Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!

 ISI NKE 11

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

1. Gịnị mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị?

Olee otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi enyere anyị aka ịkpachara anya mgbe niile?—ABỤ ỌMA 36:9.

Chineke ma ihe karịa anyị n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. Ọ hụrụ anyị n’anya, ihe banyere anyị na-emetụkwa ya n’obi. Ihe ọzọ bụ na o nweghị mgbe ọ chọrọ ka anyị na-eduzi onwe anyị. (Jeremaya 10:23) Anyị kwesịrị ịgakwuru ya ka o duzie anyị otú ahụ nwata kwesịrị ịgakwuru nna ya na nne ya ka ha duzie ya. (Aịzaya 48:17, 18) Ọ bụ Chineke nyere iwu ndị dị na Baịbụl, o jikwa ha na-eduzi anyị.Gụọ 2 Timoti 3:16.

Jehova ji iwu niile o nyere anyị na-akụziri anyị otú ka mma anyị ga-esi na-ebi ndụ ugbu a. Ha na-akụzikwara anyị ihe anyị ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. Ebe ọ bụ Chineke kere anyị, anyị kwesịrị irubere ya isi.Gụọ Abụ Ọma 19:7, 11; Mkpughe 4:11.

2. Olee otú Okwu Chineke si eduzi anyị?

Na Baịbụl, o nwere ebe ụfọdụ Chineke nyere iwu, kwuo hoo haa ihe anyị ga-eme. (Diuterọnọmi 22:8) E nwekwara ihe ụfọdụ Chineke kwuru bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịma ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Ọ bụzi anyịnwa ga-eji ikike iche echiche anyị mara ihe anyị kwesịrị ime dabere n’ihe ahụ o kwuru. (Ilu 2:10-12) Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ndụ bụ onyinye Chineke nyere anyị. Ọ bụrụ na anyị echeta ihe a o kwuru, ọ ga-eme ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-emerụ ma anyịnwa ma ndị ọzọ ahụ́.Gụọ Ọrụ Ndịozi 17:28.

3. Olee iwu abụọ kacha mkpa?

Jizọs kwuru iwu abụọ kacha mkpa. Nke mbụ mere ka anyị ghọta ihe mere e ji kee ụmụ mmadụ. E kere anyị ka anyị mara Chineke, hụ ya n’anya ma na-ejere ya ozi mgbe niile. Anyị kwesịrị iburu iwu mbụ a n’uche mgbe  ọ bụla anyị na-eme mkpebi. (Ilu 3:6) Ọ bụrụ na mmadụ ana-erube isi n’iwu ahụ, ya na Chineke ga-adị ná mma, ọ ga-enwekwa ezigbo obi ụtọ. Onye ahụ ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi.Gụọ Matiu 22:36-38.

Iwu nke abụọ Jizọs kwuru nwere ike inyere anyị aka ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma. (1 Ndị Kọrịnt 13:4-7) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe e kwuru n’iwu ahụ, anyị ga na-emeso ndị ọzọ ihe otú Chineke si emeso ha.Gụọ Matiu 7:12; 22:39, 40.

4. Olee otú iwu Chineke si abara anyị uru?

Iwu Chineke na-akụziri ezinụlọ otú ha ga-esi na-ahụ ibe ha n’anya ma na-emekọ ihe ọnụ. (Ndị Kọlọsi 3:12-14) Okwu Chineke na-emekwa ka ezinụlọ dịrị n’otu. O kwuru na di ekwesịghị ịhapụ nwunye ya, nwaanyị ekwesịghịkwa ịhapụ di ya.Gụọ Jenesis 2:24.

Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-esi ike achụọ anyị n’ọrụ, anyị ga na-enwekwa obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ na-achọkarị ka ndị na-ekwu eziokwu na ndị na-arụsi ọrụ ike na-arụrụ ha ọrụ. Ị manụ na ikwu eziokwu na ịrụsi ọrụ ike so n’iwu ndị e nyere na Baịbụl. (Ilu 10:4, 26; Ndị Hibru 13:18) Okwu Chineke gwakwara anyị ka afọ ju anyị n’ihe anyị nwere. O kwukwara na mkpa anyị kwesịrị ịbụ otú anyị na Chineke ga-esi dịrị ná mma, ọ bụghị otú anyị ga-esi akpakọba akụnụba.Gụọ Matiu 6:24, 25, 33; 1 Timoti 6:8-10.

Anyị mee ihe Chineke nyere n’iwu, anyị agaghị na-arịakarị ọrịa. (Ilu 14:30; 22:24, 25) Dị ka ihe atụ, Chineke nyere anyị iwu ka anyị ghara ịṅụ oké mmanya. Ọ bụrụ na anyị egee ntị n’iwu a, anyị agaghị na-arịa ọrịa ma ọ bụkwanụ na-enwe ihe mberede ịṅụ oké mmanya na-akpata. (Ilu 23:20) Jehova asịghị anyị aṅụla mmanya, kama, ọ sị anyị aṅụbigala ya ókè. (Abụ Ọma 104:15; 1 Ndị Kọrịnt 6:10) Chineke nyere anyị iwu ka anyị kpachara anya n’otú anyị si akpa àgwà nakwa n’ihe anyị na-eche n’echiche. Iwu ndị ahụ o nyere anyị na-abakwara anyị uru. (Abụ Ọma 119:97-100) Ma, isi ihe mere ezigbo Ndị Kraịst ji edebe iwu Chineke abụghị naanị ka ọ baara ha uru, kamakwa ka ha wetara Jehova otuto.Gụọ Matiu 5:14-16.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Gwa Anyị Ka Anyị na Gị Mụwa Baịbụl

A ga na-abịa akụziri gị Baịbụl n’ebe ị chọrọ nakwa mgbe ị chọrọ.