Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE ANỌ

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

1, 2. (a) Ọ bụrụ na ọ bụ naanị aha onye a ma ama ka ị ma, ọ̀ pụtara na ị ma onye ahụ nke ọma? Kọwaa. (b) Gịnị ka ndị mmadụ kweere banyere Jizọs?

E NWERE ọtụtụ ndị a ma ama n’ụwa. O nwere ike ịbụ na e nwere onye a ma ama ị ma aha ya. Ma naanị na ị ma aha ya apụtaghị na ị ma onye ahụ nke ọma. Ọ pụtaghịkwa na ị ma ihe niile gbasara otú o si akpa àgwà na ụdị onye ọ bụ.

2 O nwere ike ịbụ na ị nụtụla banyere Jizọs Kraịst n’agbanyeghị na o ruola ihe dị ka puku afọ abụọ o biri n’ụwa. Ma ọtụtụ ndị amaghị ụdị onye Jizọs bụ mgbe ọ nọ n’ụwa. Ụfọdụ ndị sịrị na ọ bụ ezigbo mmadụ, ndị ọzọ asị na ọ bụ onye amụma. E nwekwara ndị kweere na Jizọs bụ Chineke. Ònye ka gịnwa chere na Jizọs bụ?—Gụọ ihe nke 12 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

3. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ị mụta banyere Jehova Chineke na Jizọs Kraịst?

3 Ọ dị mkpa ka ị mata ihe bụ́ eziokwu gbasara Jizọs. N’ihi gịnị? Baịbụl gwara anyị, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) N’eziokwu, ịmata ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Jehova na Jizọs nwere ike ime ka ị dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs. (Jọn 14:6) Ihe ọzọ bụ na ịmata banyere Jizọs ga-abara gị uru n’ihi na ọ bụ n’aka ya ka anyị ga-akacha amụta otú  anyị ga-esi ebi ndụ nakwa otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ. (Jọn 13:34, 35) N’Isi nke Mbụ, anyị mụtara ihe ndị bụ́ eziokwu banyere Chineke. Ugbu a, anyị ga-amụta ihe Baịbụl na-akụziri anyị banyere Jizọs.

ANYỊ AHỤLA MESAYA AHỤ!

4. Gịnị ka “Mesaya” na “Kraịst” na-egosi?

4 Ọtụtụ afọ tupu a mụọ Jizọs, Jehova kwere nkwa na Baịbụl na ọ ga-ezite Mesaya ma ọ bụ Kraịst. “Mesaya” bụ okwu Hibru, “Kraịst” abụrụ okwu Grik. Utu aha abụọ a na-egosi na Chineke ga-ahọrọ Mesaya ahụ o kwere ná nkwa ma nye ya ọkwá pụrụ iche. Mesaya ahụ ga-eme ka nkwa niile Chineke kwere mezuo. E nwekwara ihe ndị ọ ga-emere gị ugbu a. Ma, tupu a mụọ Jizọs, ọtụtụ ndị nọ na-eche, sị: ‘Ònyedị ga-abụ Mesaya ahụ?’

5. Ndị na-eso ụzọ Jizọs hà kwetara na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ?

5 Obi siri ndị na-eso ụzọ Jizọs ike na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa. (Jọn 1:41) Dị ka ihe atụ, Saịmọn Pita gwara Jizọs, sị: “Ị bụ Kraịst.” (Matiu 16:16) Gịnị ga-eme ka obi sie anyị ike na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ?

6. Olee otú Jehova si enyere ndị nwere ezi obi aka ịmata onye Mesaya ahụ bụ?

6 Ogologo oge tupu a mụọ Jizọs, ndị amụma Chineke dere ọtụtụ ihe ga-enyere ndị mmadụ aka ịmata onye ga-abụ Mesaya ahụ. Olee otú ihe ha dere ga-esi enyere ndị mmadụ aka? Ka e were ya na a sịrị gị gaa n’ọdụ ụgbọala kpọta onye ị na-ahụtụbeghị. Ọ bụrụ na mmadụ amaara gị atụ otú onye ahụ dị, ọ ga-enyere gị aka ịmata ya. Ọ bụ ụdị ihe a ka Jehova mere. O si n’ọnụ ndị amụma ya gwa anyị ihe ndị Mesaya ahụ ga-eme nakwa ihe ndị ga-eme ya. Otú amụma niile e buru  gbasara Mesaya ahụ si mezuo n’isi Jizọs na-enyere ndị nwere ezi obi aka ịmata na Jizọs bụ Mesaya ahụ.

7. Olee amụma abụọ gosiri na Jizọs bụ Mesaya ahụ?

7 Ka anyị leba anya n’amụma abụọ n’ime amụma ndị ahụ. Nke mbụ: Narị afọ asaa tupu a mụọ Jizọs, Maịka buru amụma na a ga-amụ Mesaya n’obere obodo a na-akpọ Betlehem. (Maịka 5:2) Ọ bụkwa ebe ahụ ka a mụrụ Jizọs. (Matiu 2:1, 3-9) Nke abụọ: Daniel buru amụma na Mesaya ahụ ga-abịa n’afọ 29. (Daniel 9:25) Amụma ndị a bụ naanị abụọ n’ime ọtụtụ amụma ndị mere ka o doo anya na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa.—Gụọ ihe nke 13 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

Jizọs ghọrọ Mesaya ma ọ bụ Kraịst mgbe e mere ya baptizim

8, 9. Gịnị mere mgbe e mere Jizọs baptizim nke gosiri na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ?

8 Jehova mere ka o doo anya na Jizọs bụ Mesaya ahụ. Chineke kwere nkwa na ya ga-enye Jọn Onye Na-eme Baptizim ihe àmà ga-enyere ya aka ịmata onye Mesaya ahụ bụ. Mgbe Jizọs gakwuuru Jọn ka o mee ya baptizim n’Osimiri Jọdan n’afọ 29, Jọn hụrụ ihe àmà ahụ. Baịbụl gwara anyị ihe merenụ. Ọ sịrị: “Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, o si na mmiri ahụ bilie ozugbo; ma, lee! eluigwe meghere, o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru wee bekwasị ya. Lee! Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: ‘Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.’” (Matiu 3:16, 17) Mgbe Jọn nụrụ olu  ahụ, hụkwa ihe àmà ahụ, ọ matara na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ. (Jọn 1:32-34) N’ụbọchị ahụ, mgbe Jehova wụkwasịrị Jizọs mmụọ nsọ ya, Jizọs ghọrọ Mesaya. Ọ bụ ya ka Chineke họọrọ ịbụ Eze na Onye Ndú.—Aịzaya 55:4.

9 Amụma ndị e buru na Baịbụl, ihe Jehova kwuru, na ihe àmà o nyere mgbe e mere Jizọs baptizim gosiri  na ọ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ. Ma, ebee ka Jizọs si bịa? Oleekwa ụdị onye ọ bụ? Ka anyị hụ ihe Baịbụl kwuru banyere ajụjụ ndị a.

OLEE EBE JIZỌS SI BỊA?

10. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere Jizọs tupu ya abịa n’ụwa?

10 Baịbụl kwuru na Jizọs ebiela ọtụtụ afọ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa. Maịka kwuru na Mesaya “malitere n’oge ochie.” (Maịka 5:2) Jizọs n’onwe ya kwuru ọtụtụ ugboro na ya ebiela n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa. (Gụọ Jọn 3:13; 6:38, 62; 17:4, 5.) Jehova na Jizọs dị n’ezigbo mma tupudị Jizọs abịa n’ụwa.

11. Gịnị mere Jehova ji hụ Jizọs n’anya nke ukwuu?

11 Jehova hụrụ Jizọs n’anya nke ukwuu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ ya ka Chineke bu ụzọ kee tupu onye ọ bụla ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ. N’ihi ya, a na-akpọ Jizọs “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” * (Ndị Kọlọsi 1:15) Ihe ọzọ mekwara Jehova ji hụ Jizọs n’anya nke ukwuu bụ na ọ bụ naanị ya ka Jehova ji aka ya kee. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “Ọkpara ọ mụrụ naanị ya.” (Jọn 3:16) Ọ bụkwa naanị Jizọs ka Jehova si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile. (Ndị Kọlọsi 1:16) Ọ bụ naanị Jizọs ka a kpọrọ “Okwu ahụ,” n’ihi na Jehova si n’ọnụ ya gwa ndị mmụọ ozi nakwa ụmụ mmadụ okwu.—Jọn 1:14.

12. Olee otu anyị si mara na Jizọs na Chineke abụghị otu onye?

12 Ụfọdụ ndị kweere na Jizọs bụ Chineke. Ma, ọ bụghị ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl kwuru na e kere Jizọs eke. Nke a pụtara na Jizọs nwere mmalite. Ma Jehova,  bụ́ Onye kere ihe niile, enweghị mmalite. (Abụ Ọma 90:2) N’agbanyeghị na Jizọs bụ Ọkpara Chineke, o nweghị mgbe o chere echiche ịbụ Chineke. Baịbụl mere ka o doo anya na Nna ahụ, ya bụ Jehova, ka Ọkpara ya ukwuu. (Gụọ Jọn 14:28; 1 Ndị Kọrịnt 11:3.) Ọ bụ naanị Jehova bụ ‘Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.’ (Jenesis 17:1) Ọ bụ ya bụ onye kacha ihe niile elu na onye kacha ihe niile ike.—Gụọ ihe nke 14 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

13. Gịnị mere Baịbụl ji kwuo na Jizọs bụ “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya”?

13 Jehova na Ọkpara ya bụ́ Jizọs rụkọrọ ọrụ ọtụtụ ijeri afọ tupu e kee eluigwe na ụwa. O doro anya na ha hụrụ ibe ha n’anya nke ukwuu. (Jọn 3:35; 14:31) Jizọs ṅomiri àgwà nna ya nke ọma nke na Baịbụl kpọrọ ya “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya.”—Ndị Kọlọsi 1:15.

14. Olee otú e si mụọ Ọkpara Chineke hụrụ n’anya ya abụrụ mmadụ?

14 Ọkpara a Chineke hụrụ n’anya ji obi ya niile hapụ eluigwe ma kwe ka a mụọ ya n’ụwa ka ọ bụrụ mmadụ. Olee otú o si kwe omume? Jehova rụrụ ọrụ ebube si n’eluigwe bufee ndụ Ọkpara ya n’akpa nwa otu nwa agbọghọ na-amaghị nwoke aha ya bụ Meri. N’ihi ya, ọ bụghị mmadụ tụwara ime Jizọs. Nke a mere ka Meri mụọ nwa zuru okè. Ọ kpọkwara ya Jizọs.—Luk 1:30-35.

OLEE ỤDỊ ONYE JIZỌS BỤ?

15. Olee otú i nwere ike isi matakwuo Jehova nke ọma?

15 I nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe banyere Jizọs, àgwà ya, na otú o si bie ndụ ma ị gụọ akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn. A na-akpọ ha Oziọma. Ebe ọ bụ na Jizọs  na-eme ka Nna ya, ihe ị ga-agụta ga-enyere gị aka ịmatakwu Jehova nke ọma. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.”—Jọn 14:9.

16. Gịnị ka Jizọs kụziri? Oleekwa ebe o si nweta ihe ndị ọ kụziri?

16 Ọtụtụ ndị kpọrọ Jizọs “Onye Ozizi.” (Jọn 1:38; 13:13) Otu n’ime ihe ndị kacha mkpa ọ kụziri bụ “ozi ọma alaeze ahụ.” Gịnị bụ alaeze a? Ọ bụ ọchịchị Chineke nke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa niile. Ọ ga-emere ndị niile na-erubere Chineke isi ihe ọma. (Matiu 4:23) Ihe niile Jizọs kụziri si n’aka Jehova. Jizọs kwuru, sị: “Ihe m na-ezi abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m.” (Jọn 7:16) Jizọs ma na Jehova chọrọ ka ndị mmadụ nụ ozi ọma bụ́ na Alaeze Chineke ga-achị ụwa.

17. Olee ebe Jizọs kụziri ihe? Gịnị mere o ji gbasie mbọ ike kụziere ndị mmadụ ihe?

17 Olee ebe Jizọs kụziri ihe? Ọ kụziri ihe n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ndị mmadụ, ma n’ime ime obodo ma n’obodo ukwu ma n’obodo nta ma n’ahịa ma n’ụlọ nzukọ ndị Juu ma n’ụlọ ndị mmadụ. Ọ naghị atụ anya ka ndị mmadụ na-achọ ya abịa. Kama, ọ na-achọkarị ha aga. (Mak 6:56; Luk 19:5, 6) Jizọs gbasiri mbọ ike jiri oge ya na ike ya na-akụziri ndị mmadụ ihe. Gịnị mere o ji mee otú a? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na ọ bụ ihe Chineke chọrọ ka o mee nakwa n’ihi na ọ na-erubere Nna ya isi mgbe niile. (Jọn 8:28, 29) Ihe ọzọ mere Jizọs ji zie ndị mmadụ ozi ọma bụ na o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ. (Gụọ Matiu 9:35, 36.) Ọ hụrụ na ndị isi okpukpe ndị Juu anaghị akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Chineke na Alaeze ya. Ọ bụ ya mere o ji chọọ inyere ọtụtụ ndị aka ka ha nụ ozi ọma Alaeze Chineke.

18. Olee àgwà Jizọs nke kacha amasị gị?

 18 Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya, ihe banyere ha na-emetụkwa ya n’obi. Ọ dị obiọma, ọ na-adịkwara ndị mmadụ mfe ịgwa ya okwu. Ọ na-atọdị ụmụaka ụtọ ịbịakwute ya. (Mak 10:13-16) Jizọs na-emere ndị mmadụ ihe ọma mgbe niile. Ọ kpọrọ ikpe na-ezighị ezi na ihe ọjọọ asị. (Matiu 21:12, 13) Jizọs biri n’ụwa n’oge a na-anaghị akwanyere ụmụ nwaanyị ùgwù, na-elegharakwa ha anya. Ma Jizọs kwanyeere ha ùgwù, jirikwa ha kpọrọ ihe. (Jọn 4:9, 27) Jizọs dịkwa umeala n’obi. Dị ka ihe atụ, n’otu mgbede, ọ sara ụkwụ ndịozi ya. Ihe ahụ o mere bụ ihe onye ohu na-eme n’oge ahụ.—Jọn 13:2-5, 12-17.

Jizọs kwusara ozi ọma n’ebe ọ bụla ọ hụrụ ndị mmadụ

19. Olee ihe atụ gosiri na Jizọs ma ihe dị́ ndị mmadụ mkpa nakwa na ọ chọrọ inyere ha aka?

19 Jizọs ma ihe dị́ ndị mmadụ mkpa, ọ chọkwara inyere ha aka. Otú o si jiri ike Chineke nyere ya gwọọ ndị mmadụ ọrịa gosiri na ọ ma ihe dị́ ndị mmadụ mkpa. (Matiu 14:14) Dị ka ihe atụ, otu nwoke onye ekpenta bịakwutere Jizọs, sị ya: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Ahụhụ nwoke ahụ na-ata wutere Jizọs. O meteere ya ebere, chọọkwa inyere ya aka. N’ihi ya, Jizọs matịrị aka ya bitụ nwoke ahụ ma sị ya: “Achọrọ m. Dị ọcha.” Nwoke ahụ gbakere ozugbo. (Mak 1:40-42) Chegodị otú obi ga-adị nwoke ahụ.

Ọ NA-ERUBERE NNA YA ISI MGBE NIILE

20, 21. Olee otú Jizọs si bụrụ onye kacha erubere Chineke isi?

20 Jizọs bụ onye kacha erubere Chineke isi. O rubeere Nna ya isi n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ ma ọ bụ ihe ndị iro ya mere ya. Dị ka ihe atụ, Jizọs  emehieghị mgbe Setan nwara ya. (Matiu 4:1-11) Ụfọdụ ndị ikwu Jizọs ekwetaghị na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ, ha kwukwara na “isi emebiela ya.” Ma, Jizọs akwụsịghị ịrụsi ọrụ Chineke ike. (Mak 3:21) Mgbe ndị iro Jizọs na-emesi ya ike, ọ kwụsịghị irubere Chineke isi, o nweghịkwa mgbe ọ chọrọ imerụ ha ahụ́.—1 Pita 2:21-23.

21 Mgbe Jizọs nọ na-ata ahụhụ, o rubeere Jehova isi ruo ọnwụ. (Gụọ Ndị Filipaị 2:8.) Chegodị ihe o diri n’ụbọchị e gburu ya. A nwụchiri ya, bo ya ebubo na o kwuluru Chineke, ndị ikpe arụrụala amaa ya ikpe ọnwụ, ndị mmadụ achịa ya ọchị, ndị agha ataa ya ahụhụ, kpọgidekwa ya n’osisi. Mgbe  ọ fọrọ obere ka ọ nwụọ, o kwuru, sị: “E mechawo ya!” (Jọn 19:30) N’ụbọchị nke atọ Jizọs nwụrụ, Jehova kpọlitere ya n’ọnwụ ma mee ka ọ bụrụ mmụọ. (1 Pita 3:18) Mgbe izu ole na ole gachara, Jizọs laghachiri n’eluigwe, “nọdụ ala n’aka nri Chineke,” ma chere ka Chineke mee ya Eze.—Ndị Hibru 10:12, 13.

22. Olee olileanya anyị nwere n’ihi na Jizọs rubeere Nna ya isi?

22 Ihe mere anyị ji nwee olileanya ịdị ndụ ebighị n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs otú Jehova chọrọ bụ na Jizọs rubeere Nna ya isi. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú ọnwụ Jizọs ga-esi mee ka anyị dị́ ndụ ebighị ebi.

^ para. 11 A na-akpọ Jehova Nna n’ihi na ọ bụ ya kere ihe niile. (Aịzaya 64:8) Jizọs bụ Ọkpara Chineke n’ihi na ọ bụ Jehova kere ya. A kpọkwara Adam na ndị mmụọ ozi ụmụ Chineke.—Job 1:6; Luk 3:38.