Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE ISE

Ihe Mgbapụta Bụ Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị

Ihe Mgbapụta Bụ Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị

1, 2. (a) Olee mgbe ị ga-asị na onyinye baara gị uru? (b) Gịnị mere nzite Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ gbapụta anyị ji bụrụ onyinye kachanụ?

OLEE onyinye kacha mma mmadụ nyetụrụla gị? Ọ bụghị iwu na onyinye ga-adị oké ọnụ tupu ya abaara gị uru. Ọ bụrụ na onyinye e nyere gị gbooro gị mkpa gị ma ọ bụ mee ka i nwee obi ụtọ, ọ baara gị uru.

2 Chineke nyere anyị ọtụtụ onyinye. Nke kachanụ n’ime ha bụ na o zitere Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst, n’ụwa ka ọ gbapụta anyị ka anyị nwee ike inweta ndụ ebighị ebi. (Gụọ Matiu 20:28.) Ọ bụ ihe a Chineke meere anyị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu a. Ọ bụ maka na Jehova hụrụ anyị n’anya mere o ji zite Jizọs ka ọ gbapụta anyị.

GỊNỊ BỤ IHE MGBAPỤTA AHỤ?

3. Gịnị mere ụmụ mmadụ ji anwụ anwụ?

3 Ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye Jehova nyere ụmụ mmadụ iji napụta ha n’aka mmehie na ọnwụ. (Ndị Efesọs 1:7) Ka anyị bugodị ụzọ mata ihe mere ọtụtụ puku afọ gara aga n’ogige Iden n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịghọta ihe mere ihe mgbapụta a ji dị anyị mkpa. Nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, mehiere. Ọ bụ ya mere ha ji nwụọ. Anyị na-anwụkwa n’ihi na anyị ketara mmehie n’aka ha.—Gụọ ihe nke 9 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

4. Ònye bụ Adam, olee ihe magburu onwe ya Jehova meere ya?

4 Mgbe Jehova kere nwoke mbụ, bụ́ Adam, o nwere ihe magburu onwe ya o meere ya. O mere ka o zuo okè.  Ọ pụtara na ahụ́ Adam na uche ya zuru okè. Ọ gaghị arịa ọrịa, ọ gaghị aka nká, ọ gaghịkwa anwụ anwụ. E nwere ike ikwu na Jehova bụ nna Adam n’ihi na ọ bụ ya kere ya. (Luk 3:38) Jehova na-agwa ya okwu mgbe niile. Chineke gwara Adam hoo haa ihe o kwesịrị ime na ihe ọ na-ekwesịghị ime. O nyekwara ya ọrụ ga-eme ya obi ụtọ ọ ga na-arụ.—Jenesis 1:28-30; 2:16, 17.

5. Baịbụl kwuru na e kere Adam “n’onyinyo Chineke.” Gịnị ka ọ pụtara?

5 E kere Adam “n’onyinyo Chineke.” (Jenesis 1:27) Ihe ọ pụtara bụ na Jehova mere ka Adam nwee àgwà ndị yiri nke ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ịhụnanya, amamihe, ikpe ziri ezi, na ike. Chineke kere ya ka o nwee ike ịhọrọ ihe ọ ga-eme. Adam adịghị ka ụgbọala na-anaghị eche echiche nke na-aga naanị ebe onye nya ya chere ya ihu. Chineke kere ya ka o jiri aka ya họrọ ma ọ̀ ga-eme ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. A sị na Adam rubeere Chineke isi, ọ gaara adị ndụ ebighị na paradaịs.

6. Mgbe Adam nupụụrụ Chineke isi, olee ihe ndị funahụrụ ya? Olee otú nnupụisi ya si gbasa anyị?

6 Mgbe Adam nupụụrụ Chineke isi, Chineke mara ya ikpe ọnwụ. Ihe funahụrụ ya n’oge ahụ abụghị obere ihe. Ya na Jehova kwụsịrị ịdị ná mma, ọ ghọrọ onye na-ezughị okè, a chụpụkwa ya na paradaịs ahụ o bi. (Jenesis 3:17-19) Adam na Iv ji aka ha họrọ inupụrụ Chineke isi. N’ihi ya, ha enweghịzi olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ihe a Adam mere mere ka ‘mmehie si n’aka ya bata n’ụwa, ọnwụ esikwa ná mmehie bata, ọnwụ wee si otú ahụ gbasaa ruo mmadụ niile n’ihi na ha niile mehiere.’ (Ndị Rom 5:12) Mgbe Adam mehiere, o “rere” onwe ya, reekwa anyịnwa, anyị abụrụzie ndị mmehie, na-anwụkwa anwụ. (Ndị Rom 7:14) Ò nwere  ihe ga-anapụta anyị n’ọnọdụ a? Ee, e nwere. Jehova nyere anyị ihe mgbapụta.

7, 8. Gịnị ka ihe mgbapụta pụtara?

7 Gịnị ka ihe mgbapụta pụtara? E nwere ụzọ ihe abụọ ọ pụtara. Nke mbụ bụ ụgwọ a kwụrụ iji gbapụta mmadụ ma ọ bụ iji nwetaghachi ihe. Nke abụọ abụrụ ụgwọ a kwụrụ maka ihe e mebiri emebi. Ụgwọ ahụ na ihe ahụ e mebiri ga-aha otu.

8 O nweghị mmadụ ọ bụla ga-ewepụli ọnwụ mmehie Adam kpataara anyị. Ma, Jehova haziri otú a ga-esi gbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ. Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe mgbapụta ahụ nakwa otú o nwere ike isi baara anyị uru.

OTÚ JEHOVA SI MEE KA E NWEE IHE MGBAPỤTA AHỤ

9. Olee ihe a ga-eji akwụ ụgwọ ihe Adam tụfuru?

9 E nweghị onye n’ime anyị ga-akwụli ụgwọ a ga-eji nwetaghachi ndụ zuru okè Adam tụfuru. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị niile ezughị okè. (Abụ Ọma 49:7, 8) Ihe mgbapụta a ga-eji akwụ ụgwọ ihe Adam tụfuru ga-abụkwa ndụ mmadụ ọzọ zuru okè. Ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ.” (1 Timoti 2:6) Ihe mgbapụta ahụ na ndụ ahụ Adam tụfuru ga-aharịrị.

10. Olee otú Jehova si mee ka e nwee ihe mgbapụta ahụ?

10 Olee otú Jehova si mee ka e nwee ihe mgbapụta ahụ? Jehova zitere Ọkpara ya ọ kacha hụ n’anya n’ụwa. Ọkpara ya a, bụ́ Jizọs, bụ onye mbụ o kere. (1 Jọn 4:9, 10) Jizọs kwetara ịhapụ eluigwe, bụ́ ebe ya na Nna ya nọ, ma bịa n’ụwa. (Ndị Filipaị 2:7) Jehova si n’eluigwe zite Jizọs n’ụwa, a mụọ ya, ya abụrụ mmadụ zuru okè, nke na-enweghị mmehie.—Luk 1:35.

Jehova nyere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya ka ọ gbapụta anyị

11. Olee otú otu onye nwere ike isi gbapụta mmadụ niile?

 11 Mgbe Adam nupụụrụ Jehova isi, o mere ka mmadụ niile ghara izu okè. Ò nwere onye ọzọ nwere ike ime ka ụmụ Adam niile ghara ịna-anwụ anwụ? Ee. (Gụọ Ndị Rom 5:19.) Jizọs, bụ́ onye na-emeghị mmehie ọ bụla, nyere ndụ ya zuru okè ka ọ bụrụ ihe mgbapụta. (1 Ndị Kọrịnt 15:45) Ọ bụ ndụ ya zuru okè ka e nwere ike iji wepụrụ ụmụ Adam ọnwụ.—1 Ndị Kọrịnt 15:21, 22.

12. Gịnị mere Jizọs ji taa ezigbo ahụhụ?

12 Baịbụl gwara anyị na Jizọs tara ezigbo ahụhụ tupu ya anwụọ. A pịara ya ihe, kpọgide ya n’osisi ịta ahụhụ, ya atagide ahụhụ nwụọ. (Jọn 19:1, 16-18, 30) Gịnị mere Jizọs ji taa ahụhụ otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na Setan kwuru na o nweghị mmadụ ọ bụla ga-anọgide na-efe Chineke ma nsogbu tara akpụ bịara ya. Otú Jizọs si bie ndụ n’ụwa gosiri na ọ bụrụgodị na nsogbu tara akpụ abịara mmadụ zuru okè, onye ahụ nwere ike ịnọgide na-efe Chineke. N’eziokwu, ihe a Jizọs mere mere Jehova obi ụtọ.—Ilu 27:11; gụọ ihe nke 15 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

13. Olee otú e si kwụọ ụgwọ e ji gbapụta ụmụ mmadụ?

13 Olee otú e si kwụọ ụgwọ e ji gbapụta ụmụ mmadụ? N’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan afọ 33, na kalenda ndị Juu, Jehova kwere ka ndị iro Jizọs gbuo Jizọs. (Ndị Hibru 10:10) Mgbe ụbọchị atọ gachara, Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ya abụrụ mmụọ, ọ bụghịzi mmadụ. Ma, ikike Jehova nyere Jizọs ịbụ mmadụ zuru okè n’ụwa efunahụghị ya. Mgbe Jizọs mechara laghachikwuru Nna ya n’eluigwe, o nyefere Nna ya ikike ahụ ka o jiri ya gbapụta ụmụ Adam. (Ndị Hibru 9:24) Ebe Jehova nabatara ihe mgbapụta ahụ, e nweziri ike ịgbapụta anyị ná mmehie na ọnwụ.—Gụọ Ndị Rom 3:23, 24.

 OTÚ IHE MGBAPỤTA AHỤ NWERE IKE ISI BAARA GỊ URU

14, 15. Olee ihe anyị ga-eme ka a gbaghara anyị mmehie anyị?

14 Onyinye ahụ kachanụ Chineke nyere anyị baara anyị uru. Ka anyị hụ uru ọ baara anyị ugbu a na otú ọ ga-esi baara anyị uru n’ọdịnihu.

15 Chineke na-agbaghara anyị mmehie anyị. Ọ naghị adịrị anyị mfe ime ihe dị mma mgbe niile. Anyị na-emehie ihe. Mgbe ụfọdụ, anyị na-ekwu ma ọ bụ na-eme ihe na-adịghị mma. (Ndị Kọlọsi 1:13, 14) Olee ihe anyị ga-eme ka a gbaghara anyị? Anyị kwesịrị igosi na ihe anyị mere wutere anyị. Anyị kwesịkwara iji obi anyị niile rịọ Jehova ka ọ gbaghara anyị. Anyị mee otú ahụ, obi ga-esi anyị ike na a gbagharala anyị mmehie anyị.—1 Jọn 1:8, 9.

16. Olee ihe anyị ga-eme ka akọnuche anyị ghara ịna-ama anyị ikpe?

16 Akọnuche anyị anaghị ama anyị ikpe. Ọ bụrụ na akọnuche anyị agwa anyị na anyị mere ihe ọjọọ, ọ ga na-ama anyị ikpe. Anyị nwekwara ike ịna-eche na nke anyị na-eme agwụla, na o nweghịzi uru anyị bara. Ma, obi ekwesịghị ịda anyị mbà. Ọ bụrụ na anyị arịọ Jehova mgbaghara, ọ ga-ege anyị ntị ma gbaghara anyị. (Ndị Hibru 9:13, 14) Jehova chọrọ ka anyị na-akọrọ ya ihe ọ bụla na-enye anyị nsogbu. (Ndị Hibru 4:14-16) Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, anyị na Chineke ga-adị ná mma.

17. Olee ihe ọma ndị nwere ike iru anyị aka maka na Jizọs nwụrụ n’ihi anyị?

17 Anyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Baịbụl sịrị: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ, ma onyinye nke Chineke na-enye bụ ndụ ebighị ebi site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (Ndị Rom 6:23) Anyị nwere ike ịdị ndụ ruo mgbe ebighị, ahụ́ esiekwa anyị ike  ebe ọ bụ na Jizọs nwụrụ n’ihi anyị. (Mkpughe 21:3, 4) Ma, gịnị ka anyị ga-eme ka ihe ọma ndị a ruo anyị aka?

Ị̀ GA-ANABATA IHE MGBAPỤTA AHỤ?

18. Olee otú anyị si mara na Jehova hụrụ anyị n’anya?

18 Chegodị otú obi na-adị gị ma mmadụ nye gị ọmarịcha onyinye. Ihe mgbapụta ahụ karịrị onyinye ọ bụla e nyetụrụla anyị. Anyị kwesịrị ikele Jehova na o nyere anyị ya. Jọn 3:16 gwara anyị na “Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya.” N’eziokwu, ọ bụ maka na Jehova hụrụ anyị n’anya nke ukwuu mere o ji nye anyị Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. Anyị ma na Jizọs hụkwara anyị n’anya n’ihi na o wepụtara onwe ya nwụọ n’ihi anyị. (Jọn 15:13) Onyinye ahụ Jehova nyere, ya bụ, ihe mgbapụta ahụ kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na Jehova na Jizọs hụrụ anyị n’anya n’eziokwu.—Ndị Galeshia 2:20.

Ka anyị na-amụtakwu gbasara Jehova, anyị ga-abụ enyi ya ma hụkwuo ya n’anya

19, 20. (a) Olee ihe ị ga-eme ka ị bụrụ enyi Jehova? (b) Olee otú ị ga-esi egosi na ị nabatara àjà Jizọs chụrụ iji gbapụta anyị?

19 Ugbu a ị mụtarala na Chineke hụrụ gị n’anya nke ukwuu, olee ihe ị ga-eme ka ị bụrụ enyi ya? Ọ naghị adị mfe mmadụ ịhụ onye ọ na-amaghị n’anya. Jọn 17:3 kwuru na anyị nwere ike ịmata Jehova. Ọ bụrụ na ị gbalịa mata ya, ị ga-ahụkwu ya n’anya, ị ga-achọkwa ime ihe dị ya mma ma bụrụ enyi ya. N’ihi ya, na-amụ Baịbụl ka ị mụtakwuo gbasara Jehova.—1 Jọn 5:3.

20 Nabata àjà Jizọs chụrụ iji gbapụta gị. Baịbụl sịrị na “onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:36) Gịnị ka mmadụ inwe okwukwe pụtara? Ọ pụtara mmadụ ime ihe Jizọs kụziiri anyị ka anyị na-eme. (Jọn 13:15) Ọ bụghị naanị n’ọnụ ka anyị ga na-ekwu na anyị kweere na Jizọs, kama anyị ga na-eme ihe gosiri na anyị nwere okwukwe na ya. Ime  otú ahụ ga-egosi na anyị nabatara àjà Jizọs chụrụ iji gbapụta anyị. Jems 2:26, gwara anyị, sị: “Okwukwe nke na-enweghị ọrụ bụ ihe nwụrụ anwụ.”

21, 22. (a) Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-abịa Ncheta Ọnwụ Kraịst kwa afọ? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’Isi nke Isii na nke Asaa?

21 Na-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. N’anyasị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ kụziiri anyị na anyị kwesịrị ịna-echeta ọnwụ ya. Anyị na-eme ya kwa afọ. A na-akpọ ya Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ bụ “nri anyasị nke Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrịnt 11:20; Matiu 26:26-28) Jizọs chọrọ ka anyị na-echeta na o ji ndụ ya zuru okè gbapụta anyị. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Gụọ Luk 22:19.) Mgbe ọ bụla ị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs, ị na-egosi na ị na-echeta ihe mgbapụta ahụ, na-echetakwa na Jehova na Jizọs hụrụ anyị n’anya nke ukwuu.—Gụọ ihe nke 16 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

22 Ihe mgbapụta ahụ bụ onyinye kachanụ Jehova nyere anyị. (2 Ndị Kọrịnt 9:14, 15) Onyinye a na-enweghị atụ ga-abakwara ọtụtụ nde mmadụ nwụrụ anwụ uru. N’Isi nke Isii na nke Asaa, anyị ga-eleba anya n’otú ọ ga-esi baara ha uru.