Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 11:1-35

11  Ndị Izrel wee mewe dị ka ndị nwere ihe ọjọọ ha ga-eme mkpesa ya ná ntị Jehova.+ Mgbe Jehova nụrụ ya, o were iwe dị ọkụ, ọkụ nke Jehova wee malite ire ha, o wee regbuo ụfọdụ ndị ná nsọtụ ebe ha mara ụlọikwuu.+  Mgbe ha malitere itiku Mozis, ọ rịọsiri Jehova arịrịọ ike,+ ọkụ ahụ wee nyụọ.  E wee kpọọ ebe ahụ Tabera,+ n’ihi na ọkụ nke Jehova rere ha.  Ìgwè mmadụ gwara ọgwa,+ bụ́ ndị nọ n’etiti ha, wee nwewe akpịrị ogologo,+ ụmụ Izrel n’onwe ha wee malite ịkwa ákwá, sị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa?+  Anyị na-echeta azụ̀ anyị na-ata n’Ijipt n’efu,+ tinyere kukumba na wọtamelọn na lik na yabaasị na galik!  Ma ugbu a, ike agwụla mkpụrụ obi anyị. O nweghị ihe ọ bụla ọzọ anya anyị na-ahụ ma ọ bụghị mana.”+  Mana+ dị ka mkpụrụ kọrịanda,+ o yikwara esó deliọm.+  Ha wee gbasasịa gaa na-ekporo+ ya ma na-egwe ya na nkume ma ọ bụ na-asụ ya n’ikwe, ha na-esikwa ya n’ite e ji esi nri+ ma ọ bụ jiri ya mee achịcha, ọ na-atọ ka achịcha dị ụtọ nke a gwara mmanụ.+  Mgbe igirigi dara n’abalị n’ebe ha mara ụlọikwuu, mana na-adakwa.+ 10  Mozis wee nụ ka ndị Izrel na-akwa ákwá n’ezinụlọ ha dị iche iche, onye nke ọ bụla n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu ya. Iwe Jehova wee malite ịdị ọkụ nke ukwuu,+ ihe ahụ dịkwa njọ n’anya Mozis.+ 11  Mozis wee sị Jehova: “Gịnị mere i ji kpatara ohu gị ihe ọjọọ, gịnịkwa mere ihe m amasịghị gị, i wee buru ibu mmadụ niile a bokwasị m?+ 12  Ọ̀ bụ m tụrụ ime ndị a niile? Ọ̀ bụ m mụrụ ha, nke mere i ji sị m, ‘Kuru ha n’obi gị,+ dị nnọọ ka nwoke nke na-elekọta nwa si eku nwa na-aṅụ ara,’+ banye n’ala ị ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi inye ha?+ 13  Olee ebe m ga-esi nweta anụ m ga-enye ndị a niile? N’ihi na ha na-ebesara m ákwá, sị, ‘Nye anyị anụ ka anyị taa!’ 14  Naanị m enweghị ike iburu ndị a niile, n’ihi na ha ga-anyịgbu m.+ 15  N’ihi ya, ọ bụrụ otú a ka ị na-eme m, biko, gbuo m ka m nwụọ+ ma ọ bụrụ na ihe m masịrị gị, ka m ghara ịhụ ọdachi ga-adakwasị m.” 16  Jehova wee gwa Mozis, sị: “Kpọkọtara m ndị ikom iri asaa n’ime ndị okenye Izrel,+ bụ́ ndị ị maara na ha bụ ndị okenye ụmụ Izrel na ndị isi ha,+ kpọga ha n’ụlọikwuu nzute, gị na ha ga-eguzo n’ebe ahụ. 17  M ga-agbadata+ wee gwa gị okwu n’ebe ahụ;+ m ga-ewerekwa ụfọdụ n’ime mmụọ+ dị n’ahụ́ gị wụkwasị ha, ha ga-enyekwara gị aka n’ibu ibu ha ka i wee ghara ibu ya naanị gị.+ 18  Ị ga-agwakwa ndị Izrel, sị, ‘Doonụ onwe unu nsọ maka echi,+ n’ihi na unu ga-ata anụ, n’ihi na unu akwawo ákwá ná ntị Jehova,+ sị: “Ònye ga-enye anyị anụ ka anyị taa, n’ihi na ihe dịịrị anyị mma n’Ijipt?”+ Jehova ga-enye unu anụ, unu ga-atakwa anụ n’ezie.+ 19  Unu ga-ata anụ, ọ bụghị otu ụbọchị ma ọ bụ ụbọchị abụọ ma ọ bụ ụbọchị ise ma ọ bụ ụbọchị iri ma ọ bụ ụbọchị iri abụọ, 20  kama unu ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu, ruo mgbe ọ ga-apụta unu n’oghere imi, o wee ghọọrọ unu ihe ịsọ oyi,+ n’ihi na unu ajụwo Jehova, bụ́ onye nọ n’etiti unu, unu wee na-akwa ákwá n’ihu ya, na-asị: “Gịnị mere anyị ji si n’Ijipt pụta?”’”+ 21  Mozis wee sị: “Ndị a m nọ n’etiti ha dị narị puku ndị ikom isii+ bụ́ ndị ji ụkwụ aga, ma gị onwe gị sịrị, ‘M ga-enye ha anụ, ha ga-ataru ya otu ọnwa zuru ezu’! 22  À ga-egburu ha ìgwè ewu na atụrụ na ìgwè ehi, ka o wee zuoro ha?+ Ka à ga-egbutere ha azụ̀ niile dị n’oké osimiri, ka o wee zuoro ha?” 23  Jehova wee gwa Mozis, sị: “Aka Jehova ọ̀ dị mkpụmkpụ?+ Ugbu a, ị ga-ahụ ma ihe m kwuru ọ̀ ga-emezu ma ọ̀ bụ na ọ gaghị emezu.”+ 24  E mesịa, Mozis pụtara wee gwa ha ihe Jehova kwuru. O wee kpọkọta ndị ikom iri asaa n’ime ndị okenye Izrel, o wee mee ka ha guzo gburugburu ụlọikwuu ahụ.+ 25  Jehova wee gbadata n’ígwé ojii+ gwa ya okwu,+ werekwa ụfọdụ n’ime mmụọ+ dị n’ahụ́ ya mee ka ọ dakwasị ndị okenye iri asaa ahụ. O wee ruo na ozugbo mmụọ ahụ dakwasịrị ha, ha malitere ime ka ndị amụma; ma ha emeghị ya ọzọ.+ 26  Ma, mmadụ abụọ n’ime ndị ikom ahụ ka nọ n’ebe ha mara ụlọikwuu. Aha otu n’ime ha bụ Eldad, aha onye nke ọzọ abụrụ Midad. Mmụọ nsọ wee malite ịdakwasị ha n’ihi na ha so ná ndị e dere aha ha n’akwụkwọ, ma ha agabeghị n’ụlọikwuu ahụ. Ha wee malite ime ka ndị amụma n’ebe ha mara ụlọikwuu. 27  Otu nwa okorobịa wee gbara ọsọ gaa kọọrọ Mozis, sị: “Eldad na Midad na-eme ka ndị amụma n’ebe anyị mara ụlọikwuu!” 28  Jọshụa nwa Nọn, onye ozi+ Mozis malite n’oge ọ bụ okorobịa, wee zaa, sị: “Onyenwe m Mozis, kwụsị ha ime otú ahụ!”+ 29  Otú ọ dị, Mozis sịrị ya: “Ị̀ na-ekworo m ekworo? Ekworola m ekworo, ọ dị m ka ya bụrụ na ndị Jehova niile bụ ndị amụma, n’ihi na Jehova ga-eme ka mmụọ ya dịrị n’ahụ́ ha.”+ 30  E mesịa, Mozis gara n’ebe ha mara ụlọikwuu, ya na ndị okenye Izrel. 31  Jehova wee mee ka oké ifufe+ fewe wee si n’oké osimiri+ na-ebute nnụnụ kwel ma na-eme ka ha na-efegharị n’ebe ha mara ụlọikwuu ruo ebe ga-ewe otu ụbọchị iji jeruo ya n’otu mpaghara nakwa ebe ga-ewe otu ụbọchị iji jeruo ya ná mpaghara nke ọzọ, gburugburu ebe ha mara ụlọikwuu, ha jupụtakwara n’elu ala ruo ihe dị ka kubit abụọ n’ịdị elu. 32  Ndị Izrel wee bilie n’ehihie ahụ dum nakwa n’abalị ahụ dum nakwa n’echi ya niile na-anwụde nnụnụ kwel ndị ahụ. Onye nwụtara nke kasị nta nwụtara nke juru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ homa+ iri, ha wee gbaa ha n’anwụ n’ebe niile gburugburu ebe ha mara ụlọikwuu. 33  Mgbe ha ka kpụ anụ ahụ n’ọnụ,+ tupu ha ataa ya, Jehova wesoro ha iwe dị ọkụ,+ Jehova wee malite igbu ha nke ukwuu.+ 34  E wee kpọọ ebe ahụ Kibrọt-hateeva,+ n’ihi na ọ bụ n’ebe ahụ ka ha liri ndị ahụ nwere akpịrị ogologo.+ 35  Ndị Izrel wee si na Kibrọt-hateeva kwalie gaa Hazirọt, ha wee nọrọ na Hazirọt.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji