Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE IRI NA ATỌ

Jiri Ndụ Kpọrọ Ihe

Jiri Ndụ Kpọrọ Ihe

1. Ònye nyere anyị ndụ?

JEHOVA “bụ Chineke dị ndụ.” (Jeremaya 10:10) Ọ bụ ya kere anyị, nyekwa anyị ndụ. Baịbụl sịrị: “Ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.” (Mkpughe 4:11) O doro anya na Jehova chọrọ ka anyị dịrị ndụ. Ndụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa o nyere anyị.—Gụọ Abụ Ọma 36:9.

2. Olee ihe anyị ga-eme ka ihe gaziere anyị ná ndụ?

2 Jehova na-enye anyị ihe ndị na-enyere anyị aka ịdị ndụ, dị ka nri na mmiri. (Ọrụ Ndịozi 17:28) E wepụkwa na o nyere anyị ihe ndị a, ọ chọrọ ka ndụ na-atọ anyị ụtọ. (Ọrụ Ndịozi 14:15-17) Ma, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ihe gaziere anyị ná ndụ, anyị kwesịrị ịna-erube isi n’iwu Chineke.—Aịzaya 48:17, 18.

OTÚ CHINEKE SI ELE NDỤ ANYA

3. Gịnị ka Jehova mere mgbe Ken gburu Ebel?

3 Baịbụl na-akụziri anyị na ndụ anyị na nke ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. Dị ka ihe atụ, mgbe Ken, nwa Adam na Iv, wesara nwanne ya nwoke nke ọ tọrọ, bụ́ Ebel, oké iwe, Jehova dọrọ Ken aka ná ntị ka ọ kwụsị iwe ahụ ọ na-ewe. Ma, Ken egeghị Jehova ntị. O were iwe dị ọkụ nke na ọ “wakporo Ebel nwanne ya wee gbuo ya.” (Jenesis 4:3-8) Jehova tara Ken ahụhụ n’ihi na o gburu Ebel. (Jenesis 4:9-11) Ihe a na-egosi na iwe na ịkpọasị jọgburu onwe ha n’ihi na ha nwere ike ime ka anyị jiri obi ọjọọ na-emeso ndị ọzọ ihe. Onye na-eme otú a agaghị adị ndụ ebighị ebi. (Gụọ 1 Jọn 3:15.) Ọ bụrụ  na anyị chọrọ ịna-eme ihe dị Jehova mma, anyị kwesịrị ịna-ahụ mmadụ niile n’anya.—1 Jọn 3:11, 12.

4. Olee ihe otu n’ime iwu Chineke nyere ụmụ Izrel na-akụziri anyị gbasara ndụ o nyere anyị?

4 Ka ọtụtụ puku afọ gachara, Jehova gosiri na ndụ dị oké ọnụ ahịa n’anya ya mgbe o nyere Mozis Iwu Iri ahụ. Otu n’ime iwu ahụ bụ: “Egbula ọchụ.” (Diuterọnọmi 5:17) N’oge ahụ, a na-egbukwa onye ọ bụla ma ụma gbuo mmadụ.

5. Olee otú Chineke si ele ite ime anya?

5 Olee otú Chineke si ele ite ime anya? Ndụ nwa e bu n’afọ dịdị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova. N’Iwu ahụ Jehova nyere ụmụ Izrel, ọ sịrị na ọ bụrụ na mmadụ emerụọ nwaanyị di ime ahụ́, nwa o bu n’afọ anwụọ, a ga-egbu onye ahụ. (Gụọ Ọpụpụ 21:22, 23; Abụ Ọma 127:3.) Ihe a na-akụziri anyị na ite ime dị njọ.—Gụọ ihe nke 28 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

6, 7. Olee otú anyị si egosi Jehova na ndụ dị oké ọnụ ahịa n’anya anyị?

6 Olee otú anyị ga-esi egosi Jehova na ndụ anyị na nke ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa n’anya anyị? Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịghara ịna-eme ihe ọ bụla nwere ike ịkpa ndụ anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ aka ọjọọ. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-aṅụ sịga ma ọ bụ na-akpọ ụtaba ma ọ bụkwanụ na-aṅụ ọgwụ ọjọọ n’ihi na ihe ndị a ga-emerụ anyị ahụ́. Ha nwekwara ike igbu anyị.

7 Ọ bụ Chineke nyere anyị ndụ anyị dị, nyekwa anyị ahụ́ anyị. Anyị kwesịkwara iji ha na-eme ihe otú Chineke si chọọ. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-elekọta ahụ́ anyị nke ọma. Ọ bụrụ na anyị anaghị elekọta ya, anyị agaghị adị ọcha n’anya Chineke. (Ndị Rom 6:19; 12:1; 2 Ndị Kọrịnt 7:1) Anyị enweghị ike ife Jehova, bụ́ onye nyere anyị ndụ, ma ọ bụrụ na anyị anaghị ele ndụ anya  dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike isi ezigbo ike ịkwụsị àgwà ndị nwere ike imerụ anyị ahụ́, ma Jehova ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị na-agba mbọ ịkwụsi ya n’ihi na anyị ma na ndụ dị oké ọnụ ahịa.

8. Gịnị ka anyị ga-eme iji hụ na anyị ejighị ndụ anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ na-egwuri egwu?

8 Anyị amụtala na ndụ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa. Obi siri Jehova ike na anyị agaghị anwa anwa jiri ndụ anyị ma ọ bụ nke ndị ọzọ na-egwuri egwu. Otú anyị si akwọ ụgbọala, otú anyị si agba ọgba tum tum, ma ọ bụ ihe ọzọ a na-agba agba, kwesịrị igosi na anyị ejighị ndụ egwu egwu. Anyị ekwesịghị ịna-egwu ụdị egwuregwu ndị na-emerụ ahụ́. (Abụ Ọma 11:5) Anyị na-agbakwa mbọ hụ na ihe ndị nwere ike imerụ mmadụ ahụ́ adịghị n’ebe anyị bi. Jehova nyere ụmụ Izrel iwu, sị: “Ọ bụrụ na ị na-ewu ụlọ ọhụrụ, rụnye ihe nrụbichi n’elu ụlọ gị, ka i wee ghara ime ka ikpe ọbara ma ụlọ gị n’ihi na mmadụ nwere ike isi na ya dapụ.”—Diuterọnọmi 22:8.

9. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ụmụ anụmanụ ihe?

9 Otú anyị si emeso ụmụ anụmanụ ihe gbasadịrị Jehova. Ọ sịrị na anyị nwere ike igbu anụmanụ rie ma ọ bụkwanụ si na ya mepụta uwe. Ọ kwadokwara ka anyị gbuo anụmanụ na-achọ imerụ anyị ahụ́. (Jenesis 3:21; 9:3; Ọpụpụ 21:28) Mana, anyị ekwesịghị ịrụsa ụmụ anụmanụ arụrụala ma ọ bụ igbu ha naanị maka egwuregwu.—Ilu 12:10.

JIRI NDỤ KPỌRỌ IHE N’IHI NA Ọ DỊ NSỌ

10. Olee otú anyị si mara na ọbara bụ ndụ?

10 Ọbara dị nsọ n’anya Jehova n’ihi na ọbara bụ ndụ. Mgbe Ken gbuchara Ebel nwanne ya, Jehova gwara Ken, sị: “Ọbara nwanne gị si n’ala na-etiku m.” (Jenesis 4:10)  Ọbara Ebel bụ ndụ ya, Jehova takwara Ken ahụhụ n’ihi na o gburu Ebel. Mgbe Iju Mmiri e nwere n’oge Noa gachara, Jehova gosikwara ọzọ na ọbara bụ ndụ. Jehova gwara Noa na ezinụlọ ya na ha nwere ike iri anụ. Ọ sịrị ha: “Anụ ọ bụla na-agagharị agagharị nke dị ndụ pụrụ ịbụrụ unu ihe oriri. Dị ka m nyere unu ahịhịa ndụ, m na-enye unu ha niile.” Ma, e nwere otu ihe Jehova nyere ha iwu ka ha ghara iri. Ọ sịrị: “Ma unu erikọtala anụ na mkpụrụ obi ya—ọbara ya.”—Jenesis 1:29; 9:3, 4.

11. Olee iwu Chineke nyere mba Izrel banyere ọbara?

11 Mgbe Jehova gwachara Noa ka ọ ghara iri ọbara, ihe dị ka narị afọ asatọ agaa, o nyekwara ụmụ Izrel otu iwu ahụ. Ọ sịrị ha: “Onye ọ bụla n’etiti ụmụ Izrel ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu nke nwụdere anụ ọhịa ma ọ bụ anụ ufe a na-eri eri mgbe ọ na-achụ nta ga-eme ka ọbara ya gbapụsịa, ọ ga-ekpochikwa ya ájá.” Ọ gwakwara ha, sị: “Unu erila ọbara.” (Levitikọs 17:13, 14) Jehova ka chọrọ ka ndị na-efe ya na-ele ọbara anya ka ihe dị nsọ. Ha nwere ike iri anụ, ma ha ekwesịghị iri ọbara ya. Ọ bụrụ na ha egbuo anụ ha chọrọ iri, ha kwesịrị ịwụpụ ọbara ya n’ala.

12. Olee otú Ndị Kraịst si ele ọbara anya?

12 Afọ ole na ole Jizọs nwụchara, ndịozi ya na ndị okenye ọgbakọ Ndị Kraịst dị́ na Jeruselem zukọrọ leba anya n’iwu ahụ e nyere ụmụ Izrel ka ha mara ndị nke Ndị Kraịst ka kwesịrị ịna-edebe. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 15:28, 29; 21:25.) Jehova nyeere ha aka ịghọta na ọbara ka dị oké ọnụ ahịa n’anya ya nakwa na ha ka kwesịrị ịna-ele ya anya ka ihe dị nsọ. Ndị Kraịst oge mbụ ahụ erighị ọbara, ha aṅụghịkwa ya aṅụ. Ha erighịkwa anụ ọbara ya na-agbapụghị nke ọma. Ọ bụrụ na ha erie ya, ọ bụ ihe ọjọọ otú ahụ ikpere arụsị ma ọ bụ ịkwa iko bụ.  Malite n’oge ahụ, ezigbo Ndị Kraịst na-ajụ iri ọbara ma ọ bụ ịṅụ ya aṅụ. Taakwanụ? Jehova ka chọkwara ka anyị na-ele ọbara anya ka ihe dị nsọ.

13. Gịnị mere Ndị Kraịst anaghị ekwe ka a mịnye ha ọbara?

13 Ọ̀ pụtaziri na Ndị Kraịst ekwesịghị ikwe ka a mịnye ha ọbara? Ee, ọ bụ ihe ọ pụtara. Jehova nyere anyị iwu ka anyị ghara iri ọbara ma ọ bụ ịṅụ ya aṅụ. Ọ bụrụ na dọkịta sịrị gị aṅụla mmanya, ị̀ ga-eji ndụdụ gbanye ya n’akwara gị? Ị gaghị anwa ya anwa. Otú ahụ ka ọ dịkwa iwu ahụ Chineke nyere anyị ka anyị ghara iri ọbara. Anyị ekwesịghị ikwe ka a mịnye anyị ọbara.—Gụọ ihe nke 29 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

14, 15. Olee otú Onye Kraịst ga-esi egosi na ya ji ndụ kpọrọ ihe nakwa na ya na-erubere Jehova isi?

14 Gịnị ka anyị ga-eme ma onye dọkịta sị na anyị ga-anwụ ma ọ bụrụ na anyị ekweghị ka a mịnye anyị ọbara? Onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi ma ọ̀ ga-erubere Chineke isi n’iwu ahụ o nyere gbasara ọbara. Ndị Kraịst ji ndụ Chineke nyere ha kpọrọ ezigbo ihe, n’ihi ya, anyị ga-agba mbọ chọọ ma è nwere ụzọ ọzọ dị iche e nwere ike isi gwọọ anyị ọrịa. Ma, anyị agaghị ekwe ka a mịnye anyị ọbara.

15 Anyị na-agba mbọ na-ahụ na ahụ́ siri anyị ike. Mana, n’ihi na ndụ dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke, anyị agaghị ekwe ka a mịnye anyị ọbara. Ihe ka anyị mkpa bụ irubere Jehova isi, ọ bụghị ịchọwa otú anyị ga-esi nọtụkwuo ndụ ma si otú ahụ nupụrụ ya isi. Jizọs sịrị: “Onye ọ bụla nke chọrọ ịzọpụta mkpụrụ obi ya ga-atụfu ya; ma onye ọ bụla nke tụfuru mkpụrụ obi ya n’ihi m ga-achọta ya.” (Matiu 16:25) Anyị chọrọ irubere Jehova isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. Ọ ma ihe ga-akacha abara anyị uru. Anyị na-ewerekwa ndụ ka ihe dị oké ọnụ ahịa na ihe dị nsọ otú ahụ Jehova si were ya.—Ndị Hibru 11:6.

16. Gịnị mere ndị ohu Chineke ji erubere ya isi?

 16 Ezigbo ndị ohu Chineke kpebisiri ike idebe iwu ya n’ihe gbasara ọbara. Ha anaghị eri ọbara. Ha anaghịkwa ekwe ka a mịnye ha ọbara. * Ma, ha ga-ekwe ka e si n’ụzọ ọzọ zọọ ha ndụ. Obi siri ha ike na Onye kere ndụ na ọbara ma ihe ga-akacha abara ha uru. Ì kweere na ọ ma ihe ga-akacha abara gị uru?

NAANỊ OTU IHE JEHOVA KWADORO KA E JIRI ỌBARA MEE

17. N’Izrel oge ochie, olee otu ihe e ji ọbara mee nke Jehova kwadoro?

17 N’Iwu ahụ Chineke nyere Mozis, Jehova gwara ụmụ Izrel, sị: “Mkpụrụ obi nke anụ ahụ́ dị n’ọbara ya, mụ onwe m emewo ka ọ bụrụ maka ebe ịchụàjà ka unu were ya na-ekpuchiri mkpụrụ obi unu mmehie, n’ihi na ọ bụ ọbara na-ekpuchi mmehie.” (Levitikọs 17:11) N’oge ochie, ọ bụrụ na ụmụ Izrel emee mmehie, ha nwere ike ịchụ anụmanụ n’àjà ma gwa onye nchụàjà ka ọ wụsatụ ọbara anụmanụ ahụ n’elu ebe ịchụàjà. Ọ bụ otú ahụ ka ha si arịọ Jehova mgbaghara. Ihe a bụ naanị otu ihe Jehova kwadoro ka ụmụ Izrel jiri ọbara mee.

18. Gịnị ka àjà Jizọs chụrụ ga-eme ka anyị nwee ike inweta?

18 Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o nyere ndụ ya, ma ọ bụ ọbara ya, ka e nwee ike ịgbaghara anyị mmehie anyị. E jikwa ihe ahụ o mere dochie iwu ahụ kwuru ka a na-achụ anụmanụ n’àjà. (Matiu 20:28; Ndị Hibru 10:1) Ndụ Jizọs bara ezigbo uru nke na mgbe Jehova kpọlitechara ya n’ọnwụ, ya agaa eluigwe, Jehova nweziri ike ime ka ụmụ mmadụ niile nwee ohere ịdị ndụ ebighị ebi.—Jọn 3:16; Ndị Hibru 9:11, 12; 1 Pita 1:18, 19.

Olee otú ị ga-esi egosi na i ji ndụ na ọbara kpọrọ ihe?

19. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ‘aka anyị dịrị ọcha n’ebe ọbara mmadụ niile dị’?

 19 Anyị na-ekele Jehova maka ndụ o nyere anyị. Onyinye a enweghị atụ. Anyị kwesịkwara ịna-agwa ndị mmadụ na ọ bụrụ na ha enwee okwukwe na Jizọs, ha ga-adị ndụ ebighị ebi. Anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya. Anyị ga-emekwa ihe niile anyị nwere ike ime iji kụziere ha ihe ga-eme ka ha nweta ndụ. (Ezikiel 3:17-21) Ọ bụzi mgbe ahụ ka anyị ga-enwe ike ikwu ihe Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Aka m dị ọcha n’ebe ọbara mmadụ niile dị, n’ihi na ahapụghị m ịgwa unu nzube niile nke Chineke.” (Ọrụ Ndịozi 20:26, 27) Ọ bụrụ na anyị na-agwa ndị ọzọ banyere Jehova nakwa otú ndụ si dị oké ọnụ ahịa n’anya ya, anyị si otú ahụ egosi na anyị ji ndụ kpọrọ ihe.

^ para. 16 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere mmịnye ọbara, gụọ peeji nke 77-79 nke akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.” Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Ịmịnye Mmadụ Ọbara n’Ahụ́?

Baịbụl kwuru na Chineke nyere anyị iwu ka anyị ‘zere ọbara.’ Olee otú iwu a si gbasa anyị taa?