Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Ọnụ Ọgụgụ 1:1-54

1  Jehova wee gwa Mozis okwu n’ala ịkpa Saịnaị,+ n’ụlọikwuu nzute,+ n’abalị mbụ n’ọnwa nke abụọ n’afọ nke abụọ mgbe ha pụtasịrị n’ala Ijipt,+ o wee sị:  “Gụọnụ nzukọ ụmụ Izrel dum ọnụ+ n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, n’aha n’aha, ụmụ nwoke niile, n’otu n’otu,  malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe,+ onye ọ bụla nke toruru ịga agha n’Izrel.+ Unu ga-edeba aha ha n’akwụkwọ n’ụsụụ ha, gị na Erọn.  “Ndị ikom ụfọdụ ga-eso unu, otu onye ga-esi n’otu ebo; onye nke ọ bụla ga-abụ onyeisi nke ụlọ ndị nna ya.+  Ndị a bụ aha ndị ikom ga-enyere unu aka: N’ebo Ruben,+ Elaịzọ+ nwa Shedeọ;  n’ebo Simiọn,+ Shelumiel+ nwa Zurishadaị;  n’ebo Juda,+ Nashọn+ nwa Aminadab;  n’ebo Ịsaka,+ Netanel+ nwa Zua;  n’ebo Zebulọn,+ Elayab+ nwa Hilọn; 10  n’ime ụmụ Josef:+ n’ebo Ifrem,+ Elishama nwa Amaịhọd; n’ebo Manase,+ Gameliel nwa Pedazọ; 11  n’ebo Benjamin,+ Abidan+ nwa Gidionaị; 12  n’ebo Dan,+ Ahayiza+ nwa Amishadaị; 13  n’ebo Asha,+ Pegiel+ nwa Ọkran; 14  n’ebo Gad,+ Elayasaf+ nwa Duel;+ 15  n’ebo Naftalaị,+ Ahaịra+ nwa Inan. 16  Ọ bụ ndị a ka e si ná nzukọ ahụ kpọọ, bụ́ ndị isi+ nke ebo ndị nna ha. Ha bụ ndị isi nke puku kwuru puku ndị Izrel.”+ 17  Mozis na Erọn wee kpọrọ ndị ikom a a kpọrọ aha. 18  Ha wee kpọkọta nzukọ ahụ dum n’abalị mbụ n’ọnwa nke abụọ, ka ha wee deba usoro ọmụmụ+ ha n’akwụkwọ, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, dị ka ole aha ha dị, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe,+ n’otu n’otu, 19  dị nnọọ ka Jehova nyere Mozis n’iwu; o wee deba aha ha n’akwụkwọ+ n’ala ịkpa Saịnaị. 20  Ụmụ Ruben, ọkpara+ Izrel, dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, n’otu n’otu, ụmụ nwoke niile malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 21  bụ́ ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Ruben, dị puku iri anọ na isii na narị ise.+ 22  N’ime ụmụ Simiọn,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, ndị bụ́ ụmụ ya e debara aha ha n’akwụkwọ, n’otu n’otu, ụmụ nwoke niile malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 23  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Simiọn dị puku iri ise na itoolu na narị atọ.+ 24  N’ime ụmụ Gad,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 25  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Gad+ dị puku iri anọ na ise, narị isii na iri ise.+ 26  N’ime ụmụ Juda,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 27  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Juda dị puku iri asaa na anọ na narị isii.+ 28  N’ime ụmụ Ịsaka,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 29  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Ịsaka dị puku iri ise na anọ na narị anọ.+ 30  N’ime ụmụ Zebulọn,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 31  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Zebulọn dị puku iri ise na asaa na narị anọ.+ 32  N’ime ụmụ Josef: ndị Ifrem mụrụ,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 33  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Ifrem+ dị puku iri anọ na narị ise.+ 34  N’ime ụmụ Manase,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 35  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Manase dị puku iri atọ na abụọ na narị abụọ.+ 36  N’ime ụmụ Benjamin,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 37  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Benjamin dị puku iri atọ na ise na narị anọ.+ 38  N’ime ụmụ Dan,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 39  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Dan dị puku iri isii na abụọ na narị asaa.+ 40  N’ime ụmụ Asha,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 41  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Asha dị puku iri anọ na otu na narị ise.+ 42  N’ime ụmụ Naftalaị,+ dị ka usoro ọmụmụ ha si dị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, n’ụlọ ndị nna ha, n’aha n’aha, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha, 43  ndị e debara aha ha n’akwụkwọ n’ebo Naftalaị dị puku iri ise na atọ na narị anọ.+ 44  Ọ bụ ndị a ka e debara aha ha n’akwụkwọ, ya bụ, ndị Mozis debara aha ha n’akwụkwọ, ya na Erọn na ndị isi Izrel, bụ́ ndị ikom iri na abụọ. Onye ọ bụla n’ime ha nọchitere anya ụlọ nna ya. 45  Ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ n’ime ụmụ Izrel, dị ka ụlọ ndị nna ha si dị, malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe, onye ọ bụla nke toruru ịga agha n’Izrel, 46  ee, ndị niile e debara aha ha n’akwụkwọ, dị narị puku isii na atọ, narị ise na iri ise.+ 47  Otú ọ dị, e debaghị aha ndị Livaị+ n’akwụkwọ, dị ka ebo ndị nna ha si dị, mgbe a na-edeba aha ụmụ Izrel.+ 48  Jehova wee gwa Mozis, sị: 49  “Ọ bụ naanị ebo Livaị ka ị na-agaghị edeba aha ha n’akwụkwọ, agụnyekwala ọnụ ọgụgụ ha n’ọnụ ọgụgụ ụmụ Izrel.+ 50  Gị onwe gị, họpụta ndị Livaị ka ha na-elekọta ụlọikwuu Ihe Àmà+ na arịa ya niile na ihe niile metụtara ya.+ Ọ bụ ha ga na-ebu ụlọikwuu ahụ na arịa+ ya niile, ọ bụ ha ga na-eje ozi+ na ya; ha ga-amakwa ụlọikwuu gburugburu ụlọikwuu ahụ.+ 51  Mgbe ọ bụla unu ga-eburu ụlọikwuu ahụ kwalie, ọ bụ ndị Livaị ga-atọtu ya;+ mgbe ọ bụla a ga-eguzobe ụlọikwuu ahụ, ọ bụ ndị Livaị ga-eguzobe ya; a ga-egbu+ onye nkịtị ọ bụla nke bịara nso. 52  “Onye ọ bụla n’ime ụmụ Izrel ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe ìgwè ọ nọ na ya mara, nwoke ọ bụla ga-ama ụlọikwuu ya n’ebe ìgwè+ ya nke ebo atọ mejupụtara mara, n’ụsụụ ha. 53  Ndị Livaị ga-ama ụlọikwuu gburugburu ụlọikwuu Ihe Àmà, ka a ghara iweso+ nzukọ ụmụ Izrel iwe; ndị Livaị ga na-ejekwa ozi e kwesịrị ije n’ụlọikwuu Ihe Àmà.”+ 54  Ụmụ Izrel wee mee ihe niile Jehova nyere Mozis n’iwu. Ha mere nnọọ otú ahụ.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji