Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE ISII

Ò Nwere Ebe Mmadụ Na-aga ma Ọ Nwụọ?

Ò Nwere Ebe Mmadụ Na-aga ma Ọ Nwụọ?

1-3. Olee ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ ma mmadụ nwụọ, oleekwanụ ihe okpukpe ụfọdụ na-aza ha?

BAỊBỤL gwara anyị na otu ụbọchị, “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Anyị mụtara n’Isi nke Ise na ihe mgbapụta Jehova nyere anyị mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ma, ndị mmadụ ka na-anwụ anwụ. (Ekliziastis 9:5) N’ihi ya, otu n’ime ajụjụ ndị na-echu ndị mmadụ ụra bụ, Ò nwere ebe mmadụ na-aga ma ọ nwụọ?

2 Anyị na-achọkarị ịmata azịza ajụjụ a ma mmadụ nwụnahụ anyị. Anyị nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee ebe ọ gara? Ọ̀ na-ahụ anyị? Ò nwere ike inyere anyị aka? Ò nwere mgbe anyị ga-ahụ ya ọzọ?’

3 Ihe okpukpe dị iche iche na-aza ma a jụọ ha ajụjụ ndị a anaghị abụ otu. Ụfọdụ na-akụzi na ọ bụrụ na ezigbo mmadụ anwụọ, ọ na-aga eluigwe. Ma ajọ mmadụ nwụọ, ya agaa ọkụ ala mmụọ. Ụfọdụ na-asị na mmadụ nwụọ, ya aghọọ mmụọ ma lakwuru ndị ikwu ya nwụrụla anwụ. Ndị ọzọ na-asị na mmadụ nwụọ, ya alọ ụwa.

4. Olee otú ihe ọtụtụ okpukpe na-akụzi gbasara ndị nwụrụ anwụ si yie?

4 E nwere ike ịsị na ihe okpukpe dị iche iche na-akụzi abụghị otu. Ma, o nwere otú ihe ọtụtụ n’ime ha na-akụzi si yie ibe ha. Ha na-akụzi na mmadụ nwụọ, e nwere ihe na-esi onye ahụ n’ime pụọ gaa dịrị ndụ ebe ọzọ. Ma, ọ̀ bụ eziokwu?

 GỊNỊ NA-EME MMADỤ MA Ọ NWỤỌ?

5, 6. Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

5 Jehova ma ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ. Ọ gwara anyị na mmadụ nwụọ, onye ahụ anọkwaghị ndụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ naghị aga ebe ọzọ biri, nọrọ ebe ahụ na-echeta ihe ndị mere ya tupu ya anwụọ. * Mmadụ nwụọ, ọ naghị ahụ ụzọ, ọ naghị anụ ihe, ọ naghịkwa eche echiche.

6 Eze Sọlọmọn dere na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” Ha enweghị ike ịhụ mmadụ n’anya ma ọ bụ kpọọ mmadụ asị. O kwukwara na “ọrụ ma ọ bụ ichepụta ihe ma ọ bụ ihe ọmụma ma ọ bụ amamihe adịghị na Shiol [ya bụ, Ili].” (Gụọ Ekliziastis 9:5, 6, 10.) Baịbụl gwakwara anyị n’Abụ Ọma 146:4, na mmadụ nwụọ, “echiche ya” alaala n’iyi.

IHE JIZỌS KWURU GBASARA ỌNWỤ

Jehova kere ụmụ mmadụ ka ha dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi

7. Gịnị ka Jizọs kwuru gbasara ọnwụ?

7 Mgbe ezigbo enyi Jizọs bụ́ Lazarọs nwụrụ, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra.” Ihe Jizọs na-ekwu abụghị na Lazarọs na-ezu ike nkịtị. Jizọs gwaziri ha na “Lazarọs anwụwo.” (Jọn 11:11-14) Jizọs na-ekwu na ọnwụ yiri ebe mmadụ nọ n’ụra. O kwughị na Lazarọs nọ n’eluigwe ma ọ bụ na ọ lakwuuru ndị ikwu ya nwụrụla anwụ. O kwughịkwa na Lazarọs nọ na-ata ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ma ọ bụ na ọ ga-alọ ụwa ka mmadụ ma ọ bụ anụmanụ. Kama, Lazarọs dị ka onye nọ n’oké ụra. Amaokwu ndị ọzọ na Baịbụl gosiri na ọnwụ dị ka ebe mmadụ nọ n’oké ụra. Baịbụl kwuru na mgbe e gburu Stivin na “ọ dara n’ụra  ọnwụ.” (Ọrụ Ndịozi 7:60) Pọl onyeozi dekwara na ụfọdụ Ndị Kraịst “adawo n’ụra ọnwụ.”—1 Ndị Kọrịnt 15:6.

8. Olee otú anyị si mara na Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-anwụ anwụ?

8 Mgbe Chineke kere Adam na Iv, ò bu n’obi na ha ga-emecha nwụọ? Mbanụ! Jehova kere ha ka ha dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, obi ana-atọ ha ụtọ, ahụ́ agbasiekwa ha ike. Mgbe Jehova kere ụmụ mmadụ, o kere ha ka ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi na-agụ ha agụụ. (Ekliziastis 3:11) Ndị mụrụ ụmụ anaghị achọ ka ụmụ ha kaa nká ma nwụọ. Otú ahụkwa ka Jehova na-achọghị ka anyị kaa nká  ma nwụọ. Ma, ọ bụrụ na Chineke kere anyị ka anyị dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, gịnị mere anyị ji anwụ anwụ?

GỊNỊ MERE NDỊ MMADỤ JI ANWỤ ANWỤ?

9. Gịnị mere o ji bụrụ na iwu Jehova nyere Adam na Iv esighị ike?

9 Jehova gwara Adam n’ogige Iden, sị: “I nwere ike iri mkpụrụ nke osisi ọ bụla dị n’ubi a rijuo afọ. Ma erila mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihi na n’ụbọchị i riri mkpụrụ si na ya, ị ga-anwụrịrị.” (Jenesis 2:9, 16, 17) Iwu a Jehova nyere Adam esighị ike. Jehova rukwara eru ịgwa ya na Iv ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ bụrụ na ha erubere ya isi, ha ga-egosi na ha ghọtara na o ruru eru ịgwa ha ihe ha ga-eme. Ha ga-esikwa otú ahụ kelee ya maka ihe niile o nyere ha.

10, 11. (a) Olee otú Setan si mee ka Adam na Iv nupụrụ Jehova isi? (b) Gịnị mere na o nweghị ezigbo ihe mere Adam na Iv ga-eji nupụrụ Chineke isi?

10 Ọ dị mwute na Adam na Iv họọrọ inupụrụ Jehova isi. Setan jụrụ Iv, sị: “Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?” Iv agwa ya, sị: “Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a. Ma, a bịa n’iri mkpụrụ si n’osisi dị n’etiti ubi a, Chineke sịrị: ‘Unu erila mkpụrụ si na ya, ee e, unu emetụla ya aka ka unu ghara ịnwụ.’”—Jenesis 3:1-3.

11 Setan gwaziri Iv, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị. N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:4-6) Setan chọrọ ka Iv chewe na ọ bụ ya kwesịrị ikpebiri onwe ya ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ọ ghakwaara Iv ụgha mgbe ọ gwara ya na ọ gaghị anwụ ma o nupụrụ Jehova isi. N’ihi ya, Iv riri mkpụrụ osisi ahụ, nyekwa di ya, ya erie. Adam na Iv ma na Jehova gwara ha ka ha ghara iri mkpụrụ osisi ahụ.  Mkpụrụ osisi ahụ ha riri gosiri na ha kpachaara anya nupụ isi n’iwu na-esighị ike Jehova nyere ha. O gosikwara na o nweghị ihe ha ji Nna ha nke eluigwe kpọrọ, bụ́ onye hụrụ ha n’anya. O doro anya na o nweghị ezigbo ihe mere ha ga-eji nupụrụ Chineke isi.

12. Gịnị mere ọ ga-eji ewute Jehova na Adam na Iv nupụụrụ ya isi?

12 Ọ dị mwute na nne na nna anyị mbụ akwanyereghị Onye kere ha ùgwù. Olee otú obi ga-adị gị ma ị gbachaa mbọ zụọ nwa gị, ya enupụrụ gị isi mee ihe ị sị ya emela? Ọ̀ bụ na obi agaghị agbawa gị?

E si n’ájá kee Adam, ọ laghachikwara n’ájá

13. Mgbe Jehova gwara Adam na ‘ọ bụ n’ájá ka ọ ga-alaghachi,’ gịnị ka ihe ahụ ọ gwara ya pụtara?

13 Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, ha tụfuru ohere ha nwere ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Jehova gwara Adam, sị: “N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.” (Gụọ Jenesis 3:19.) Ihe a ọ gwara Adam pụtara na Adam ga-abụghachi ájá. (Jenesis 2:7) Adam mechara nwụọ n’ihi mmehie o mere. Ọ dịghịzi adị.

14. Gịnị mere anyị ji anwụ anwụ?

14 A sị na Adam na Iv rubeere Chineke isi, ha gaara anọ ndụ taa. Ma, ebe ha nupụụrụ Chineke isi ma mee mmehie, ha mechara nwụọ. Mmehie yiri ọrịa ọjọọ anyị butere n’aka nne na nna anyị mbụ. A mụrụ anyị niile ná mmehie, ọ bụ ya mere anyị ji na-anwụ anwụ. (Ndị Rom 5:12) Ma, ọ bụghị ihe  Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ. Ọ chọghị ka ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ọnwụ “onye iro.”—1 Ndị Kọrịnt 15:26.

EZIOKWU NA-EME KA ANYỊ NWERE ONWE ANYỊ

15. Olee otú eziokwu Baịbụl gwara anyị gbasara ndị nwụrụ anwụ si eme ka anyị nwere onwe anyị?

15 Eziokwu Baịbụl kụziiri anyị na–eme ka anyị nwere onwe anyị, ya bụ, ka anyị ghara ikweta ọtụtụ ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu. Baịbụl na-akụziri anyị na ihe anaghị ewute ndị nwụrụ anwụ, ihe anaghịkwa afụ ha ụfụ. Anyị enweghị ike ịgwa ha okwu, ha enweghịkwa ike ịgwa anyị okwu. Anyị enweghị ike inyere ha aka, ha enweghịkwa ike inyere anyị aka. Ha enweghị ike imerụ anyị ahụ́. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ ha ụjọ. Ma, ọtụtụ okpukpe na-ekwu na o nwere ebe ndị nwụrụ anwụ gara nọrọ ndụ, na anyị ga-enyere ndị ahụ nwụrụ anwụ aka ma anyị nye ndị ụkọchukwu ego. Ma, anyị mata ihe bụ́ eziokwu banyere ndị nwụrụ anwụ, anyị agaghị ekweta ụgha a ndị okpukpe na-agha.

16. Olee ụgha ọtụtụ okpukpe na-aghara ndị mmadụ gbasara ndị nwụrụ anwụ?

16 Setan na-eji okpukpe ụgha aghara ndị mmadụ ụgha. O ji ya eme ka ndị mmadụ chee na ndị nwụrụ anwụ ka nọ ndụ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ okpukpe na-akụzi na ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, o nwere ihe na-esi n’ime ya apụ gaa dịrị ndụ ebe ọzọ. Ọ̀ bụ ihe okpukpe ma ọ bụ chọọchị ị na-aga na-akụzi? Ka ọ̀ na-akụziri gị ihe Baịbụl kwuru gbasara ndị nwụrụ anwụ? Setan na-eji ụgha eme ka ndị mmadụ ghara ife Jehova.

17. Olee otú o si bụrụ na ndị na-akụzi na Jehova na-ata ndị mmadụ ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ na-akparị Jehova?

17 Ihe a na-akụzi n’ọtụtụ okpukpe na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-akụzi na ndị ajọ omume  ga-aga ọkụ ala mmụọ na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Ndị na-akụzi ụgha a na-akparị Jehova. O mekataghị kwe ka ndị mmadụ taa ụdị ahụhụ ahụ. (Gụọ 1 Jọn 4:8.) Olee otú obi ga-adị gị ma ị hụ ebe mmadụ weere aka nwa ya tinye n’ọkụ sị na ọ na-ata ya ahụhụ maka ihe ọjọọ o mere? Ọ̀ bụ na ị gaghị asị na obi fere onye ahụ azụ? O doro anya na ị gaghị achọ ka gị na ya bụrụ enyi. Ọ bụ otú ahụ ka Setan chọrọ ka anyị si na-ele Jehova anya.

18. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ịtụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ?

18 Ụfọdụ okpukpe na-akụzi na ndị mmadụ nwụọ, ha aghọọ mmụọ. Ha na-ekwu na anyị kwesịrị ịna-akwanyere ndị mmụọ ahụ ùgwù, na-atụkwa ha ụjọ n’ihi na ha nwere ike bụrụ ezigbo ndị enyi anyị ma ọ bụ ezigbo ndị iro anyị. Ọtụtụ ndị kwetara ụgha a. Ha na-atụ ndị nwụrụ anwụ ụjọ. Ọ bụ ya mere ha ji efe ha kama ife Jehova. Cheta na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, n’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ ha ụjọ. Ọ bụ Jehova kere anyị. Ọ bụ ya bụ ezi Chineke, ọ bụkwa naanị ya ka anyị kwesịrị ife.—Mkpughe 4:11.

19. Olee otú ịmata ihe bụ́ eziokwu gbasara ndị nwụrụ anwụ si enyere anyị aka?

19 Anyị mata ihe bụ́ eziokwu gbasara ndị nwụrụ anwụ, o nweghị onye ga-eji ụgha ndị okpukpe na-agha duhie anyị. Eziokwu a na-enyere anyị aka ịghọta nkwa ọma Jehova kwere anyị banyere ndụ anyị na otú ihe ga-adịrị anyị n’ọdịnihu.

20. Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-esonụ?

20 Ogologo oge gara aga, otu nwoke fere Chineke aha ya bụ Job jụrụ, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ pụrụ ịdị ndụ ọzọ?” (Job 14:14) Ndị nwụrụ anwụ hà nwere ike ịdị ndụ ọzọ n’eziokwu? Ihe Chineke zara anyị na Baịbụl na-eme anyị obi ụtọ. Anyị ga-amụ banyere ya n’isiokwu na-esonụ.

^ para. 5 Ụfọdụ ndị kweere na mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ anaghị anwụ ma mmadụ nwụọ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmata nke bụ́ eziokwu, gụọ ihe nke 17 na nke 18 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

GỤKWUO GBASARA YA

Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Jụọ Gị Ajụjụ Gbasara Ọnwụ

Gụọ gbasara ihe anọ ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ụmụ gị nwere ike ịjụ gị gbasara onye unu nwụrụ anwụ nakwa ihe ga-enyere ha aka idi ọnwụ ya.