị ikom Juda, n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Shila+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Shila; ụmụ Pirez+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Pirez; ụmụ Zira+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Zira. 21  Ndị a wee bụrụ ndị ikom Pirez: Ụmụ Hezrọn+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Hezrọn; ụmụ Hemọl+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Hemọl. 22  Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Juda.+ N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku mmadụ iri asaa na isii na narị ise.+ 23  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ịsaka,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Tola+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Tola; ụmụ Puva bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Puva; 24  ụmụ Jeshọb bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Jeshọb; ụmụ Shimrọn+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Shimrọn. 25  Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ịsaka. N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku mmadụ iri isii na anọ na narị atọ.+ 26  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Zebulọn,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Sired bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Sired; ụmụ Ilọn bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Ilọn; ụmụ Jaliel+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Jaliel. 27  Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Zebulọn. N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku mmadụ iri isii na narị ise.+ 28  Ụmụ ndị ikom Josef,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, bụ Manase na Ifrem.+ 29  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Manase:+ Ụmụ Mekia+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Mekia. Mekia wee mụọ Gilied.+ Ọ bụ Gilied mụrụ ndị ezinụlọ ụmụ Gilied. 30  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Gilied: Ụmụ lza+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ lza; ụmụ Hilek bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Hilek; 31  ụmụ Asriel bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Asriel; ụmụ Shikem bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Shikem; 32  ụmụ Shemaịda+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Shemaịda; ụmụ Hifa+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Hifa. 33  Ma Zelofehad nwa Hifa amụtaghị ụmụ nwoke, kama ọ mụrụ ụmụ nwaanyị,+ ụmụ Zelofehad bụ Mala na Noa na Họgla na Milka na Teza.+ 34  Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Manase. N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku iri ise na abụọ na narị asaa.+ 35  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Ifrem,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Shutela+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Shutela; ụmụ Bika bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Bika; ụmụ Tehan+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Tehan. 36  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Shutela: Ụmụ Iran bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Iran. 37  Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Ifrem.+ N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku mmadụ iri atọ na abụọ na narị ise. Ọ bụ ndị a bụ ụmụ ndị ikom Josef, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.+ 38  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Benjamin,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Bila+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Bila; ụmụ Ashbel+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Ashbel; ụmụ Ahaịram bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Ahaịram; 39  ụmụ Shefufam bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Shufam; ụmụ Hufam+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Hufam. 40  Ụmụ ndị ikom Bila wee bụrụ Ad na Neaman:+ Ụmụ Ad bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Ad; ụmụ Neaman bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Neaman. 41  Ọ bụ ndị a bụ ụmụ ndị ikom Benjamin,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku iri anọ na ise na narị isii.+ 42  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Dan,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Shuham bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Shuham. Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Dan,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. 43  Ezinụlọ niile ndị si n’agbụrụ Shuham, bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ, dị puku iri isii na anọ na narị anọ.+ 44  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Asha,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Imna+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Imna; ụmụ Ishvaị+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Ishvaị; ụmụ Beraya bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Beraya; 45  ndị a bụ ụmụ ndị ikom Beraya: Ụmụ Hiba bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Hiba; ụmụ Malkiel+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Malkiel. 46  Aha nwa nwaanyị Asha bụ Sira.+ 47  Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ụmụ Asha.+ N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku mmadụ iri ise na atọ na narị anọ.+ 48  Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Naftalaị,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Jaziel+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Jaziel; ụmụ Gunaị+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Gunaị; 49  ụmụ Jiza+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Jiza; ụmụ Shilem+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Shilem. 50  Ọ bụ ha bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Naftalaị,+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ. N’ime ha, ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị puku iri anọ na ise na narị anọ.+ 51  Ndị a bụ ụmụ Izrel e debara aha ha n’akwụkwọ: narị puku mmadụ isii na otu, narị mmadụ asaa na iri atọ.+ 52  E mesịa, Jehova gwara Mozis, sị: 53  “Ọ bụ ndị a ka ị ga-ekere ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha dị ka ole aha ha dị.+ 54  Ndị dị ọtụtụ ka ị ga-ekenye ihe nketa dị ukwuu, ndị dị ole na ole ka ị ga-ekenye ihe nketa dị nta.+ A ga-ekenye ndị nke ọ bụla ihe nketa ha dabere n’ole ndị e debara aha ha n’akwụkwọ dị. 55  Ọ bụ naanị site n’ife nza+ ka a ga-eke ala ahụ. Ha ga-enweta ihe nketa dị ka aha ebo ndị nna ha si dị. 56  Ihe e fetara na nza ka a ga-eji kee ihe nketa n’etiti ndị dị ọtụtụ na ndị dị ole na ole.” 57  Ndị a bụ ndị Livaị+ e debara aha ha n’akwụkwọ, n’ezinụlọ n’ezinụlọ: Ụmụ Geshọn+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Geshọn; ụmụ Kohat+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Kohat; ụmụ Meraraị+ bụ́ ndị ezinụlọ ụmụ Meraraị. 58  Ndị a bụ ezinụlọ ndị si n’ebo Livaị: ezinụlọ ụmụ Libnaị,+ ezinụlọ ụmụ Hibrọn,+ ezinụlọ ụmụ Malaị,+ ezinụlọ ụmụ Mushaị,+ ezinụlọ ụmụ Kora.+ Kohat+ wee mụọ Amram.+ 59  Aha nwunye Amram bụ Jokebed,+ ada Livaị, onye nwunye ya mụụrụ Livaị n’Ijipt. Ka oge na-aga, ọ mụụrụ Amram Erọn na Mozis nakwa Miriam nwanne ha nwaanyị.+ 60  E wee mụọrọ Erọn Nedab na Abaịhu,+ Elieza na Ịtama.+ 61  Ma Nedab na Abaịhu nwụrụ n’ihi na ha surere ihe nsure ọkụ iwu na-akwadoghị n’ihu Jehova.+ 62  Ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ha wee dịrị puku mmadụ iri abụọ na atọ, ndị ikom niile malite ná ndị dị otu ọnwa gbagowe.+ N’ihi na e debaghị aha ha n’akwụkwọ mgbe e debara aha ụmụ Izrel,+ n’ihi na ọ dịghị ihe nketa a ga-enye ha n’etiti ụmụ Izrel.+ 63  Ọ bụ ndị a ka Mozis na Elieza onye nchụàjà debara aha ha n’akwụkwọ mgbe ha debara aha ụmụ Izrel n’akwụkwọ na mbara ọzara Moab nke dị n’akụkụ Jọdan, n’ebe dị nso na Jeriko.+ 64  Ma ọ dịghị nwoke ọ bụla n’ime ndị ahụ Mozis na Erọn onye nchụàjà debara aha ha n’akwụkwọ mgbe ha debara aha ụmụ Izrel n’akwụkwọ n’ala ịkpa Saịnaị+ so ná ndị a. 65  N’ihi na Jehova kwuru banyere ha, sị: “Ha aghaghị ịnwụ n’ala ịkpa a.”+ Ya mere, ọ dịghị nwoke ọ bụla fọdụrụ n’ime ha ma e wezụga Keleb nwa Jefọne na Jọshụa nwa Nọn.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji