Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 17:1-13

17  Jehova wee gwa Mozis, sị:  “Gwa ụmụ Izrel okwu, natakwa ndị isi+ ha niile mkpara iri na abụọ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, otu mkpara+ maka otu ọnụmara. Ị ga-ede aha onye nke ọ bụla na mkpara ya.  Ị ga-edekwa aha Erọn na mkpara Livaị, n’ihi na otu mkpara ka e nwere maka onyeisi ụlọ ndị nna ha.  Ị ga-achịsa ha n’ụlọikwuu nzute, n’ihu Ihe Àmà,+ bụ́ ebe m na-apụta n’ihu unu mgbe niile.+  Ọ ga-erukwa na onye m ga-ahọrọ,+ mkpara ya ga-awa okooko, m ga-emekwa ka ụmụ Izrel kwụsị ntamu ha na-atamu+ megide m, nke ha na-atamukwa megide unu.”+  Mozis wee gwa ụmụ Izrel okwu, ndị isi ha niile wee nye ya otu mkpara otu mkpara maka onyeisi nke ọ bụla, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, mkpara iri na abụọ;+ mkpara Erọn bụ otu n’ime mkpara ndị ahụ.+  Mozis wee chịsa mkpara ndị ahụ n’ihu Jehova n’ụlọikwuu Ihe Àmà.+  O wee ruo n’echi ya na mgbe Mozis banyere n’ụlọikwuu Ihe Àmà, lee! mkpara Erọn, nke bụ́ maka ụlọ Livaị, awaala okooko, ọ makwara ifuru, waa okooko ma mịa mkpụrụ almọnd chara acha.  Mozis wee si n’ihu Jehova chịpụtara ụmụ Izrel niile mkpara ahụ niile, onye ọ bụla n’ime ha wee lee mkpara ndị ahụ ma were nke ya. 10  E mesịa, Jehova gwara Mozis, sị: “Debeghachi mkpara+ Erọn n’ihu Ihe Àmà ka ọ bụrụ ihe a ga-edebe ịbụrụ ụmụ nnupụisi+ a ihe ịrịba ama,+ ka ha kwụsị ntamu ha na-atamu megide m, ka ha ghara ịnwụ.” 11  Ozugbo ahụ, Mozis mere nnọọ dị ka Jehova nyere ya n’iwu. O mere nnọọ otú ahụ. 12  Ụmụ Izrel wee malite ịgwa Mozis, sị: “Anyị aghaghị ịnwụ, anyị aghaghị ịla n’iyi, anyị niile aghaghị ịla n’iyi.+ 13  Onye ọ bụla nke bịara nso,+ nke bịara ụlọikwuu Jehova nso, ga-anwụ!+ Ànyị ga-esi otú ahụ nwụchaa?”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji