Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 13:1-33

13  Jehova wee gwa Mozis, sị:  “Zipụ ndị ikom ka ha gaa ledo ala Kenan, nke m ga-enye ụmụ Izrel.+ Unu ga-eziga otu onye ka ọ nọchite anya ebo ndị nna ya, onye ọ bụla n’ime ha ga-abụ onyeisi.”+  Mozis wee si n’ala ịkpa Peran+ zipụ ha dị ka Jehova nyere n’iwu. Ndị ikom ahụ bụcha ndị isi ụmụ Izrel.  Ndị a bụ aha ha: Shamua nwa Zakọ, onye si n’ebo Ruben;  Shefat nwa Horaị, onye si n’ebo Simiọn;  Keleb+ nwa Jefọne, onye si n’ebo Juda;  Aịgal nwa Josef, onye si n’ebo Ịsaka;  Hoshia+ nwa Nọn, onye si n’ebo Ifrem;  Paltaị nwa Refọ, onye si n’ebo Benjamin; 10  Gadiel nwa Sodaị, onye si n’ebo Zebulọn; 11  Gadaị nwa Susaị, onye si n’ebo Josef,+ maka ebo Manase;+ 12  Amiel nwa Gemalaị, onye si n’ebo Dan; 13  Sitọ nwa Maịkel, onye si n’ebo Asha; 14  Nabaị nwa Vọfsaị, onye si n’ebo Naftalaị; 15  Guel nwa Mekaị, onye si n’ebo Gad. 16  Ndị a bụ aha ndị ikom Mozis zipụrụ ka ha gaa ledo ala ahụ. Mozis wee na-akpọ Hoshia nwa Nọn Jehọshụa.+ 17  Mgbe Mozis na-ezipụ ha ka ha gaa ledo ala Kenan, ọ sịrị ha: “Sinụ n’ebe a gbagoo Negeb,+ gbagoonụ banye n’ógbè bụ́ ugwu ugwu.+ 18  Hụnụ otú ala ahụ dị,+ na ndị bi n’ime ya, ma hà dị ike ka ọ̀ bụ na ha adịghị ike, ma hà dị ole na ole ka hà dị ọtụtụ; 19  na otú ala ha bi dị, ma ọ̀ dị mma ka ọ̀ dị njọ, na otú obodo ha bi dị, ma ọ̀ bụ ebe a mara ụlọikwuu ka ọ̀ bụ ebe e wusiri ike; 20  na otú ala ha dị, ma ọ̀ na-eme nri ka ọ̀ bụ na ọ dịghị eme nri,+ ma osisi ọ̀ dị na ya ka ọ̀ bụ na ọ dịghị. Nweenụ obi ike+ ma weta ụfọdụ n’ime mkpụrụ ala ahụ.” Mgbe ahụ bụ oge mkpụrụ vaịn+ mbụ na-acha. 21  Ha wee gbagoo ledo ala ahụ malite n’ala ịkpa Zin+ ruo Rihọb,+ nke dị n’ebe e si abanye Hemat.+ 22  Mgbe ha gbagoro wee banye n’ime Negeb,+ ha bịarutere Hibrọn.+ Ahaịman, Shishaị na Talmaị,+ bụ́ ụmụ Enak,+ bi n’ebe ahụ. Ma, Hibrọn+ anọwo afọ asaa e wuru ya tupu e wuo Zoan+ nke Ijipt. 23  Mgbe ha bịarutere na ndagwurugwu Eshkọl,+ ha gbuturu otu alaka osisi vaịn nke mịrị otu ụyọkọ mkpụrụ vaịn.+ Mmadụ abụọ n’ime ndị ikom ahụ wee jiri okporo osisi buru ya, butekwa mkpụrụ pọmigranet+ ụfọdụ na mkpụrụ fig ụfọdụ. 24  Ha wee kpọọ ebe ahụ ndagwurugwu Eshkọl,+ n’ihi ụyọkọ mkpụrụ osisi ahụ ụmụ Izrel gbutere n’ebe ahụ. 25  N’ikpeazụ, mgbe ụbọchị iri anọ+ gasịrị, ha si iledo ala ahụ lọta. 26  Ha wee gakwuru Mozis na Erọn na nzukọ ụmụ Izrel dum n’ala ịkpa Peran, na Kedesh.+ Ha wee kọọrọ ha na nzukọ ahụ dum otú ha si jee, gosikwa ha mkpụrụ nke ala ahụ. 27  Ha wee kọọrọ ya, sị: “Anyị banyere n’ala ahụ i zipụrụ anyị ka anyị gaa, n’ezie, ọ bụ ebe mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ+ na-eru, nke a bụkwa mkpụrụ si na ya.+ 28  Otú ọ dị, ndị bi n’ala ahụ dị ike, obodo e wusiri ike ndị dị na ya dị nnọọ ukwuu;+ anyị hụkwara ụmụ Enak n’ebe ahụ.+ 29  Ndị Amalek+ bi n’ala Negeb,+ ndị Het na ndị Jibọs+ na ndị Amọraịt+ bikwa n’ógbè bụ́ ugwu ugwu, ndị Kenan+ bikwa n’akụkụ oké osimiri nakwa n’akụkụ Jọdan.” 30  Keleb+ wee gbalịa ime ka ndị Izrel nọrọ jụụ n’ihu Mozis, o wee sị: “Ka anyị gbagoo, anyị aghaghị inweta ya, n’ihi na anyị aghaghị imeri ya.”+ 31  Ma ndị ikom ahụ so ya gaa sịrị: “Anyị agaghị enwe ike ibuso ndị ahụ agha, n’ihi na ha ka anyị ike.”+ 32  Ha wee na-akọrọ ụmụ Izrel akụkọ ọjọọ+ banyere ala ahụ ha ledoro, sị: “Ala ahụ anyị gara ledo bụ ala nke na-eripịa ndị bi ya; ndị niile anyị hụkwara n’ebe ahụ bụ ndị gbara ajọ dimkpa.+ 33  Anyị hụkwara ndị Nefilim n’ebe ahụ, bụ́ ụmụ Enak,+ ụmụ ndị Nefilim; anyị wee dị ka ụkpara n’anya anyị, otú ahụkwa ka anyị dị n’anya ha.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji