Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE ATỌ

Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụmụ Mmadụ?

Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụmụ Mmadụ?

1. Gịnị ka Chineke bu n’obi kee ụmụ mmadụ?

CHINEKE bu ezigbo ihe n’obi kee ụmụ mmadụ. O kere nwoke mbụ na nwaanyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, ka ha biri n’ebe mara mma. Ọ chọrọ ka ha mụta ụmụ, mee ka ụwa niile ghọọ paradaịs, na-elekọtakwa ụmụ anụmanụ.—Jenesis 1:28; 2:8, 9, 15; gụọ ihe nke 6 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

2. (a) Olee otú anyị si mata na Chineke ga-emezu ihe o bu n’obi? (b) Olee ụdị ndị Chineke chọrọ ka ha biri n’ụwa? Afọ ole ka ọ chọrọ ka ha bie na ya?

2 Ì chere na e nwere mgbe ụmụ mmadụ ga-ebi na paradaịs? Jehova gwara anyị, sị: “Ekwuwo m ya; m ga-emekwa ka o mezuo.” (Aịzaya 46:9-11; 55:11) N’eziokwu, Chineke ga-eme ihe o bu n’obi, o nweghịkwa ihe ga-egbochi ya. Jehova kwuru na e nwere ihe mere o ji kee ụwa. O ‘keghị ya n’efu.’ (Aịzaya 45:18) Ọ chọrọ ka ndị mmadụ biri n’ebe niile n’ụwa. Olee ụdị ndị Chineke chọrọ ka ha biri n’ụwa? Afọ ole ka ọ chọrọ ka ha bie na ya? Baịbụl kwuru, sị: “Ndị ezi omume [ma ọ bụ ndị na-erubere Chineke isi] ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”Abụ Ọma 37:29; Mkpughe 21:3, 4.

3. Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ?

3 Ma, ka ọ dị ugbu a, ndị mmadụ na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ. N’ọtụtụ ebe, ndị mmadụ na-alụ agha ma na-egbu ibe ha. O doro anya na ihe a abụghị ihe Chineke  bu n’obi kee ụmụ mmadụ. Gịnị meziri, gịnịkwa kpatara ya? Ọ bụ naanị Baịbụl ga-azali ajụjụ ndị a.

ONYE IRO CHINEKE

4, 5. (a) Ònye ji agwọ gwa Iv okwu n’ogige Iden? (b) Olee otú onye bụbu ezigbo mmadụ nwere ike isi ghọọ onye ohi?

4 Baịbụl gwara anyị na e nwere onye iro Chineke “a na-akpọ Ekwensu na Setan.” Setan ji agwọ gwa Iv okwu n’ogige Iden. (Mkpughe 12:9; Jenesis 3:1) O mere ka o yie ka ọ̀ bụ agwọ ahụ na-agwa Iv okwu.—Gụọ ihe nke 7 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

5 Ma, Chineke ò kere Setan bụ́ Ekwensu? Mba. Otu mmụọ ozi nọ́ n’eluigwe mgbe Chineke kere ụwa ka Adam na Iv biri na ya mere onwe ya Ekwensu. (Job 38:4, 7) Olee otú ụdị ihe a nwere ike isi mee? Olee otú onye bụbu ezigbo mmadụ nwere ike isi ghọọ onye ohi? O nweghị onye a mụrụ, ya abụrụ onye ohi. Kama, mmadụ nwere ike chọwa inweta ihe na-abụghị nke ya. Ọ bụrụ na onye ahụ anọgide na-eche otú ọ ga-esi nweta ihe ahụ, ọchịchọ ọjọọ ahụ ga-esi ike n’obi ya. E nwezie otú o si nweta ohere, ya ezuru ihe ahụ. O sila otú ahụ mee onwe ya onye ohi.—Gụọ Jems 1:13-15; gụọ ihe nke 8 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

6. Olee otú otu mmụọ ozi si ghọọ onye iro Chineke?

6 Ọ bụ ihe a mere mmụọ ozi ahụ. Mgbe Jehova kechara Adam na Iv, ọ gwara ha ka ha mụọ ụmụ ma “jupụta ụwa.” (Jenesis 1:27, 28) Ọ ga-abụ na mmụọ ozi ahụ chere, sị: ‘Ụmụ mmadụ niile nwedịrị ike ịna-efe m kama ịna-efe Jehova.’ Ka ọ na-eche ihe a, ọ gụsiwere ya agụụ ike inweta ihe ruuru Jehova. Mmụọ ozi ahụ chọrọ ka ndị mmadụ fewe ya. N’ihi ya, ọ ghaara Iv ụgha ma ghọgbuo ya. (Gụọ Jenesis 3:1-5.) Ihe a o mere mere ka ọ ghọọ Setan bụ́ Ekwensu na onye iro Chineke.

7. (a) Gịnị mere Adam na Iv ji nwụọ? (b) Gịnịkwa mere anyị ji na-aka nká, na-anwụkwa anwụ?

 7 Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi, rie mkpụrụ osisi Chineke sịrị ha erila. (Jenesis 2:17; 3:6) Ha mehiere Jehova, mechaakwa nwụọ otú ahụ Jehova kwuru na ha ga-anwụ. (Jenesis 3:17-19) Ụmụ Adam na Iv bụ ndị mmehie. N’ihi ya, ha nwụrụ. (Gụọ Ndị Rom 5:12.) Iji ghọta otú ụmụ Adam na Iv si bụrụ ndị mmehie, chebara ihe atụ a echiche. Weregodị ya na iji kom kom kụkpọrọ akụkpọ na-esi maị maị. Maị maị ọ bụla i ji ya sie ga-enwe ebe bara n’ime. Mgbe Adam nupụụrụ Chineke isi, ọ ghọrọ onye mmehie ma ọ bụ onye nwere ebe a kụkpọrọ ya akụkpọ. Ebe anyị bụ ụmụ Adam, anyị niile bụ ndị mmehie, ma ọ bụ ndị nwere ụdị nkụkpọ ahụ Adam nwere. Ọ bụ ya mere anyị ji na-aka nká, na-anwụkwa anwụ.—Ndị Rom 3:23; gụọ ihe nke 9 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

8, 9. (a) Olee ihe Setan chọrọ ka Adam na Iv kweta? (b) Gịnị mere na Jehova egbughị ndị nnupụisi ahụ ozugbo?

8 Setan malitere inupụrụ Jehova isi mgbe o mere ka Adam na Iv nupụrụ Chineke isi. Ọ chọrọ ka Adam na Iv kweta na Jehova bụ onye ụgha nakwa onye ọchịchị ọjọọ na-anaghị achọ ka ihe gaziere ndị ọ na-achị. Ihe Setan na-ekwu bụ na ọ bụghị Chineke kwesịrị ịna-agwa ụmụ mmadụ ihe ha ga na-eme nakwa na Adam na Iv kwesịrị ịna-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Gịnị ka Jehova ga-eme? Ọ gaara egbu ndị nnupụisi ahụ, mee ka a ghara inwe ndị na-enupụrụ ya isi. Ma, igbu ha ọ̀ gaara eme ka a mata na Setan bụ onye ụgha? Mba.

9 N’ihi ya, Jehova egbughị ndị nnupụisi ahụ ozugbo. Kama, ọ hapụrụ ụmụ mmadụ ka ha chịwa onwe ha. Nke a ga-eme ka o doo anya na Setan bụ onye ụgha nakwa na Jehova ma ihe ga-akacha abara ụmụ mmadụ  uru. Anyị ga-amụtakwu gbasara ya n’Isi nke Iri na Otu. Ma, gịnị ka i chere banyere ihe Adam na Iv mere? Hà kwesịrị ikweta ihe Setan gwara ha ma nupụrụ Chineke isi? Ọ bụ Jehova nyere Adam na Iv ihe niile ha nwere. O kere ha, ha ezuo okè, nye ha ebe mara mma ha bi  nakwa ọrụ na-eme ha obi ụtọ. Ma, Setan emetụbereghị ha ihe ọma ọ bụla. A sị na ị nọ ebe ahụ, gịnị ka ị gaara eme?

10. Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi?

10 Taa, onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi onye ọ ga-erubere isi. Ọ bụkwa ihe anyị kpebiri ga-ekpebi ma ànyị ga-adị ndụ. Anyị nwere ike ikpebi irubere Jehova isi dị ka Onye na-achị anyị ma nye aka gosi na Setan bụ onye ụgha. Ma ọ bụ anyị ahọrọ Setan ka ọ chịwa anyị. (Abụ Ọma 73:28; gụọ Ilu 27:11.) Ọtụtụ ndị anaghị erubere Chineke isi n’ụwa a. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị Chineke na-achị ụwa. Ma, ọ bụrụ na ọ bụghị ya na-achị ụwa, ònyezi na-achị ya?

ÒNYE NA-ACHỊ ỤWA?

A sị na ọ bụghị Setan ka alaeze nke ụwa dị n’aka, ọ̀ gaara ekwu na ya ga-enye ya Jizọs?

11, 12. (a) Gịnị ka ihe Setan kwuru na ọ ga-enye Jizọs na-egosi anyị? (b) Olee amaokwu Baịbụl ndị gosiri na ọ bụ Setan na-achị ụwa?

11 Jizọs ma onye na-achị ụwa. N’otu oge, Setan ‘gosiri Jizọs alaeze niile nke ụwa na ebube ha.’ Setan kweziri ya nkwa, sị: “Ihe a niile ka m ga-enye gị ma ọ bụrụ na ị daa n’ala fee m ofufe.” (Matiu 4:8, 9; Luk 4:5, 6) Jụgodị onwe gị, sị: ‘A sị na ọ bụghị Setan ka alaeze ndị ahụ dị n’aka, ọ̀ gaara ekwu na ya ga-enye ya Jizọs?’ Mba. Ọchịchị niile dị Setan n’aka.

12 I nwere ike ịna-eche, sị: ‘Olee otú ọ ga-esi bụrụ Setan na-achị ụwa? Ọ́ bụghị Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, kere eluigwe na ala?’ (Mkpughe 4:11) Ee, ọ bụ ya kere ihe niile. Ma, Jizọs ezoghị ọnụ kpọọ Setan “onye na-achị ụwa a.” (Jọn 12:31; 14:30; 16:11) Pọl onyeozi kpọkwara Setan bụ́ Ekwensu “chi nke usoro ihe a.” (2 Ndị Kọrịnt 4:3, 4) Jọn onyeozi edeekwa na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.”—1 Jọn 5:19.

 OLEE OTÚ A GA-ESI BIBIE ỤWA SETAN?

13. Gịnị mere ụwa ọhụrụ ji dị anyị mkpa?

13 Ụwa a na-aka njọ kwa ụbọchị. N’ebe niile, ọtụtụ ndị na-alụ agha, na-arụrụkwa aka. Ndị mmadụ na-eme ihu abụọ, na-emekwa ihe ike. N’agbanyeghị otú ụmụ mmadụ si agba mbọ, ha agaghị akwụsịli nsogbu ndị a niile. Ma n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi ụwa ọjọọ a n’agha Amagedọn. Ọ ga-ejikwa ụwa ọhụrụ dochie ya.—Mkpughe 16:14-16; gụọ ihe nke 10 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

14. Ònye ka Chineke họọrọ ka ọ bụrụ Eze nke Alaeze ya? Olee amụma Baịbụl buru gbasara Jizọs?

14 Jehova họọrọ Jizọs Kraịst ka ọ bụrụ Eze ga-achị n’Alaeze ya n’eluigwe. Ọtụtụ puku afọ gara aga, Baịbụl buru amụma na Jizọs ga-achị dị ka “Onyeisi Udo” nakwa na ọchịchị ya agaghị enwe ọgwụgwụ. (Aịzaya 9:6, 7) Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere maka ọchịchị ahụ. Ọ sịrị ka ha na-ekpe ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:10) N’Isi nke Asatọ, anyị ga-amụta otú Alaeze Chineke ga-esi nọchie ọchịchị ụwa a. (Gụọ Daniel 2:44.) Mgbe ahụ, Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs mara mma.—Gụọ ihe nke 11 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

ỤWA ỌHỤRỤ DỊ NSO!

15. Gịnị bụ “ụwa ọhụrụ”?

15 Baịbụl kwere nkwa, sị: “E nwere eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ anyị na-echere . . . , ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.” (2 Pita 3:13; Aịzaya 65:17) Mgbe ụfọdụ, Baịbụl kwuo gbasara “ụwa,” ihe ọ na-ekwu bụ ndị bí n’ụwa. (Jenesis 11:1) N’ihi ya, “ụwa ọhụrụ” nke ezi omume bụ ndị niile na-erubere Chineke isi, ndị Chineke gọzikwara.

16. Olee onyinye magburu onwe ya Chineke ga-enye ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ya? Gịnịkwa ka anyị ga-emerịrị iji nweta ya?

 16 Jizọs kwere nkwa na ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ Chineke ga-enweta “ndụ ebighị ebi.” (Mak 10:30) Gịnị ka anyị ga-emerịrị iji nweta onyinye a? Biko gụọ Jọn 3:16 na Jọn 17:3 ka ị chọpụta azịza ya. Ka anyị hụzie otú Baịbụl kwuru ndụ ga-adị mgbe ụwa ga-aghọ Paradaịs.

17, 18. Olee otú anyị si mara na udo ga-adị n’ebe niile n’ụwa nakwa na obi ga-eru anyị ala?

17 Ajọ omume, agha, mpụ, na ime ihe ike agaghịzi adị. E nweghị onye ajọ omume ọ bụla ga-afọ n’ụwa. (Abụ Ọma 37:10, 11) Chineke ga-eme ka “agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.” (Abụ Ọma 46:9; Aịzaya 2:4) Ọ bụ ndị hụrụ Chineke n’anya na ndị na-erubere ya isi ga-ejuzi n’ụwa. Udo ga-adịkwa ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 72:7.

18 Obi ga-eru ndị na-efe Jehova ala. N’oge Baịbụl, mgbe ọ bụla ndị Izrel rubeere Chineke isi, obi na-eru ha ala n’ihi na Chineke na-echebe ha. (Levitikọs 25:18, 19) Na Paradaịs, anyị agaghị atụ ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla ụjọ. Obi ga na-eru anyị ala mgbe niile.—Gụọ Aịzaya 32:18; Maịka 4:4.

19. Gịnị mere obi ga-eji sie anyị ike na nri ga-abụ atụrụ tawa n’ụwa ọhụrụ Chineke?

19 Nri ga-abụ atụrụ tawa. “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.” (Abụ Ọma 72:16) Jehova “bụ́ Chineke anyị ga-agọzi anyị.” “Ala ga-emepụta ihe nke ọma.”—Abụ Ọma  67:6.

20. Olee otú anyị si mara na ụwa ga-aghọ paradaịs?

20 Ụwa niile ga-aghọ paradaịs. Ndị mmadụ ga-enwe ụlọ na ubi mara mma. (Gụọ Aịzaya 65:21-24; Mkpughe 11:18.) Ụwa niile ga-ama mma ka ogige Iden. Jehova ga na-enye anyị ihe niile dị́ anyị mkpa mgbe niile. Baịbụl  kwuru gbasara Jehova, sị: “Ị na-asaghe aka gị, were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.”—Abụ Ọma 145:16.

21. Olee otú anyị si mara na ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ ga-adị n’udo?

21 Ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ ga-adị n’udo. Ụmụ anụmanụ agaghịzi na-emerụ ndị mmadụ ahụ́. Obi ga-eru ụmụaka ala, ha agaghị na-atụ ụmụ anụmanụ ndị na-emerụ ahụ́ ụjọ.—Gụọ Aịzaya 11:6-9; 65:25.

22. Gịnị ka Jizọs ga-emere ndị na-arịa ọrịa?

22 A gaghịzi enwe onye ga-arịa ọrịa. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwọrọ ọtụtụ ndị ọrịa. (Matiu 9:35; Mak 1:40-42; Jọn 5:5-9) Ma ebe Jizọs bụ Eze nke Alaeze Chineke, ọ ga-agwọ mmadụ niile. O nweghịzi onye ga-asị: “Ana m arịa ọrịa.”—Aịzaya 33:24; 35:5, 6.

23. Gịnị ka Chineke ga-emere ndị nwụrụ anwụ?

23 A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Chineke kwere nkwa na ya ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ nwụrụ anwụ. Baịbụl kwuru, sị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Gụọ Jọn 5:28, 29; Ọrụ Ndịozi 24:15.

24. Olee otú obi dị gị na i nwere ike ibi na Paradaịs?

24 Ọ bụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme. Anyị nwere ike ikpebi ịmụ banyere Jehova ma na-efe ya ma ọ bụ anyị ekpebie ịna-eme ihe dị́ anyị mma. Ọ bụrụ na anyị ekpebie ife Jehova, ihe ga-adịrị anyị mma n’ọdịnihu. Mgbe otu nwoke nọ́ n’ọnụ ọnwụ gwara Jizọs ka o cheta ya, Jizọs kwere ya nkwa, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-amụtakwu banyere Jizọs Kraịst nakwa otú ọ ga-esi mee ka ọmarịcha nkwa ndị Chineke kwere anyị mezuo.

GỤKWUO GBASARA YA

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme

Chineke na-akpọ mmadụ niile ka ha bịa mụọ banyere Alaeze ya, ihe Alaeze ya ga-eme na otú ọ ga-eme ka ụwa a dịrị. Lee ihe Baịbụl kwuru banyere ya.