Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE IRI NA ANỌ

Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ

Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ

1, 2. Olee otú Jehova chọrọ ka ezinụlọ niile si na-ebi?

Ọ BỤ Jehova Chineke jikọrọ di na nwunye mbụ. Baịbụl gwara anyị na o kere nwaanyị mbụ ma ‘kpọrọ ya kpọtara di ya.’ Ihe a tọgburu Adam atọgbu, nke mere na ọ sịrị: “Ehee! Onye a bụ ọkpụkpụ nke si n’ọkpụkpụ m na anụ ahụ́ nke si n’anụ ahụ́ m.” (Jenesis 2:22, 23) Ihe a gosiri na Jehova chọrọ ka di na nwunye na-enwe obi ụtọ.

2 Ọ dị mwute na ọtụtụ ezinụlọ anaghị enwe obi ụtọ. Ma, e nwere ọtụtụ ihe dị na Baịbụl ga-enyere mmadụ niile aka ka ihe na-aga nke ọma n’ezinụlọ ha, ha niile ana-enwekwa obi ụtọ.—Luk 11:28.

IHE CHINEKE CHỌRỌ KA DI NA-EME

3, 4. (a) Olee otú di kwesịrị isi na-emeso nwunye ya ihe? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka di na nwunye na-agbaghara ibe ha?

3 Baịbụl sịrị na di kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya, na-akwanyekwara ya ùgwù. Ime otú a ga-egosi na ọ bụ ezigbo di. Biko gụọ Ndị Efesọs 5:25-29. Onye bụ́ di kwesịrị ịna-emeso nwunye ya ihe mgbe niile otú ga-egosi na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ ga na-eme ike ya niile iji hụ na ihe ọjọọ emeghị ya. Ọ ga na-elekọta ya, ọ gaghịkwa eme ihe ga-emerụ ya ahụ́.

4 Gịnịkwanụ ka di kwesịrị ime ma nwunye ya mejọọ ihe? Baịbụl gwara ndị bụ́ di, sị: “Na-ahụnụ nwunye unu n’anya, unu ewesola ha oké iwe.” (Ndị Kọlọsi 3:19) Ndị bụ́ di, chetanụ na ununwa na-emejọkwa ihe. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka Chineke gbaghara gị, gịnwa kwesịkwara ịna-agbaghara nwunye gị. (Matiu 6:12, 14, 15)  Ọ bụrụ na di na nwunye dịcha njikere ịgbaghara ibe ha, ọ ga-eme ka ha na-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ ha.

5. Gịnị mere di ji kwesị ịna-akwanyere nwunye ya ùgwù?

5 Jehova chọrọ ka di na-akwanyere nwunye ya ùgwù. Di kwesịrị ịna-echebara ihe ndị na-akpa nwunye ya echiche. Ndị bụ́ di ekwesịghị iji ihe a gwurie egwu. Jehova nwere ike ọ gaghị anụ ekpere onye bụ́ di ma ọ bụrụ na ọ naghị emeso nwunye ya ihe otú dị mma. (1 Pita 3:7) Ọ bụ ndị hụrụ Jehova n’anya ka Jehova ji kpọrọ ihe. Jehova ejighị ụmụ nwoke kpọrọ ihe karịa ụmụ nwaanyị. Kama, o ji onye ọ bụla hụrụ ya n’anya kpọrọ ihe.

6. Gịnị ka di na nwunye ịbụ “otu anụ ahụ́” pụtara?

6 Jizọs kọwara na di na nwunye “abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu.” (Matiu 19:6) Ha ekwesịghị ịhapụ ibe ha, e nweghịkwa onye nke ga-anwa anwa gbawa n’èzí. (Ilu 5:15-21; Ndị Hibru 13:4) Ndị bụ́ di na nwunye kwesịrị ịna-egbo ibe ha mkpa agụụ mmekọahụ. Ha agaghịkwa achọwa naanị ọdịmma onwe ha n’okwu a. (1 Ndị Kọrịnt 7:3-5) Onye bụ́ di kwesịrị ịna-echeta na “ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya.” O kwesịrị ịhụ nwunye ya n’anya, jirikwa ya kpọrọ ihe. Ọ na-atọgbu nwaanyị atọgbu ma di ya jiri obiọma na-emeso ya ihe, hụkwa ya n’anya.—Ndị Efesọs 5:29.

IHE CHINEKE CHỌRỌ KA NWUNYE NA-EME

7. Gịnị mere ezinụlọ ọ bụla ji kwesị inwe onye bụ́ isi ya?

7 Ezinụlọ ọ bụla kwesịrị inwe onye bụ́ isi ya, onye ga na-eduzi ya ka ndị niile nọ na ya nwee ike ịna-emekọ ihe ọnụ. Ná 1 Ndị Kọrịnt 11:3, Baịbụl sịrị: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị; Chineke bụkwa isi nke Kraịst.”

8. Olee otú nwaanyị ga-esi gosi na ya na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu?

 8 O nweghị di na-anaghị emejọ ihe. Mana, ọ bụrụ na nwaanyị akwadoo mkpebi ndị di ya na-eme, jirikwa obi ya niile na-eme ka ihe na-aga nke ọma, ọ ga-abara ndị niile nọ n’ezinụlọ ha uru. (1 Pita 3:1-6) Baịbụl sịrị: “Onye bụ́ nwunye kwesịrị ịdị na-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu.” (Ndị Efesọs 5:33) Ọ bụrụkwanụ na nwoke na nwunye ya anaghị ekpe otu okpukpe? Nwaanyị ahụ ka kwesịkwara ịna-akwanyere di ya ùgwù nke ukwuu. Baịbụl sịrị: “Unu ndị bụ́ nwunye, doonụ onwe unu n’okpuru di unu, ka e wee rite ha n’uru n’ekwughị okwu ọ bụla site n’omume nwunye ha, ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha adịghị erube isi n’okwu Chineke, ebe ha ji anya ha hụ omume unu nke dị ọcha, ya na nkwanye ùgwù dị ukwuu.” (1 Pita 3:1, 2) Ọ bụrụ na nwunye ana-akpa àgwà dị mma, o nwere ike ime ka di ya ghọta ihe mere o ji kwere ihe ndị o kweere, hapụkwa inye ya nsogbu.

9. Gịnị ka nwaanyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ihe o chere dị iche n’ihe di ya chọrọ ime? (b) Olee ndụmọdụ e nyere ndị nwunye na Taịtọs 2:4, 5?

 9 Gịnị ka onye bụ́ nwunye kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ihe o chere dị iche n’ihe di ya chọrọ ime? O kwesịrị iji obi umeala kwuo ihe yanwa chere. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe Sera kwuru ihe na-amasịghị Ebreham, ma Jehova gwara Ebreham, sị: “Gee ntị n’olu ya.” (Jenesis 21:9-12) Ọ na-esi ike di bụ́ Onye Kraịst ekpebie ka e mee ihe megidere ihe Baịbụl kwuru. N’ihi ya, nwunye ya kwesịrị ịkwado ya. (Ọrụ Ndịozi 5:29; Ndị Efesọs 5:24) Ezigbo nwaanyị na-elekọta ezinụlọ ya nke ọma. (Gụọ Taịtọs 2:4, 5.) Ọ bụrụ na di ya na ụmụ ha ahụ otú o si arụsi ọrụ ike ka ihe dịrị ha ná mma, ha ga-ahụkwu ya n’anya, na-akwanyekwukwara ya ùgwù.—Ilu 31:10, 28.

Olee ihe Sera mere nke ndị bụ́ nwunye kwesịrị iṅomi?

10. Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara di na nwunye ikewa nakwa ịgba alụkwaghịm?

10 Mgbe ụfọdụ, di na nwunye na-eji ọkụ ọkụ ekpebi ikewa ma ọ bụ ịgba alụkwaghịm. Ma, ihe Baịbụl kwuru bụ na “nwunye ekwesịghị ịhapụ di ya,” nakwa na “di ekwesịghịkwa ịhapụ nwunye ya.” (1 Ndị Kọrịnt 7:10, 11) E nwere nsogbu ụfọdụ siri ezigbo ike nwere ike ime ka di na nwunye kpebie ikewa. Ma, ha kwesịrị ilezi anya tupu ha emee ụdị mkpebi a. Gịnịkwanụ banyere ịgba alụkwaghịm? Baịbụl sịrị na naanị ihe nwere ike ime ka di ma ọ bụ nwunye gbaa ibe ya alụkwaghịm bụ ma otu n’ime ha kwaa iko.—Matiu 19:9.

IHE CHINEKE CHỌRỌ KA NDỊ MỤRỤ ỤMỤ NA-EME

Onye ọ bụla nọ́ n’ezinụlọ nwere ihe ọ ga-amụta n’aka Jizọs

11. Gịnị ka e kwesịrị ịna-emere ụmụ karịchaa ihe ọ bụla ọzọ?

11 Ndị mụrụ ụmụ, na-ewepụtanụ ezigbo oge ka unu na ụmụ unu na-anọrị. Unu dị ụmụ unu mkpa, unu kwesịkwara ịna-akụziri ha banyere Jehova karịa ihe ọ bụla ọzọ.—Diuterọnọmi 6:4-9.

12. Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ime iji chebe ụmụ ha?

 12 Ihe ọjọọ juru n’ụwa Setan a na-akakwu njọ. E nwekwara ụfọdụ ndị ga-achọ ime ụmụ anyị ihe ọjọọ, nweekwa ndị ga-achọ imebi ha. Ọ na-esiri ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ ike ịgwa ụmụ ha ihe gbasara mmekọahụ. Ma, ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịdọ ụmụ ha aka ná ntị banyere ndị na-emetọ ụmụaka, kụziekwara ha otú ha ga-esi ezere ha. Ndị nne na nna, chebenụ ụmụ unu. *1 Pita 5:8.

13. Olee otú ndị mụrụ ụmụ kwesịrị isi na-akụziri ụmụ ha ihe?

13 Ọ bụ ọrụ ndị mụrụ ụmụ ịkụziri ụmụ ha otú ha  kwesịrị isi na-akpa àgwà. Olee otú ị ga-esi akụziri ụmụ gị ihe a? Ọzụzụ ị na-enye ụmụ gị ga-abara ha uru. Ma, i kwesịghị iji iwe na obi ọjọọ na-adọ ha aka ná ntị. (Jeremaya 30:11) N’ihi ya, enyela ụmụ gị ntaramahụhụ mgbe iwe ji gị. Okwu gị ekwesịghị ịdị ka ebe “e ji mma agha maa mmadụ.” Ụdị okwu a ga-agbawa ụmụ gị obi. (Ilu 12:18) Kụziere ụmụ gị ka ha ghọta ihe mere ha ga-eji na-erube isi.—Ndị Efesọs 6:4; Ndị Hibru 12:9-11; gụọ ihe nke 30 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

IHE CHINEKE CHỌRỌ KA ỤMỤ NA-EME

14, 15. Gịnị mere ụmụ ji kwesị ịna-erubere ndị mụrụ ha isi?

14 Jizọs rubeere Nna ya isi mgbe niile, ma mgbe ọ na-adịrịghị ya mfe ime otú ahụ. (Luk 22:42; Jọn 8:28, 29) Jehova chọkwara ka ụmụ na-erubere ndị mụrụ ha isi.—Ndị Efesọs 6:1-3.

15 Ụmụ, ọ bụrụgodị na unu chere na ọ ga-esiri unu ike irubere ndị mụrụ unu isi, chetanụ na obi ga-atọ Jehova na nne na nna unu ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-erube isi. *Ilu 1:8; 6:20; 23:22-25.

Gịnị ga-enyere ndị na-eto eto aka ime ihe dị Chineke mma ma ọ bụrụ na a nwaa ha ọnwụnwa?

16. (a) Olee otú Setan si anwa ndị na-eto eto ọnwụnwa ka ha mee ihe ọjọọ? (b) Gịnị mere o ji dị mkpa ka ọ bụrụ ndị hụrụ Jehova n’anya ka ị ga-emete enyi?

16 Ekwensu nwere ike iji ndị enyi unu na ụmụaka ndị ọzọ nwaa unu ka unu mee ihe ọjọọ. Ọ ma na ọ ga-esiri unu ike ịjụ ime ihe ndị enyi unu ga-achọ ka unu mee. Dị ka ihe atụ, ada Jekọb bụ́ Daịna metere ndị na-ahụghị Jehova n’anya enyi. Nsogbu ihe ahụ o mere kpataara ya na ndị ezinụlọ ya abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. (Jenesis 34:1, 2) Ọ bụrụ na ndị enyi gị abụghị ndị hụrụ Jehova n’anya, ha nwere ike ịnwa gị ka i mee ihe Jehova kpọrọ asị. Nke ahụ ga-akpatara  gị na ndị ezinụlọ gị obi mgbawa, wutekwa Jehova. (Ilu 17:21, 25) Ọ bụ ya mere o ji dị mkpa ka ọ bụrụ ndị hụrụ Jehova n’anya ka ị ga-emete enyi.—1 Ndị Kọrịnt 15:33.

EZINỤLỌ UNU GA-ENWELI OBI ỤTỌ

17. Olee ihe onye ọ bụla nọ́ n’ezinụlọ kwesịrị ịna-eme?

17 Ọ bụrụ na mmadụ niile nọ́ n’ezinụlọ na-eme ihe Chineke kwuru, ha ga-agbara ọtụtụ nsogbu ọsọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị bụ di, na-emeso nwunye gị ihe otú ga-egosi na ị hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na ị bụ nwaanyị, na-akwanyere di gị ùgwù, na-erubekwara ya isi. Na-eme ka nwaanyị ahụ e kwuru okwu ya n’Ilu 31:10-31. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, na-akụziri ụmụ gị ka ha hụ Chineke n’anya. (Ilu 22:6) Ọ bụrụ na ị bụ nna, na-eduzi ezinụlọ gị “nke ọma.” (1 Timoti 3:4, 5; 5:8) Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi. (Ndị Kọlọsi 3:20) Chetanụ na onye ọ bụla nọ́ n’ezinụlọ nwere ike imejọ ihe. Ọ bụ ya mere unu ji kwesị ịdị umeala n’obi, na-arịọkwa ibe unu mgbaghara ma unu mejọọ ihe. Ihe Jehova chọrọ ka onye ọ bụla nọ́ n’ezinụlọ na-eme dị n’ime Baịbụl.

^ para. 12 Ị chọọ ịmatakwu otú ị ga-esi echebe ụmụ gị, gụọ isi nke iri atọ na abụọ n’akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site nAka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

^ para. 15 Nwatakịrị ekwesịghị irubere ndị mụrụ ya isi ma ọ bụrụ na ha asị ya mee ihe Chineke sị na ọ dịghị mma.—Ọrụ Ndịozi 5:29.