Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE IRI NA OTU

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Na-atagbu Onwe Ha n’Ahụhụ?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Na-atagbu Onwe Ha n’Ahụhụ?

1, 2. Olee ajụjụ ọtụtụ ndị na-ajụ?

ỌTỤTỤ ihe na-eme n’ụwa a. Dị ka ihe atụ, ala ọma jijiji nke mere n’Oké Osimiri mere ka mmiri sọbata n’otu obodo bibie ọtụtụ ihe. Otu nwoke ji égbè bata n’ụlọ ụka gbagbuo ọtụtụ ndị ma merụọ ụfọdụ ahụ́. Ọrịa kansa gburu otu nwaanyị ji ụmụ ise, ụmụ ya agbarazie aka nne.

2 Ụdị ihe ndị a mee, ọtụtụ ndị na-ajụ, sị: “Gịnị mere ihe ndị a ji na-eme?” Ha na-ajụkwa ihe mere ndị mmadụ ji na-akpọ ibe ha asị n’ebe niile, ọtụtụ ndị ana-atagbukwa onwe ha n’ahụhụ. Ị̀ jụtụla onwe gị ụdị ajụjụ ndị a?

3, 4. (a) Olee ajụjụ ndị Habakọk jụrụ Jehova? b) Olee nkwa Jehova kwere Habakọk mgbe ọ na-aza ya ajụjụ ndị ahụ?

3 Baịbụl gwara anyị na ụfọdụ ndị nwere ezigbo okwukwe na Chineke jụkwara ụdị ajụjụ ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, Habakọk onye amụma jụrụ Jehova, sị: “Gịnị mere i ji mee ka m na-ahụ ihe ọjọọ, gịnịkwa mere i ji na-ele nsogbu n’anya n’anya? Gịnị mere e ji na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ, na-emekwa ihe ike n’ihu m, gịnị mere esemokwu ji na-adị, gịnịkwa mere e ji na-alụ ọgụ?”—Habakọk 1:3.

4 Chineke zara Habakọk ajụjụ ndị ahụ ọ jụrụ na Habakọk 2:2, 3. O kwekwara ya nkwa na ya ga-akwụsị nsogbu ndị ahụ. Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu. Baịbụl kwuru, sị: “Ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-ewute Chineke karịadị ka ọ na-ewute anyị. (Aịzaya 55:8, 9) Ugbu a, ka anyị zaa ajụjụ ahụ bụ́, Gịnị mere ndị mmadụ ji atagbu onwe ha n’ahụhụ?

 GỊNỊ MERE NDỊ MMADỤ JI ATAGBU ONWE HA N’AHỤHỤ?

5. Olee ihe ọtụtụ ndị isi okpukpe na-ekwu gbasara ahụhụ ndị mmadụ na-ata? Gịnị ka Baịbụl na-akụzi?

5 Ndị pastọ, ndị ụkọchukwu, na ndị isi okpukpe ndị ọzọ na-ekwukarị na ọ bụ uche Chineke ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ụfọdụ ndị nwere ike ikwu na tupu ọdachi na ihe ndị ọzọ emee mmadụ, Chineke ebula ụzọ kpebie na ha ga-eme nakwa na anyị enweghị ike ịghọta ihe mere Chineke ji kpebie ka ha mee. Ndị ọzọ nwedịrị ike ikwu na ihe mere ụmụaka na ndị ọzọ ji anwụ bụ na Chineke chọrọ ka ha bịa soro ya biri n’eluigwe. Ma ihe ndị a abụghị eziokwu. Ọ bụghị Jehova na-akpata ihe ọjọọ ndị na-emenụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ya bụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, ya bụrụ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi!”—Job 34:10.

6. Gịnị mere ọtụtụ ndị ji ata Chineke ụta maka ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ụwa?

6 Ọtụtụ ndị na-ata Chineke ụta maka ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ụwa n’ihi na ha chere na ọ bụ ya na-achị ụwa. Ma, anyị mụtara n’Isi nke Atọ n’akwụkwọ a na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu na-achị ụwa.

7, 8. Olee ihe ndị ọzọ mere ndị mmadụ ji na-atagbu onwe ha n’ahụhụ?

7 Baịbụl gwara anyị na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ọ bụ Setan na-achị ụwa a, obi takwara ya mmiri. Setan “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Ọtụtụ ndị na-eme ka ya. Nke a so n’ihe mere ndị mmadụ ji na-agha ụgha, na-akpọ ibe ha asị ma na-emekpọ ibe ha ọnụ.

8 E nwere ihe ndị ọzọ mere ndị mmadụ ji na-atagbu onwe ha n’ahụhụ. Mgbe Adam na Iv nupụchaara Chineke isi, ha ghọrọ ndị mmehie ma bufee ụmụ ha mmehie.  Ọ bụ mmehie mere ndị mmadụ ji akpatara ibe ha ahụhụ. Ha na-achọkarị ịbụ ndị a ma ama karịa ndị ọzọ. Ha na-ese okwu, na-alụ agha, ma na-echi ibe ha ọnụ n’ala. (Ekliziastis 4:1; 8:9) Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-ata ahụhụ n’ihi na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.” (Ekliziastis 9:11) Nke a pụtara na ihe mberede ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị ọzọ nwere ike ịdabara mmadụ ma mee ka onye ahụ taa ahụhụ.

9. Gịnị mere obi ji sie anyị ike na e nwere ezigbo ihe mere Jehova ji kwere ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ?

9 Ọ bụghị Jehova na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata. E kwesịghị ịta ya ụta maka agha ndị mmadụ na-alụ, ihe ọjọọ ndị ha na-eme nakwa ọnụ ha na-emekpọ ibe ha. Ọ bụghị Chineke na-akpata ọdachi ndị dị ka ala ọma jijiji, ajọ ifufe, na idei mmiri. Ma, i nwere ike ịna-eche, sị, ‘Ọ bụrụ na Jehova kacha ike n’eluigwe na n’elu ụwa, gịnị mere ọ kwụsịbeghị ihe ọjọọ ndị na-eme n’ụwa?’ Anyị maara na ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi nke ukwuu. N’ihi ya, o nwere ezigbo ihe mere o ji kwere ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ.—1 Jọn 4:8.

IHE MERE CHINEKE JI KWERE KA NDỊ MMADỤ NA-ATA AHỤHỤ

10. Olee ebubo Setan boro Jehova?

10 Ekwensu duhiere Adam na Iv n’ogige Iden. O boro Chineke ebubo na ọ bụghị ezigbo Onye Ọchịchị. O kwuru na e nwere ihe ọma Chineke na-ezoro Adam na Iv. Setan chọrọ ka ha kweta na ya ga-achị ha nke ọma karịa Jehova nakwa na Chineke adịghị ha mkpa ná ndụ ha.—Jenesis 3:2-5; gụọ ihe nke 27 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

11. Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịza?

11 Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi. Ha chere na ha kwesịrị ịna-ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe  ọjọọ. Olee otú Jehova ga-esi gosi na ihe ha mere ezighị ezi nakwa na ya ma ihe ga-akacha baara anyị uru?

12, 13. (a) Gịnị mere Jehova egbughị Adam na Iv mgbe ha mehiere? (b) Olee ihe mere Jehova ji kwe ka Setan na-achị ụwa nakwa ka ụmụ mmadụ na-achị onwe ha?

12 Jehova egbughị Adam na Iv mgbe ha mehiere. Kama, ọ hapụrụ ha ka ha mụọ ụmụ. Jehova hapụrụ ụmụ Adam na Iv ka ha jiri aka ha họrọ onye ha chọrọ ka ọ chịa ha. Jehova bu n’obi ka ndị zuru okè biri n’ụwa. Ọ ga-emezukwa ya n’agbanyeghị ihe ọ bụla Ekwensu nwere ike ime.—Jenesis 1:28; Aịzaya 55:10, 11.

13 Setan boro Jehova ebubo n’ihu ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi. (Job 38:7; Daniel 7:10) N’ihi ya, Jehova nyere Setan oge ka o gosi ma ebubo a o boro ya ọ̀ bụ eziokwu. O nyekwara ụmụ mmadụ oge ka ha nọrọ n’okpuru Setan na-achị onwe ha ka a mara ma hà ga-achịli onwe ha.

14. Olee ihe oge niile a Chineke kwere ka ụmụ mmadụ na-achị onwe ha merela ka a mata?

14 Kemgbe ọtụtụ puku afọ, ụmụ mmadụ agbaala mbọ ịchị onwe ha, ma mbọ ha akụọla afọ n’ala. O meela ka a mata na Setan bụ onye ụgha. Enyemaka Chineke dị ụmụ mmadụ mkpa. Ihe Jeremaya onye amụma kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Jehova, amaara m nke ọma na ụzọ mmadụ adịghị ya n’aka. Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.”—Jeremaya 10:23.

GỊNỊ MERE JEHOVA JI KWE KA AHỤHỤ NDỊ MMADỤ NA-ATA DỊTEE AKA?

15, 16. (a) Gịnị mere Jehova ji kwe ka ahụhụ ndị mmadụ na-ata dịtee aka? (b) Gịnị mere Jehova ewepụbeghị nsogbu ọchịchị Setan kpatara?

15 Gịnị mere Jehova ji kwe ka ahụhụ ndị mmadụ na-ata dịtee aka? Gịnịkwa mere ọ kwụsịbeghị ihe ọjọọ?  Ihe mere ya bụ na ogologo oge ga-agafe tupu ya edoo onye ukwu na onye nta anya na Setan amaghị achị. Ụmụ mmadụ agbaala mbọ ịchị onwe ha n’ụzọ dị iche iche, ma ha enwebeghị ike ịchị onwe ha nke ọma. Ọ bụ eziokwu na ha emekwuola nke ọma na nkà na ụzụ, ma ihe na-ebenụ ka na-ebe. Mmegbu, ịda ogbenye, arụrụala, na agha ka na-arị ibe ya elu. O doola anya na ọ bụ naanị Chineke kwesịrị ịchị, ọ bụghị ụmụ mmadụ.

16 Ma, Jehova ewepụbeghị nsogbu ọchịchị Setan kpatara. O mee ya ugbu a, ọ pụtara na ọ na-akwado ọchịchị Setan. Ọ bụrụkwa na Jehova ewepụ nsogbu ndị ahụ ugbu a, ụmụ mmadụ ga-eche na ha nwere ike ịchịli onwe ha otú ahụ Setan kwuru. Ma nke ahụ bụ okpookpo ụgha. Jehova emekataghịkwa mee ihe ga-eme ka ụmụ mmadụ kweta ihe na-abụghị eziokwu. Jehova anaghị agha ụgha.—Ndị Hibru 6:18.

17, 18. Gịnị ka Jehova ga-eme nsogbu niile Setan kpatara?

17 Jehova ọ̀ ga-ewepụli nsogbu niile isi Setan na ụmụ mmadụ nupụụrụ ya kpatara? Ee. N’ihi na o nweghị ihe nyịrị ya. Jehova ma mgbe ọ ga-eme ihe banyere ebubo niile Setan boro ya. Mgbe ahụ, ọ ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, nke bụ́ otú o kwesịrị ịdị. A ga-akpọlite ndị niile nọ “n’ili ncheta.” (Jọn 5:28, 29) Ndị mmadụ agakwaghị na-arịa ọrịa ma ọ bụ na-anwụ anwụ. Jizọs ga-ewepụ nsogbu niile Setan kpatara. Jehova ga-esi n’aka Jizọs “bibie ọrụ Ekwensu.” (1 Jọn 3:8) Obi dị anyị ụtọ na ka ọ dị ugbu a, Jehova na-enwere anyị ndidi ka anyị nwee ike ịmata onye ọ bụ ma kpebie ka ọ chịwa anyị. (Gụọ 2 Pita 3:9, 10.) Mgbe anyị na-ata ahụhụ, ọ na-enyere anyị aka idi ya.—Jọn 4:23; gụọ 1 Ndị Kọrịnt 10:13.

 18 Jehova anaghị amanye anyị amanye ka anyị kpebie ka ọ chịwa anyị. O kere ụmụ mmadụ ka ha jiri aka ha na-ekpebi ihe ha ga-eme. Ka anyị tụlee ihe nke a pụtara.

GỊNỊ KA Ị GA-EJI IKIKE I NWERE ỊHỌRỌ IHE Ị GA-EME MEE?

19. Olee ikike Jehova nyere anyị? Gịnị mere ikike a Jehova nyere anyị kwesịrị iji dị anyị mma?

19 Ikike Jehova nyere anyị iji aka anyị na-ahọrọ ihe anyị ga-eme mere ka anyị dị iche n’ụmụ anụmanụ. Ụmụ anụmanụ anaghị eche echiche. Ma, anyị nwere ike ikpebi n’onwe anyị otú anyị chọrọ isi bie ndụ anyị ma kpebie ma ànyị ga-efe Jehova ma ọ bụ na anyị agaghị efe ya. (Ilu 30:24) Ihe ọzọ bụ na anyị adịghị ka ígwè e ji arụ ọrụ, bụ́ nke na-arụ naanị ihe e kwo rụọ ya. Anyị nweere onwe anyị ịhọrọ ụdị mmadụ anyị chọrọ ịbụ, ụdị ndị anyị ga-emeta enyi, na ihe anyị chọrọ iji ndụ anyị mee. Jehova chọrọ ka ndụ anyị na-atọ anyị ụtọ.

20, 21. Olee ihe kacha mma ị ga-ahọrọ ime ugbu a?

20 Jehova chọrọ ka anyị hụ ya n’anya. (Matiu 22:37, 38) Obi na-adị ya ụtọ ma anyị jiri obi anyị niile hụ ya n’anya otú ahụ obi na-adị nna ụtọ ma nwa ya jiri obi ya niile hụ ya n’anya, n’enweghị onye manyere ya mee otú ahụ. Jehova hapụrụ anyị ka anyị jiri aka anyị họrọ ma ànyị ga-efe ya ma ọ bụ na anyị agaghị efe ya. Setan, Adam, na Iv họọrọ inupụrụ Jehova isi. Olee ihe gịnwa ga-eji ikike i nwere ịhọrọ ihe ị ga-eme mee?

21 Jiri ya họrọ ife Jehova. Ọtụtụ nde mmadụ ahọrọla ife ya, kama ife Setan. (Ilu 27:11) Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke mgbe ọ ga-akwụsị ahụhụ niile ndị mmadụ na-ata. Isiokwu na-eso nke a ga-eme ka anyị mata azịza ya.