Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE IRI NA ISII

Kpebie Ife Chineke Otú Ọ Chọrọ

Kpebie Ife Chineke Otú Ọ Chọrọ

1, 2. Olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ onwe gị, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka ị jụọ onwe gị ajụjụ ndị a?

KEMGBE ị mụwara Baịbụl, ị mụtala na ọtụtụ ndị sị́ na ha na-efe Chineke na-akụzi ma ọ bụ na-eme ihe ndị Chineke kpọrọ asị. (2 Ndị Kọrịnt 6:17) Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa anyị ka anyị si n’okpukpe ụgha, ya bụ “Babịlọn Ukwu ahụ,” pụta. (Mkpughe 18:2, 4) Gịnị ka ị ga-eme? Onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi ihe ọ ga-eme. Anyị ga-ajụkwa onwe anyị, sị, ‘M̀ chọrọ ife Chineke otú ọ chọrọ ka m si na-efe ya, ka m̀ chọrọ ịna-efe ya otú m sibu na-efe ya?’

2 Ọ bụrụ na ị hapụla okpukpe ụgha ị nọbu na ya, ihe i mere dị mma. Mana, o nwere ike ịbụ na ọ ka nwere ihe ụfọdụ, ma ọ bụ ememme ụfọdụ, okpukpe ụgha na-eme ị ka na-eme. Ka anyị lebatụ anya n’ụfọdụ n’ime ha ma hụ ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-ele ha anya otú Jehova si ele ha.

IHE OYIYI NA IFE NDỊ NNA OCHIE NWỤRỤ ANWỤ

3. (a) Gịnị mere o nwere ike iji siere ụfọdụ ndị ike ịkwụsị iji ihe oyiyi na-efe Chineke? (b) Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere iji ihe oyiyi na-efe Chineke?

3 Ụfọdụ ndị ejirila ihe oyiyi, ihe a pịrị apị, na ihe a kpụrụ akpụ na-efe Chineke kemgbe ọtụtụ afọ. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ndị a, o nwere ike ịdị gị ka mmadụ agaghị efeli Chineke ma o jighi ha. I nwedịrị ike iche na ọ dị njọ ma ọ bụrụ na mmadụ anaghị eji ihe oyiyi efe Chineke. Mana, cheta na ọ bụ Jehova ga-agwa anyị otú anyị kwesịrị isi na-efe ya. Baịbụl gwara anyị hoo haa na Jehova achọghị ka anyị jiri ihe oyiyi na-efe ya ofufe.—Gụọ Ọpụpụ 20:4, 5; Abụ Ọma 115:4-8; Aịzaya 42:8; 1 Jọn 5:21.

4. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị ife ndị nna nna anyị hà nwụrụ anwụ ofufe? (b) Gịnị mere Jehova ji gwa ndị ohu ya ka ha ghara ịchọ otú ha na ndị nwụrụ anwụ ga-esi na-ekwurịta okwu?

 4 Ụfọdụ na-eme ihe niile ha nwere ike ime iji mee ka obi dị ndị nna ha ochie nwụrụ anwụ mma. Ha nwedịrị ike ịna-efe ha ofufe. Mana, anyị amụtala na ndị nwụrụ anwụ enweghị ike inyere anyị aka, ha enweghịkwa ike imerụ anyị ahụ́. E nweghị ebe ọzọ ha dị ndụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na mmadụ ịchọ otú ọ ga-esi agwa ndị nwụrụ anwụ okwu nwere ike itinye ya ná nsogbu, n’ihi na ozi ọ bụla yiri ka ò si n’aka onye ikwu mmadụ nwụrụ anwụ si n’aka ndị mmụọ ọjọọ. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa ụmụ Izrel ka ha ghara ịjụ ndị nwụrụ anwụ ase, ma ọ bụkwanụ fee ndị mmụọ ọjọọ n’ụdị ọ bụla.—Diuterọnọmi 18:10-12; gụọ ihe nke 26 na nke 31 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

5. Gịnị nwere ike inyere gị aka ịkwụsị iji ihe oyiyi na-efe Chineke, kwụsịkwa ife ndị nna ochie gị hà nwụrụ anwụ ofufe?

5 Gịnị ga-enyere gị aka ịkwụsị iji ihe oyiyi na-efe Chineke ma ọ bụkwanụ ịkwụsị ife ndị nna gị ochie nwụrụ anwụ ofufe? I kwesịrị ịna-agụ Baịbụl, na-echemikwa echiche gbasara otú Jehova si ele ihe ndị ahụ anya. O weere ha ka “ihe arụ,” ma ọ bụ ihe na-asọ oyi. (Diuterọnọmi 27:15) Na-ekpegara Jehova ekpere kwa ụbọchị ka o nyere gị aka ịna-ele ihe anya otú o si ele ya, nakwa ka o nyere gị aka ịna-efe ya ofufe otú o si chọọ. (Aịzaya 55:9) Ka obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ịkata obi bibie ihe ọ bụla gbasara okpukpe ụgha i nwere.

ÀNYỊ KWESỊRỊ ỊGBA KRISMAS?

6. Gịnị mere e ji wepụta Disemba 25 ka ọ bụrụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Jizọs?

6 Krismas bụ otu n’ime ememme ndị a kacha eme n’ụwa niile. Ọtụtụ ndị chekwara na ọ bụ ememme e ji echeta mgbe a mụrụ Jizọs. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ihe  jikọrọ Krismas na ndị ọgọ mmụọ. Otu akwụkwọ kwuru na ndị Rom na-ekpere arụsị na-eme ememme ha ji echeta ụbọchị ọmụmụ anyanwụ na Disemba 25. Ndị isi chọọchị chọrọ ka e nwekwuo ọtụtụ ndị ọgọ mmụọ ga-aghọ Ndị Kraịst. N’ihi ya, ha kpebiri imewe ememme ncheta ọmụmụ Jizọs na Disemba 25 n’agbanyeghị na ọ bụghị ụbọchị ahụ ka a mụrụ ya. (Luk 2:8-12) Ndị na-eso ụzọ Jizọs agbaghị Krismas. Otu akwụkwọ a na-akpọ Sacred Origins of Profound Things kwuru na n’ime narị afọ abụọ a mụchara Jizọs, “ọ dịghị onye maara kpọmkwem mgbe a mụrụ ya, ọ bụkwa mmadụ ole na ole chọdịrị ịma.” Ọ bụ mgbe Jizọs nwụchara, ọtụtụ narị afọ agafee, ka a malitere ịgba Krismas.

7. Gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst anaghị agba Krismas?

7 Ọtụtụ ndị taa ma na Krismas na ihe dị iche iche a na-eme na ya, dị ka oriri oké mkpọtụ na inye onyinye, si n’aka ndị ọgọ mmụọ. Dị ka ihe atụ, n’Ịngland na n’ebe ụfọdụ n’Amerịka, e nwere mgbe e tiri iwu sị onye agbakwala Krismas n’ihi na ọ bụ ememme ndị na-ekpere arụsị. A tara onye ọ bụla gbara Krismas n’oge ahụ ahụhụ. Mana, ka oge na-aga, ndị mmadụ bidokwara gbawa Krismas. Gịnị mere ezigbo Ndị Kraịst anaghị agba Krismas? Ọ bụ n’ihi na ha chọrọ ime ihe dị Chineke mma n’ihe ọ bụla ha na-eme.

ÀNYỊ KWESỊRỊ IME EMEMME ỤBỌCHỊ ỌMỤMỤ?

8, 9. Gịnị mere Ndị Kraịst oge mbụ emeghị ememme ụbọchị ọmụmụ?

8 Ememme ọzọ ọtụtụ ndị na-eme bụ ememme ụbọchị ọmụmụ. Ndị Kraịst hà kwesịrị ịna-eme ememme ụbọchị ọmụmụ? Ọ bụ ndị na-anaghị efe Jehova mere ememme ụbọchị ọmụmụ abụọ e kwuru okwu ha na Baịbụl. (Jenesis 40:20; Mak 6:21) E ji ememme ụbọchị ọmụmụ asọpụrụ chi ụgha dị iche iche. Akwụkwọ a na-akpọ The  World Book Encyclopedia kwuru na ọ bụ ya mere Ndị Kraịst oge mbụ ji ‘lee ememme ụbọchị ọmụmụ mmadụ anya ka omenala ndị ọgọ mmụọ.’

9 Ndị Rom na Ndị Grik oge ochie kweere na e nwere mmụọ na-abịa eleta mmadụ ma a mụọ ya, nakwa na mmụọ a ga na-echebe onye ahụ n’oge niile onye ahụ dị ndụ. Akwụkwọ a na-akpọ The Lore of Birthdays kwuru na ndị na-abụghị Ndị Kraịst n’oge ahụ na-eme ememme ncheta ọmụmụ n’ihi na ha chere na ọ ga-eme ka chi nwe ụbọchị a mụrụ mmadụ na-echebe onye ahụ.

10. Gịnị mere Ndị Kraịst nke oge a ekwesịghị ịna-eme ememme ụbọchị ọmụmụ?

10 Ì chere na Jehova na-akwado ememme ndị nwere ihe jikọrọ ha na okpukpe ụgha? (Aịzaya 65:11, 12) Mba, ọ naghị akwado ha. Ọ bụ ya mere na anyị adịghị eme ememme ụbọchị ọmụmụ ma ọ bụkwanụ nke ụbọchị ọ bụla nwere ihe jikọrọ ya na okpukpe ụgha.

Ò NWERE IHE O MERE?

11. Gịnị mere ụfọdụ ndị ji eme ememme ụfọdụ? Gịnị kwesịrị ịkacha gịnwa mkpa?

11 Ụfọdụ ndị ma na Krismas na ụfọdụ ememme ndị ọzọ bụ ememme ndị ọgọ mmụọ, ma ha ka na-eme ha. Ha weere ya na oge ememme ndị a bụ nnọọ ezigbo ohere ha na ndị ezinụlọ ha ga-eji nọrịa. Ọ̀ bụ otú a ka ọ dị gịnwa? Ọ bụghị ihe ọjọọ ma i wepụta oge ka gị na ndị ezinụlọ gị nọrịa. Ọ bụ Jehova kere ezinụlọ, ọ chọkwara ka anyị na ndị ezinụlọ anyị dịrị ná mma. (Ndị Efesọs 3:14, 15) Mana, ihe kwesịrị ịbụ mkpa anyị karịchaa bụ ime ka anyị na Jehova dịrị ná mma kama ịna-eme ememme ndị okpukpe ụgha ka ọ bụrụkwa na anyị na-emeta ndị ikwu anyị mma. Ọ bụ ihe a mere Pọl onyeozi ji sị: “Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma.”—Ndị Efesọs 5:10.

12. Gịnị mere Jehova anaghị akwado ememme ụfọdụ?

 12 Ọtụtụ ndị chere na ebe ememme si bido adịchaghị mkpa. Mana, Jehova echeghị otú ahụ. Ọ naghị akwado ememme ndị si n’aka ndị ọgọ mmụọ ma ọ bụ ememme ndị e ji eto mmadụ ma ọ bụ mba. Dị ka ihe atụ, ndị Ijipt nwere ọtụtụ ememme ha ji efe chi ụgha ha dị iche iche. Mgbe ụmụ Izrel si n’Ijipt pụọ, ha ṅomitere otu n’ime ememme ndị ahụ ma kpọọ ya ‘ememme a na-emere Jehova.’ Ma Jehova tara ha ahụhụ n’ihi ihe ahụ ha mere. (Ọpụpụ 32:2-10) Dị ka Aịzaya onye amụma kwuru, anyị ekwesịghị ‘imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.’—Gụọ Aịzaya 52:11.

JIRI OBIỌMA NA-EMESO NDỊ ỌZỌ IHE

13. Olee ajụjụ ndị nwere ike ịna-abata gị n’obi ma ọ bụrụ na i kpebie ịkwụsị iso eme ememme ụfọdụ?

13 I kpebie ịkwụsị ime ememme ụfọdụ, e nwere ajụjụ ụfọdụ nwere ike ịbata gị n’obi. Dị ka ihe atụ: Gịnị ka m ga-eme ma ọ bụrụ na ndị mụ na ha na-arụ ọrụ ajụọ m ihe mere na mụ anaghị eso agba Krismas? Gịnị ka m kwesịrị ime ma ọ bụrụ na mmadụ enye m onyinye n’oge Krismas? Gịnị ka m kwesịrị ime ma ọ bụrụ na di m ma ọ bụ nwunye m achọọ ka m soro mee ememme ụfọdụ? Olee otú m ga-esi mee ka ọ ghara ịna-ewute ụmụ m na ha esoghị eme ememme ụfọdụ, ma ọ bụkwanụ na e meereghị ha ememme ụbọchị ọmụmụ ha?

14, 15. Olee ihe i nwere ike ime ma ọ bụrụ na mmadụ ekelee gị otú e si ekele n’oge ememme, ma ọ bụkwanụ nye gị onyinye?

14 Ọ dị mkpa ka anyị jiri amamihe mara ihe anyị ga-ekwu ma ọ bụ ihe anyị ga-eme ma e nwee ihe ọ bụla biliterenụ n’okwu a. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ ekelee gị otú e si ekele n’oge ememme, i kwesịghị ịgba ya nkịtị. I nwere ike ịsị onye ahụ, “Ndeewo.” Ma, ọ bụrụ na onye ahụ ka nwere ihe ọ chọrọ ịmatakwu, i nwere ike ime ka ọ mata ihe mere na ị naghị eme ememme ahụ. Mana, hụ  na i ji obiọma na amamihe na-ekwu okwu mgbe niile, na-akwanyekwara ndị mmadụ ùgwù. Baịbụl kwuru, sị: “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Ndị Kọlọsi 4:6) I nwere ike ime ka onye ahụ ghọta na ọ bụghị na gị na ndị ọzọ ịnọkọ na inye onyinye anaghị amasị gị, kama na ọ bụ naanị na ị chọghị ime ihe ndị a n’oge ememme ahụ.

15 Gịnịkwanụ ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ enye gị onyinye? Ọ bụghị n’ihe niile ka Baịbụl kpọrọ okwu aha. Mana, Baịbụl sịrị na anyị kwesịrị inwe ezi akọnuche n’ihe niile. (1 Timoti 1:18, 19) O nwere ike ịbụ na onye na-enye gị onyinye ahụ amaghị na ị naghị eme ememme ahụ, nweekwa ike ya asị gị, “Ama m na unu anaghị eme ememme a, ma achọrọ m inye gị ihe a.” Ma ọ̀ ma ma ọ́ maghị, i nwere ike ikpebi ma ị̀ ga-anara onyinye ahụ ma ọ bụ na ị gaghị anara. Ma, hụ na ihe ọ bụla i kpebiri ime bụ ihe ka ga-eme ka i nwee akọnuche dị ọcha. Anyị agaghị achọ ime ihe ọ bụla ga-eme ka anyị na Jehova ghara ịdịkwa ná mma.

OTÚ Ị GA-ESI EMESO NDỊ EZINỤLỌ GỊ

Ndị na-efe Jehova na-enwe obi ụtọ

16. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na e nwee ememme ndị ezinụlọ gị chọrọ ime?

16 Gịnị ka ị ga-eme ma e nwee ememme ndị ezinụlọ gị chọrọ ime? Agala ka gị na ha sewe okwu. Cheta na ha nweere onwe ha ikpebi ihe ha chọrọ ime. Jiri obiọma na-emeso ha ihe, na-akwanyekwara ha ùgwù otú ị ga-achọ ka hanwa na-akwanyere gị. (Gụọ Matiu 7:12.) Mana, ọ bụrụ na ezinụlọ gị achọọ ka gị na ha nọrịa n’oge ememme ahụ, gịnị ka ị ga-eme? Tupu i kpebie ihe ị ga-eme, kpegara Jehova ekpere ka o nyere gị aka ime mkpebi dị mma. Chebara okwu ahụ echiche, meekwa nchọnchọ gbasara ya. Cheta na i kwesịrị ịna-eme ihe dị Jehova mma mgbe niile.

17. Olee ihe ndị i nwere ike ime ka obi ghara ịna-ajọ ụmụ gị njọ na ha esoghị ndị ọzọ na-eme ememme?

 17 Olee ihe ndị ị ga na-emere ụmụ gị ka obi ghara ịna-ajọ ha njọ ma ha hụ ka ndị ọzọ na-eme ememme? Mgbe ụfọdụ, meere ha ihe ga-egosi na i jighị ha egwu egwu. I nwekwara ike inye ha onyinye ha na-atụghị anya ya. Onyinye kacha mma i kwesịrị inye ụmụ gị bụ iwepụta oge ka gị na ha na-anọrị nakwa igosi ha na ị hụrụ ha n’anya.

NA-EFE CHINEKE OTÚ O SI CHỌỌ

18. Gịnị mere anyị ga-eji na-aga ọmụmụ ihe?

18 Anyị kwesịrị isepụ aka n’okpukpe ụgha na n’ememme ya dị iche iche ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe ga-adị Jehova mma. Ma, anyị kwesịkwara ịna-efe Chineke otú o si chọọ. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Otu n’ime ihe anyị kwesịrị ime bụ ịna-agachi ọmụmụ ihe Ndị Kraịst anya. (Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.) Ọmụmụ ihe bụ otu n’ime ụzọ ndị anyị si efe Chineke otú o si chọọ. (Abụ Ọma 22:22; 122:1) Anyị nwekwara ike ịgbarịta ibe anyị ume mgbe anyị gara ọmụmụ ihe.—Ndị Rom 1:12.

19. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka ị na-agwa ndị ọzọ gbasara eziokwu ndị ị mụtarala na Baịbụl?

19 Ihe ọzọ ị ga-eme iji gosi na ị chọrọ ife Chineke otú o si chọọ bụ ịna-agwa ndị ọzọ ihe ị mụtara na Baịbụl. Ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa na-ewute ọtụtụ ndị. (Ezikiel 9:4) O nwere ike ịbụ na ị ma ụfọdụ ndị ihe ndị a na-ewute. Kọọrọ ha gbasara ọmarịcha ihe ndị ị na-atụ anya ha n’ọdịnihu. Ka ị na-abịa ọmụmụ ihe Ndị Kraịst ma na-akọrọ ndị ọzọ banyere eziokwu dị na Baịbụl, ị ga-ahụ na ọ gaghịzi na-agụ gị agụụ ịnọ n’okpukpe ụgha ma ọ bụ iso na-eme ememme ya dị iche iche. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị ga na-enwe obi ụtọ, Jehova ga-agọzikwa mbọ ị na-agba ma ọ bụrụ na ị nọgide na-efe ya otú o si chọọ.—Malakaị 3:10.