Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE IRI

Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ

Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ

1. Gịnị mere anyị kwesịrị iji mụọ gbasara ndị mmụọ ozi?

JEHOVA chọrọ ka anyị mara gbasara ezinụlọ ya. Ndị mmụọ ozi so ná ndị ezinụlọ ya. Baịbụl kpọrọ ha “ụmụ Chineke.” (Job 38:7) Gịnị bụ ọrụ ndị mmụọ ozi? Olee otú ha si nyere ndị mmadụ aka n’oge gara aga? Oleekwa otú ha si enyere anyị aka n’oge a?—Gụọ ihe nke 8 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

2. (a) Olee otú ndị mmụọ ozi si malite? (b) Ole ka ha dị?

2 Anyị kwesịrị ịmata otú ndị mmụọ ozi si malite. Ndị Kọlọsi 1:16 gwara anyị na mgbe Jehova kechara Jizọs, o si n’aka ya “kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa.” Ndị mmụọ ozi so n’ihe ndị ọzọ ahụ Jehova si n’aka Jizọs kee. Ole ka ha dị? Baịbụl kwuru na ha dị ọtụtụ narị nde.—Abụ Ọma 103:20; Mkpughe 5:11.

3. Gịnị ka Job 38:4-7 gwara anyị gbasara ndị mmụọ ozi?

3 Baịbụl gwakwara anyị na Jehova bu ụzọ kee ndị mmụọ ozi tupu o kee ụwa. Olee otú obi dị ndị mmụọ ozi mgbe Chineke kere ụwa? Akwụkwọ Job kwuru na ha ṅụrịrị ọṅụ. Ndị mmụọ ozi dị n’otu, na-ejekwara Jehova ozi.—Job 38:4-7.

NDỊ MMỤỌ OZI NA-ENYERE NDỊ OHU CHINEKE AKA

4. Olee otú anyị si mara na ndị mmụọ ozi nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ?

4 Kemgbe ụwa, ihe banyere ndị mmadụ na-amasị ndị mmụọ ozi. Ha chọkwara ka ihe Jehova bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ mezuo. (Ilu 8:30, 31; 1 Pita 1:11, 12)  Ọ ga-abụrịrị na o wutere ha mgbe Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi. Ọ ga-abụkwa na isi ọtụtụ ndị na-enupụrụ Jehova ugbu a na-ewute ha karịa. Ma, ọ bụrụ na onye mmehie echegharịa ma fewe Chineke, ha na-aṅụrị ọṅụ. (Luk 15:10) Ndị mmụọ ozi nwere mmasị n’ebe ndị na-efe Chineke nọ. Jehova na-eji ha enyere ndị ohu ya nọ n’ụwa aka ma na-echebe ha. (Hibru 1:7, 14.) Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ Jehova sirila jiri ha mee otú ahụ.

“Chineke m zitere mmụọ ozi ya wee mechie ọnụ ọdụm ndị a.”Daniel 6:22

5. Olee otú ndị mmụọ ozi si nyere ndị ohu Chineke aka n’oge gara aga?

 5 Jehova zigara ndị mmụọ ozi abụọ, ha enyere Lọt na ndị ezinụlọ ya aka ka ha gbapụ mgbe a chọrọ ibibi obodo Sọdọm na Gọmọra. (Jenesis 19:15, 16) Mgbe ọtụtụ narị afọ gachara, a tụbara Daniel onye amụma n’olulu ọdụm. Ma ọkọ akọghị ya n’ihi na ‘Chineke zitere mmụọ ozi ya wee mechie ọnụ ọdụm ndị ahụ.’ (Daniel 6:22) Mgbe Pita onyeozi nọkwa n’ụlọ mkpọrọ, Jehova zitere mmụọ ozi ya, ya akpọpụta ya. (Ọrụ Ndịozi 12:6-11) Ndị mmụọ ozi nyekwaara Jizọs aka mgbe ọ nọ n’ụwa. Dị ka ihe atụ, mgbe e mechara ya baptizim, “ndị mmụọ ozi nọ na-ejere ya ozi.” (Mak 1:13) Obere oge tupu e gbuo ya, otu mmụọ ozi bịakwutere ya ma “mee ka ọ dị ike.”—Luk 22:43.

6. (a) Olee otú anyị si mara na ndị mmụọ ozi na-enyere ndị ohu Chineke aka n’oge anyị a? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle ugbu a?

6 N’oge anyị a, ndị mmụọ ozi anaghịzi apụta ka ndị mmadụ hụ ha. Ma, Chineke ka na-eji ha enyere ndị ohu ya aka. Baịbụl kwuru, sị: “Mmụọ ozi Jehova na-ama ụlọikwuu gburugburu ndị na-atụ egwu ya, ọ na-anapụtakwa ha.” (Abụ Ọma 34:7) Gịnị mere o ji dị mkpa ka e chebe anyị? Ọ bụ n’ihi na anyị nwere ndị iro chọrọ imesi anyị ike. Ole ndị ka ha bụ? Ebee ka ha si? Olee otú ha si achọ imesi anyị ike? Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị tụlee ihe mere obere oge Chineke kechara Adam na Iv.

NDỊ IRO ANYỊ A NA-ANAGHỊ AHỤ ANYA

7. Gịnị ka Setan merela ka ọtụtụ ndị mee?

7 Anyị mụrụ n’Isi nke Atọ n’akwụkwọ a na otu mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi, chọọkwa ịchị ndị ọzọ. Baịbụl kpọrọ ya Setan bụ́ Ekwensu. (Mkpughe 12:9) Setan chọkwara ka ụmụ mmadụ nupụrụ Chineke isi. N’ihi ya, ọ ghọgburu Iv. Ọ ghọgbuokwala ọtụtụ ndị kemgbe  ahụ, ha enupụrụ Jehova isi. Ma, e nwere ndị na-ekweghị eso ya enupụrụ Jehova isi. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ebel, Ịnọk, na Noa.—Ndị Hibru 11:4, 5, 7.

8. (a) Olee otú ndị mmụọ ozi ụfọdụ si ghọọ ndị mmụọ ọjọọ? (b) Gịnị ka ndị mmụọ ọjọọ ahụ mere ka ha ghara ịnwụ n’Iju Mmiri?

8 N’oge Noa, ụfọdụ ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi. Ha hapụrụ eluigwe ma bịa n’ụwa biri ka mmadụ. Gịnị mere ha ji mee otú ahụ? Baịbụl kwuru na ha chọrọ ịlụ nwaanyị. (Gụọ Jenesis 6:2.) Ma, ndị mmụọ ozi ekwesịghị ịlụ nwaanyị. (Jud 6) Ọtụtụ ndị n’oge ahụ bịaziri na-eme ka ndị mmụọ ozi ahụ, na-eme omume rụrụ arụ, na-emekwa ihe ike. Nke a mere ka Jehova jiri Iju Mmiri bibie ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ. Ma, o chebere ndị na-eme uche ya. (Jenesis 7:17, 23) Iju Mmiri ahụ egbughị ndị mmụọ ozi ahụ nupụụrụ Chineke isi, kama, ha laghachiri n’eluigwe. Baịbụl na-akpọ ha ndị mmụọ ọjọọ. Ha sonyeere Ekwensu, ya aghọzie onye na-achị ha.—Matiu 9:34.

9. (a) Gịnị ka Jehova mere ndị mmụọ ọjọọ ahụ mgbe ha laghachiri eluigwe? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ gbasara ndị mmụọ ọjọọ?

9 Jehova anabataghị ndị mmụọ ozi ahụ nupụụrụ ya isi ka ha sorokwa n’ezinụlọ ya. (2 Pita 2:4) Ha enweghịzi ike ịghọ mmadụ. Ma, ha ka “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9; 1 Jọn 5:19) Ka anyị mụọ otú ha si aghọgbu ma ọ bụ na-eduhie imeriime mmadụ.—Gụọ 2 Ndị Kọrint 2:11.

OTÚ NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ SI EDUHIE NDỊ MMADỤ

10. Olee ụzọ ndị mmụọ ọjọọ na-esi eduhie ndị mmadụ?

10 Ndị mmụọ ọjọọ na-esi ụzọ dị iche iche eduhie ndị mmadụ. Otu n’ime ụzọ ndị ahụ bụ ime ka ndị mmadụ na-efe ha ma ọ bụ na-eme mgbaasị. Mgbaasị bụ mmadụ ịjụ ndị mmụọ ọjọọ ase ma ọ bụ mmadụ isi n’aka onye ọzọ, dị ka dibịa afa, jụọ ha ase. Baịbụl gwara anyị etinyekwala aka n’ihe ọ bụla gbasara ndị mmụọ ọjọọ.  (Ndị Galeshịa 5:19-21) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na otú ahụ dinta na-esi eji ọnyà amata anụmanụ ka ndị mmụọ ọjọọ na-esikwa eji aghụghọ enweta ndị mmadụ, na-agwazi ha ihe ha ga-eme.—Gụọ ihe nke 26 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

11. Gịnị bụ ịgba afa, gịnịkwa mere na anyị ekwesịghị itinye aka na ya?

11 Ụzọ ọzọ ndị mmụọ ọjọọ na-esi eduhie ndị mmadụ bụ ime ka ha na-agba afa. Gịnị bụ ịgba afa? Ọ bụ mmadụ iji ike ndị mmụọ ọjọọ achọ ịmata banyere ọdịnihu ma ọ bụ banyere ihe a na-amaghị ama. Otú ndị ụfọdụ si agba afa bụ ịgụ kpakpando, ịgụ akara aka, na ịkọwa nrọ. Ọtụtụ ndị chere na o nweghị ihe ihe ndị a mere, ma ọ bụghị eziokwu. Ha na-etinye mmadụ ná nsogbu. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kọrọ na ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ na-enye ndị na-agba afa ike. Ọrụ Ndịozi 16:16-18 gwara anyị na otu “mmụọ ọjọọ nke a na-ajụta ase” nyeere otu nwa agbọghọ aka ‘ịna-akọ ọdịnihu.’ Mgbe Pọl onyeozi chụpụchara mmụọ ọjọọ ahụ n’ime ya, o nweghịzi ike ịkọ ọdịnihu.

12. Gịnị mere na mmadụ na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ikwurịta okwu? (b) Olee ihe mere ndị ohu Chineke anaghị eme omenala ndị si n’aka ndị mmụọ ọjọọ?

12 Ndị mmụọ ọjọọ na-esikwa n’ụzọ ọzọ eduhie ndị mmadụ. Ha na-eme ka anyị chee na anyị nwere ike ịgwa ndị nwụrụ anwụ okwu nakwa na ndị nwụrụ anwụ ka dị ndụ n’ebe ọzọ. Ha na-emekwa ka anyị chee na ndị nwụrụ anwụ nwere ike ịgwa anyị okwu ma ọ bụkwanụ mesie anyị ike. Dị ka ihe atụ, onye mmadụ nwụnahụrụ nwere ike ịgakwuru dibịa sịrị na ya nwere ike ịgwa ndị nwụrụ anwụ okwu. Dibịa ahụ nwere ike ịgwa ya ihe ụfọdụ banyere onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụkwanụ mee ka ọ nụ olu yiri olu onye ahụ nwụrụ anwụ. (1 Samuel 28:3-19) Ọ bụ ya mere ndị mmadụ ji eme omenala dị  iche iche mgbe ha na-eli ozu, n’ihi na ha kweere na ndị nwụrụ anwụ ka dị ndụ n’ebe ọzọ. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịmụrụ onye nwụrụ anwụ anya abalị, ịkwa ozu, ime ememme e ji echeta ndị nwụrụ anwụ, ịchụrụ ndị nwụrụ anwụ àjà, na ịgba mkpe. Omenala ndị a si n’aka ndị mmụọ ọjọọ. Ọ bụrụ Onye Kraịst ajụ ime ha, ndị ezinụlọ ya na ndị obodo ya nwere ike ịna-akatọ ya, na-akparị ya, ma ọ bụ kwụsị iso ya na-emekọ ihe. Ma, Ndị Kraịst maara na ndị nwụrụ anwụ anwụchaala, ha adịghịkwa ndụ ebe ọzọ. Ọ bụ ya mere na mmadụ na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike ikwurịta okwu. Ndị nwụrụ anwụ enweghịkwa ike imerụ ndị dị ndụ ahụ́. (Abụ Ọma 115:17) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya. Ya adịkwala mgbe anyị ga-achọ iso ndị nwụrụ anwụ ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ kwurịta okwu ma ọ bụ na-eme omenala ndị si n’aka ndị mmụọ ọjọọ.—Gụọ Diuterọnọmi 18:10, 11; Aịzaya 8:19.

13. Gịnị ka ọtụtụ ndị na-atụbu ndị mmụọ ọjọọ ụjọ merela?

13 Ndị mmụọ ọjọọ na-eduhie ndị mmadụ, ma na-emenye ha egwu. Taa, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ma na ha nwere naanị “oge dị mkpirikpi” tupu Chineke ewepụ ha n’ụwa a. Ọ bụ ya mere ha ji akpa ike ugbu a karịa n’oge mbụ. (Mkpughe 12:12, 17) N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ puku mmadụ na-atụbu ndị mmụọ ọjọọ ụjọ akwụsịla ịtụ ha ụjọ. Olee otú ha si kwụsị ya?

IHE NDỊ ANYỊ GA-EME KA NDỊ MMỤỌ ỌJỌỌ GHARA INWETA ANYỊ NA OTÚ ANYỊ GA-ESI PỤỌ N’AKA HA

14. Gịnị ka Ndị Kraịst nọ́ n’Efesọs n’oge ndịozi Jizọs mere nke anyị kwesịkwara ime ma anyị chọọ ịpụ n’aka ndị mmụọ ọjọọ?

14 Baịbụl gwara anyị ihe anyị ga-eme ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta anyị na otú anyị ga-esi pụọ n’aka ha ma ọ bụrụ na anyị na ha na-emekọrịta ihe. Dị ka ihe atụ,  ụfọdụ ndị nọ n’Efesọs na ndị mmụọ ọjọọ na-emekọrịta ihe tupu ha amata eziokwu. Gịnị ka ha mere ka ha na ndị mmụọ ọjọọ kwụsị ịna-emekọrịta ihe? Baịbụl kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị na-eme anwansi chịkọtara akwụkwọ ha ma kpọọ ha ọkụ n’ihu mmadụ niile.” (Ọrụ Ndịozi 19:19) Ihe mere ha ji kpọọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ bụ na ha chọrọ ịghọ Ndị Kraịst. Ihe a ha mere bụ ihe ndị chọrọ ịghọ Ndị Kraịst taa kwesịrị ime. Ndị niile chọrọ ife Jehova kwesịrị ịkpọ ihe niile gbasara ndị mmụọ ọjọọ ọkụ. Ihe ndị ahụ nwere ike ịbụ akwụkwọ, fim, foto, egwú, na ihe ndị ọzọ na-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị ime mgbaasị, ndị na-emekwa ka ime mgbaasị yie ka ọ̀ dị mma. Ihe ọzọ ha ga-akpọ ọkụ bụ ọtụmọkpọ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ha ji echebe onwe ha.—1 Ndị Kọrịnt 10:21.

15. Gịnị ọzọ ka anyị kwesịrị ime ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ghara inweta anyị?

15 Mgbe Ndị Kraịst nọ n’Efesọs kpọchara akwụkwọ ha ji eme mgbaasị ọkụ, afọ ole na ole agaa, Pọl onyeozi degaara ha akwụkwọ ozi. Ọ gwara ha na ha ka nwere “mgba” ma ọ bụ ọgụ “megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ.” (Ndị Efesọs 6:12) Ọ bụ eziokwu na ha akpọọla akwụkwọ ha ọkụ, ndị mmụọ ọjọọ ka na-agbalị inweta ha. N’ihi ya, gịnị ọzọ ka Ndị Kraịst ahụ kwesịrị ime? Pọl gwara ha, sị: “Karịsịa ihe niile, burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe, nke unu ga-eji nwee ike imenyụ [ma ọ bụ ịkwụsị] akụ́ uta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.” (Ndị Efesọs 6:16) Otú ahụ ọta na-echebe onye agha ka okwukwe anyị nwere ike ichebe anyị. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi anyị niile na ọ ga-echebe anyị, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agaghị enweta anyị.—Matiu 17:20.

16. Olee otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị nwere na Jehova sikwuo ike?

16 Oleekwanụ otú anyị ga-esi mee ka okwukwe anyị  nwere na Jehova sikwuo ike? Ọ bụ ịna-amụ Baịbụl kwa ụbọchị na ịtụkwasị ya obi na ọ ga-echebe anyị. Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi anyị niile, o nweghị ihe Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-eme anyị.—1 Jọn 5:5.

17. Gịnị ọzọ ka anyị ga-eme ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta anyị?

17 Gịnị ọzọ ka Ndị Kraịst nọ n’Efesọs ga-eme ka ndị mmụọ ọjọọ ghara inweta ha ebe ha bi n’obodo ọtụtụ ndị na-efe ndị mmụọ ọjọọ. Pọl gwara ha ka ha “na-anọgide n’ekpere n’oge niile.” (Ndị Efesọs 6:18) Ha kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka ọ na-echebe ha mgbe niile. Oleekwanụ maka anyịnwa? Anyị bikwa n’ụwa ọtụtụ ndị na-efe ndị mmụọ ọjọọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-arịọ Jehova ka o chebe anyị. Anyị kwesịkwara ịna-akpọ Jehova aha n’ekpere. (Gụọ Ilu 18:10.) Ọ bụrụ na anyị ana-arịọ Jehova ka ọ napụta anyị n’aka Setan, ọ ga-anụ ekpere anyị.—Abụ Ọma 145:19; Matiu 6:13.

18, 19. (a) Olee otú anyị ga-esi merie Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya? (b) Olee ajụjụ anyị ga-aza n’isiokwu na-eso nke a?

18 Ọ bụrụ na anyị ebibie ihe niile gbasara ndị mmụọ ọjọọ ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-echebe anyị, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agaghị enweta anyị. Anyị ekwesịghị ịtụ ha ụjọ. (Gụọ Jems 4:7, 8.) Jehova ka ndị mmụọ ọjọọ ike. O mesiri ha ike n’oge Noa, ọ ga-ebibikwa ha n’ọdịnihu. (Jud 6) Cheta na Jehova nọnyeere anyị n’ọgụ anyị na-alụso ndị mmụọ ọjọọ. O jikwa ndị mmụọ ozi ya na-echebe anyị. (2 Ndị Eze 6:15-17) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka imeri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya.—1 Pita 5:6, 7; 2 Pita 2:9.

19 Ma, ebe ọ bụ na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-eme ka ndị mmadụ na-atagbu onwe ha n’ahụhụ, gịnị mere Chineke ka ji gba ha nkịtị? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso nke a.