Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE IRI NA ITOOLU

Nọrọ Jehova Nso

Nọrọ Jehova Nso

1, 2. Ònye ga-echebe anyị taa?

WEREGODỊ ya na ị na-aga n’ụzọ otu ụbọchị, ifufe efewe, ihu ígwé agbajie, àmụ̀mà egbuwe, égbè eluigwe ana-agba. Obere oge, ezigbo mmiri ebido zowe, gị ebido legharịwa anya ka ị mara ma ị̀ ga-ahụ ebe ị ga-agbaba. O doro anya na obi ga-atọ gị ezigbo ụtọ ma i mechaa hụ ụlọ siri ike ị ga-agbaba n’ime ya.

2 Ebe niile na-agba ghara ghara taa. Ihe na-akazi njọ kwa ụbọchị. I nwere ike ịna-eche otú a ga-esi echebe gị. Otu ọbụ abụ só dee Baịbụl kwuru, sị: “M ga-asị Jehova: ‘Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m ga-atụkwasị obi.’” (Abụ Ọma 91:2) N’eziokwu, Jehova ga-echebeli anyị taa, o kwekwala nkwa ime ka nsogbu anyị niile bie n’ọdịnihu.

3. Olee ihe anyị ga-eme ma anyị chọọ ka Jehova chebe anyị?

3 Olee otú Jehova ga-esi echebe anyị? O nwere ike inyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ma nsogbu bịara anyị. Ọ dịkwa ike karịa onye ọ bụla ga-achọ ịkpatara anyị nsogbu. Ọ bụrụgodị na ọdachi dakwasịrị anyị ugbu a, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-eme ka anyị nwere onwe anyị n’ọdịnihu. Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘nọrọ n’ịhụnanya Chineke.’ (Jud 21) Anyị kwesịrị ịnọ Jehova nso ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka o nyere anyị aka ma ihe siere anyị ike. Ma, olee otú anyị ga-esi nọrọ ya nso?

HỤ JEHOVA N’ANYA OTÚ O SI HỤ GỊ N’ANYA

4, 5. Olee ihe ndị Jehova merela iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya?

4 Ọ bụrụ na anyị amata otú Jehova hụruru anyị  n’anya, ọ ga-enyere anyị aka ịnọ ya nso. Chegodị gbasara ihe ọma niile Jehova meere anyị. O nyere anyị ụwa a mara mma, nyekwa anyị ọtụtụ ọmarịcha osisi na anụmanụ ndị dị n’ime ya. Ọ bụkwa ya na-enye anyị nri dị́ ụtọ anyị na-eri nakwa mmiri dị́ ọcha anyị na-aṅụ. Jehova ejirikwala Baịbụl gwa anyị aha ya na ọmarịcha àgwà ndị o nwere. Ihe ọma kachanụ o meere anyị, nke gosikwara na ọ hụrụ anyị n’anya, bụ izite Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, bụ́ Jizọs, n’ụwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà maka anyị. (Jọn 3:16) Ọ bụkwa àjà ahụ ọ chụrụ mere ka anyị nwee olileanya na ihe ga-adịrị anyị mma n’ọdịnihu.

5 Jehova ehiwela otu ọchịchị a na-akpọ Alaeze Mesaya. Alaeze a dị n’eluigwe, ọ ga-emekwa ka ahụhụ niile anyị na-ata kwụsị n’oge na-adịghị anya. Alaeze a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, udo adịrị ebe niile, onye ọ bụla ana-enwekwa obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi. (Abụ Ọma 37:29) Ihe ọzọ Jehova mere iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ na ọ gwara anyị otú kacha mma anyị ga-esi na-ebi ndụ ugbu a, ya abaara anyị uru. Ọ gwakwara anyị ka anyị na-ekpegara ya ekpere, ọ dịkwa njikere mgbe ọ bụla ịnụ ekpere anyị. Jehova egosila na ọ hụrụ onye ọ bụla n’ime anyị n’anya.

6. Olee ihe i kwesịrị imere Jehova maka otú o si hụ gị n’anya?

6 Olee ihe i kwesịrị imere Jehova maka otú a o si hụ gị n’anya? Na-ekele ya maka ihe ọma niile o meere gị. Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị taa anaghị ekele onye meere ha ihe ọma. Ọ bụkwa otú ọ dị n’oge Jizọs. O nwere mgbe Jizọs gwọrọ ndị ekpenta iri, ma ọ bụ naanị otu onye bịara kelee ya. (Luk 17:12-17) Anyị kwesịrị ịna-eme ka nwoke ahụ kelere Jizọs. Anyị kwesịrị ịna-ekele Jehova mgbe niile.

7. Olee otú anyị kwesịrị ịhụru Jehova n’anya?

 7 Anyị kwesịkwara igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha jiri obi ha dum, mkpụrụ obi ha dum, na uche ha dum hụ Jehova n’anya. (Gụọ Matiu 22:37.) Gịnị ka ihe a ọ gwara ha pụtara?

8, 9. Olee otú anyị ga-esi gosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya?

8 Ọ̀ bụ anyị kwuo na anyị hụrụ Jehova n’anya, okwu ebie? Mba. Ọ bụrụ na anyị ji obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, na uche anyị dum hụ Jehova n’anya, anyị ga na-eme ihe ndị gosiri na anyị hụrụ ya n’anya. (Matiu 7:16-20) Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụrụ na anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị ga-edebe iwu ya. Idebe iwu Chineke ò siri ike? Mba. Ihe Jehova “nyere n’iwu adịghị arọ.”—Gụọ 1 Jọn 5:3.

9 Anyị ga na-enwe obi ụtọ, obi ana-erukwa anyị ala ma anyị na-erubere Jehova isi. (Aịzaya 48:17, 18) Ma, olee ihe ga-enyere anyị aka ịnọ Jehova nso? Ka anyị chọpụta.

NA-ABỊARUKWU JEHOVA NSO

10. Gịnị mere i kwesịrị iji na-amụtakwu gbasara Jehova?

10 Olee otú i si ghọọ enyi Jehova? Baịbụl ị na-amụ enyerela gị aka ịmatakwu Jehova, gị na ya abịakwa dịrị ná mma. Adịm ná mma gị na ya kwesịrị ịdị ka ọkụ ị na-achọghị ka ọ nyụọ. Otú ahụ i si esonye nkụ n’ọkụ ka ọ na-enwu, ka i kwesịkwara isi na-amụtakwu gbasara Jehova ka gị na ya nwee ike ịna-adịkwu ná mma.—Ilu 2:1-5.

Otú ahụ i si esonye nkụ n’ọkụ ka ọ na-enwu, ka i kwesịrị isi na-eme ka gị na Jehova na-adịkwu ná mma

11. Olee otú ihe ị na-amụta na Baịbụl na-adị gị?

11 Ka ị na-amụkwu Baịbụl, ị ga-amụta ọtụtụ ihe ga-eru gị n’obi. Legodị ihe mmadụ abụọ na-eso ụzọ Jizọs kwuru gbasara otú obi dị ha mgbe Jizọs nọ na-akọwara ha ụfọdụ amụma ndị dị na Baịbụl. Ha sịrị: “Ọ̀ bụ na obi ekporoghị anyị ọkụ mgbe ọ nọ na-agwa anyị okwu n’okporo ụzọ, mgbe ọ nọ na-akọwara anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma?”—Luk 24:32.

12, 13. (a) Olee ihe nwere ike ime ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ? (b) Olee otú anyị ga-esi eme ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ ghara ịjụ oyi?

 12 O nwere ike ịbụ na mgbe i bidoro ịghọta ihe dị́ na Baịbụl, o ruru gị nnọọ n’obi otú ahụ o ruru ndị na-eso ụzọ Jizọs. O mere ka ị matakwuo Jehova ma hụ ya n’anya. I kwesịghị ikwe ka ịhụnanya a jụọ oyi.—Matiu 24:12.

13 Ebe gị na Chineke bụzi enyi, i kwesịrị ịgba mbọ mee ka unu na-adịkwu ná mma. I kwesịrị ịna-amụtakwu gbasara Jehova na Jizọs, na-echebara ihe ndị ị na-amụta echiche, na-echekwa gbasara otú ị ga-esi na-eme ha. (Jọn 17:3) Mgbe ị na-agụ Baịbụl ma ọ bụ mgbe ị na-amụ ya, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka ebe a m gụrụ na-akụziri m gbasara Jehova Chineke? Gịnị ka m mụtara mere m ji kwesị iji obi m dum na mkpụrụ obi m dum hụ ya n’anya?’—1 Timoti 4:15.

14. Olee otú ikpe ekpere ga-esi eme ka anyị na-ahụkwu Jehova n’anya?

 14 Ọ bụrụ na gị na enyi gị na-ekwurịta okwu mgbe ọ bụla, ọ ga-eme ka unu na-adịkwu ná mma. Ọ bụrụkwa na anyị ana-ekpegara Jehova ekpere mgbe niile, anyị na ya ga na-adịkwu ná mma. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:17.) Ọ bụ ihe ọma pụrụ iche ka Nna anyị nke eluigwe meere anyị kwe ka anyị na-ekpegara ya ekpere. Anyị kwesịrị isi n’ala ala obi anyị na-ekpegara ya ekpere. (Abụ Ọma 62:8) Anyị ekwesịghị ịna-ekpe ekpere anyị bu n’isi, kama, anyị kwesịrị ịna-agwa Chineke obi anyị. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-amụ Baịbụl, na-esikwa n’ala ala obi anyị ekpegara Chineke ekpere, anyị ga na-ahụkwu ya n’anya.

NA-AKỌRỌ NDỊ ỌZỌ GBASARA JEHOVA

15, 16. Olee otú i si were ikwusa ozi ọma?

15 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọ Jehova nso, anyị kwesịrị ịna-akọrọ ndị ọzọ ihe anyị na-amụta. Ịkọrọ ndị ọzọ gbasara Jehova bụ ihe ùgwù pụrụ iche. (Luk 1:74) Jizọs kwuru na ezigbo Ndị Kraịst niile kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ì bidola ikwusa ozi ọma?—Matiu 24:14; 28:19, 20.

16 Pọl onyeozi weere ikwusa ozi ọma ka ọrụ pụrụ iche. Ọ kpọrọ ya “akụ̀.” (2 Ndị Kọrịnt 4:7) Ịkọrọ ndị ọzọ gbasara Jehova na nzube ya bụ ọrụ kacha mkpa ị ga-arụ. Ọ bụ otu ụzọ i si efe Jehova, o jikwa ihe ị na-emere ya kpọrọ ihe. (Ndị Hibru 6:10) Ikwusa ozi ọma ga-abara ma gị ma ndị ị na-ekwusara ya uru, n’ihi na ọ ga-eme ka gị na ha bịarukwuo Jehova nso, meekwa ka unu nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:58.) Ò nwere ọrụ ọzọ ị ga na-arụ nweta ihe ọma ndị a?

17. Gịnị mere ikwusa ozi ọma ji dị ezigbo mkpa?

 17 Ikwusa ozi ọma dị ezigbo mkpa ugbu a n’ihi na oge adịghịzi. Anyị kwesịrị ‘iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa okwu Chineke.’ (2 Timoti 4:2) Ndị mmadụ kwesịrị ịnụ gbasara Alaeze Chineke. Baịbụl kwuru, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso. Ọ dị nso, o jikwa oké ọsọ na-abịa.” Ọgwụgwụ ụwa a ‘agaghị anọ ọdụ’ ya abịa. (Zefanaya 1:14; Habakọk 2:3) N’eziokwu, obere oge ugbu a, Jehova ga-ebibi ụwa ọjọọ Setan. Ma tupu ya ebibie ya, e kwesịrị ịgwa ndị mmadụ gbasara ya ka ha nwee ike ikpebi ma hà ga-efe Jehova.

18. Gịnị mere anyị na ezigbo Ndị Kraịst ibe anyị kwesịrị iji na-efekọ Jehova ọnụ?

18 Jehova chọrọ ka anyị na ezigbo Ndị Kraịst ibe anyị na-efekọ ya ọnụ. Baịbụl sịrị: ‘Ka anyị na-echebara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka anyị na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.’ (Ndị Hibru 10:24, 25) Anyị kwesịrị ịna-eme ike anyị niile ka anyị ghara ịhapụ ọmụmụ ihe anyị ọ bụla. Anyị gaa ọmụmụ ihe, anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa ka okwukwe onye ọ bụla n’ime anyị sikwuo ike.

19. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịhụ ụmụnna anyị n’anya?

19 Ị na-aga ọmụmụ ihe, ị ga-ahụ ndị hụrụ gị n’anya ga-enyere gị aka ịna-efe Jehova. Ị ga-ahụ ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị, ma ụmụaka ma ndị agadi, ndị ji obi ha dum na-efe Chineke ka gịnwa. Ha ezughị okè otú ahụ gịnwa na-ezughị. Ha mejọọ gị, gbaghara ha. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13.) Na-elekwasị anya n’àgwà ọma ndị ụmụnna gị nwere. Ọ ga-eme ka ị hụ ha n’anya, meekwa ka ị bịarukwuo Jehova nso.

 NDỤ NKE BỤ́ NDỤ N’EZIE

20, 21. Gịnị bụ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”?

20 Jehova chọrọ ka ndị niile ya na ha dị ná mma na-ebi ndụ otú ga-akacha abara ha uru. Baịbụl gwara anyị na ndụ anyị ga-adị n’ọdịnihu ga-adị ezigbote iche ná ndụ anyị na-adị taa.

Jehova chọrọ ka ị dị “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” Ị̀ ga-achọ ịdị?

21 N’ọdịnihu, anyị agaghịzi na-adị ndụ naanị afọ iri asaa ma ọ bụ iri asatọ, kama, anyị ga-adị “ndụ ebighị ebi.” Ụwa niile ga-aghọ paradaịs. Anyị agaghịzi na-arịa ọrịa, udo ga-adị ebe niile, anyị ga na-enwekwa obi ụtọ mgbe niile. Ọ bụ ya ka Baịbụl kpọrọ “ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” Jehova kwere nkwa inye anyị ndụ a nke bụ́ ndụ n’ezie. Ma, anyị ga-emerịrị ike anyị niile ugbu a iji ‘jidesie ya aka ike.’—1 Timoti 6:12, 19.

22. (a) Olee otú anyị ga-esi “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”? (b) Gịnị mere na o nweghị otú anyị ga-agbaru ná mbọ, a sị na e kwesịrị iji ndụ ebighị ebi kwụọ anyị ụgwọ?

22 Olee otú anyị ga-esi “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie”? Anyị ga ‘na-arụ ọrụ ọma, bụrụkwa ọgaranya n’ezi ọrụ.’ (1 Timoti 6:18) Ọ pụtara na anyị ga na-eme ihe anyị na-amụta na Baịbụl. Ma, ọ bụghị mbọ anyị gbara ga-eme ka anyị nweta ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie. O nweghị otú anyị ga-agbaru ná mbọ, a sị na e kwesịrị iji ndụ ebighị ebi kwụọ anyị ụgwọ. Ọ bụ onyinye Jehova na-enye ndị ji obi ha niile na-efe ya, bụrụkwa otu n’ime ụzọ o si egosi anyị ‘obiọma ya na-erughịrị anyị.’ (Ndị Rom 5:15) Nna anyị nke eluigwe chọsiri ike inye ndị ji obi ha niile na-efe ya onyinye a.

23. Gịnị mere i kwesịrị iji mee ezigbo mkpebi ugbu a?

23 Jụọ onwe gị, sị, ‘Àna m efe Chineke otú ọ chọrọ?’ Ọ bụrụ na ị chọpụta na ọ ka nwere ebe i kwesịrị imezikwu ihe ná ndụ gị, mezie ya ozugbo. Anyị tụkwasị Jehova obi ma na-agbasi mbọ ike na-erubere ya isi, Jehova ga-echebe  anyị. Ọ ga-echebe ndị ya niile mgbe ọ ga-ebibi ụwa Setan. Jehova ga-eme ka anyị biri na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi otú ahụ o kwere anyị ná nkwa. O doro anya na ị ga-adị ndụ nke bụ́ ndụ n’ezie ma i mee ezigbo mkpebi ugbu a.

GỤKWUO GBASARA YA