Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

 ISI NKE ITOOLU

Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?

Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?

1. Olee ebe anyị ga-esi mata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu?

Ì GETỤLA akụkọ ụwa ma jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ̀ bụ otú a ka ụwa a ga-adịrị na-aga?’ Ihe ọjọọ na-arị ibe ya elu nke mere na ụfọdụ kwetara na ọgwụgwụ ụwa adịla nso. Ma, ọgwụgwụ ụwa ọ̀ dịla nso n’eziokwu? È nwere otú anyị ga-esi mata ihe ga-eme n’ọdịnihu? Ee, e nwere. Ọ bụ eziokwu na ụmụ mmadụ amaghị ihe ga-eme n’ọdịnihu, Jehova Chineke ma. Ọ gwara anyị na Baịbụl otú ihe ga-adịrị anyị n’ọdịnihu na otú ụwa ga-adị.—Aịzaya 46:10; Jems 4:14.

2, 3. Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs chọrọ ịma? Gịnịkwanụ ka Jizọs zara ha?

2 Mgbe Baịbụl na-ekwu banyere ọgwụgwụ ụwa, ihe ọ na-ekwu bụ na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume, ọ bụghị ụwa nkịtị. Jizọs kụziiri ndị mmadụ na Alaeze Chineke ga-achị ụwa. (Luk 4:43) Ndị na-eso ụzọ ya chọrọ ịma mgbe Alaeze Chineke ga-abịa. N’ihi ya, ha jụrụ ya, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?” (Matiu 24:3) Jizọs agwaghị ha ụbọchị a ga-ebibi ndị ajọ omume bi n’ụwa. Ma, ọ gwara ha ihe ndị ga na-eme tupu e bibie ha. Ihe ndị ahụ o kwuru na-eme ugbu a.

3 N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị ahụ ga na-eme n’ụwa tupu e bibie ndị ajọ omume. Ma, anyị ga-ebu ụzọ tụlee banyere otu agha a lụrụ n’eluigwe. Ọ ga-eme ka anyị ghọta ihe mere ụwa ji jọọ njọ otú a.

 AGHA A LỤRỤ N’ELUIGWE

4, 5. (a) Gịnị mere n’eluigwe obere oge Jizọs ghọchara Eze? (b) Gịnị ka Mkpughe 12:12 kwuru ga-eme n’ụwa mgbe a chụdachara Ekwensu?

4 N’Isi nke Asatọ, anyị mụtara na Jizọs ghọrọ Eze n’eluigwe n’afọ 1914. (Daniel 7:13, 14) Akwụkwọ Mkpughe kọọrọ anyị ihe merenụ. Ọ sịrị: “Agha wee daa n’eluigwe: Maịkel [nke bụ́ aha ọzọ a na-akpọ Jizọs] na ndị mmụọ ozi ya busoro dragọn ahụ [ya bụ, Setan bụ́ Ekwensu] agha, dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya bukwara agha.” * E meriri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ma si n’eluigwe chụda ha n’ụwa. Ndị mmụọ ozi ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu mgbe ahụ. Oleekwanụ maka ndị bi n’ụwa? Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ ga-ata ahụhụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Ekwensu, na-ewe oké iwe, “ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.”—Mkpughe 12:7, 9, 12.

5 Ekwensu ji ike ya niile na-akpata nsogbu n’ụwa a. Ọ na-ewe oké iwe n’ihi na ọ ma na oge fọọrọ ya tupu Chineke ebibie ya dị mkpirikpi. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ Jizọs kwuru ga na-eme n’oge ikpeazụ a.—Gụọ ihe nke 24 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

IHE NDỊ GA NA-EME N’OGE IKPEAZỤ A

6, 7. Olee otú agha na ụkọ nri si akpa ndị mmadụ aka ọjọọ n’oge anyị a?

6 Agha. Jizọs kwuru, sị: “Mba ga-ebuso mba ọzọ agha, alaeze ga-ebusokwa alaeze ọzọ agha.” (Matiu 24:7) E gbuola ọtụtụ ndị n’agha a lụrụ n’oge anyị a karịa ka e gbutụrụla n’oge ndị ọzọ a lụrụ agha. Òtù na-amụ gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa kwuru na  kemgbe afọ 1914, agha ataala isi ihe karịrị otu narị nde mmadụ. Ndị nwụrụ n’agha n’agbata afọ 1900 na afọ 2000 ji okpukpu atọ karịa ndị nwụrụ n’agha niile a lụrụ n’ime otu puku afọ na narị afọ itoolu bú afọ 1900 ụzọ. Ọtụtụ nde mmadụ ahụsiela anya n’ụwa n’ihi agha.

7 Ụkọ nri. Jizọs kwuru, sị: ‘A ga-enwe ụkọ nri.’ (Matiu 24:7). N’agbanyeghị na nri a na-akọpụta n’oge a buru ibu karịa n’oge gara aga, agụụ ka na-echi ọtụtụ ndị ọnụ n’ala. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha enweghị ego ha ga-eji zụrụ nri ma ọ bụ ala ha ga-akọ ihe. Ihe karịrị otu ijeri mmadụ anaghị akpata ihe ruru narị naịra abụọ n’ụbọchị. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na ọtụtụ nde ụmụaka na-anwụ kwa afọ n’ihi na ha anaghị eriju afọ.

8, 9. Gịnị gosiri na ihe Jizọs kwuru banyere ala ọma jijiji na ọrịa na-efe efe na-emezu?

8 Ala ọma jijiji. Jizọs sịrị na ‘a ga-enwe oké ala ọma jijiji.’ (Luk 21:11) A na-atụ anya na a ga-enwe ọtụtụ oké ala ọma  jijiji n’afọ ọ bụla. Kemgbe afọ 1900, ala ọma jijiji egbuola ihe karịrị nde mmadụ abụọ. Ọ bụ eziokwu na nkà na ụzụ emeela ka a na-amata ebe ala ọma jijiji chọrọ ime karịa ka a na-amatabu, ma ala ọma jijiji ka na-egbu ọtụtụ mmadụ.

9 Ọrịa. Jizọs buru amụma na a ga-enwe “ọrịa na-efe efe.” Ọrịa ọjọọ na-agbasa ngwa ngwa ma na-egbu ọtụtụ ndị. (Luk 21:11) N’agbanyeghị na ndị dọkịta amụtala otú e si agwọ ọtụtụ ọrịa, a ka nwere ọrịa ndị na-enweghị ngwọta. Otu akwụkwọ kwuru na kwa afọ, ụkwara nta, ịba, na ọgbụgbọ na ọnyụnyụ na-egbu ọtụtụ nde mmadụ. Ihe ọzọkwa bụ na n’ime afọ iri anọ gara aga, e nweela ihe karịrị ọrịa iri atọ ndị pụtara ọhụrụ. Ụfọdụ n’ime ha enweghịkwa ọgwụ e ji agwọ ha.

OTÚ NDỊ MMADỤ GA-ESI NA-AKPA ÀGWÀ N’OGE IKPEAZỤ

10. Olee otú ihe e kwuru na 2 Timoti 3:1-5 si na-emezu taa?

10 Baịbụl kwuru na 2 Timoti 3:1-5, sị: “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” Pọl onyeozi kwuru otú  ọtụtụ ndị ga-esi na-akpa àgwà n’oge ikpeazụ a. Ọ sịrị na ndị mmadụ ga-abụ . . .

  • ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya

  • ndị hụrụ ego n’anya

  • ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi

  • ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihe

  • ndị ihe gbasara ndị ezinụlọ ha na-anaghị emetụ n’obi

  • ndị na-adịghị ejide onwe ha

  • ndị na-eme ihe ike

  • ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya karịa otú ha hụrụ Chineke

  • ndị na-eme ka hà hụrụ Chineke n’anya ma ha anaghị erubere ya isi

11. Gịnị ka Abụ Ọma 92:7 kwuru ga-eme ndị ajọ omume?

11 Ndị mmadụ hà na-akpa àgwà ndị a n’ebe i bi? Ọtụtụ ndị na-akpa ha n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ma, Chineke ga-eme ihe gbasara ya n’oge na-adịghị anya. O kwere anyị nkwa, sị: “Mgbe ndị ajọ omume pulitere dị ka ahịhịa ndụ, ndị niile na-eme ihe ọjọọ ana-amakwa pokopoko, ọ bụ ka e wee laa ha n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 92:7.

 IHE ỌMA NDỊ GA NA-EME N’OGE IKPEAZỤ

12, 13. Gịnị na gịnị ka Jehova kụziiri anyị n’oge ikpeazụ a?

12 Baịbụl kwuru na n’oge ikpeazụ a, ndị mmadụ ga na-ata ahụhụ ma na-ahụsi anya. Ma, o kwukwara na ihe ọma ga na-eme.

‘A ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.’—Matiu 24:14

13 A ga na-aghọtakwu Baịbụl. Daniel onye amụma kwuru na n’oge ikpeazụ, ‘ezi ihe ọmụma ga-aba ụba.’ (Daniel 12:4) Nke a pụtara na Chineke ga-eme ka ndị na-efe ya na-aghọtakwu Baịbụl. Jehova na-eme otú ahụ karịchaa kemgbe afọ 1914. Dị ka ihe atụ, ọ kụzierela anyị na aha ya dị ezigbo mkpa, kụziekwara anyị ihe o bu n’obi kee ụwa. Ọ kụziekwarala anyị gbasara àjà Jizọs Kraịst ji ndụ ya chụọ, ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ, nakwa gbasara mbilite n’ọnwụ. Anyị amụtala na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka nsogbu anyị niile bie, mụtakwa ihe anyị ga na-eme obi ana-atọ anyị ụtọ, na otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ndị dị Chineke mma. Gịnịkwanụ ka anyị ji ihe ndị a Chineke kụziiri anyị na-eme? Amụma ọzọ dị́ na Baịbụl ga-eme ka anyị mata azịza ya.—Gụọ ihe nke 21 na nke 25 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

14. N’ihe karịrị mba ole ka a na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke taa? Ole ndị na-ekwusa ya?

14 A ga na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile. Mgbe Jizọs na-ekwu gbasara oge ikpeazụ, ọ sịrị na ‘a ga-ekwusa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.’ (Matiu 24:3, 14.) Anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ, na-ekwusakwa ya n’ihe karịrị narị asụsụ asaa. N’eziokwu, Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị si “ná mba niile na ebo niile,” na-akụziri ndị mmadụ ihe Alaeze Chineke bụ  na ihe ọ ga-emere ụmụ mmadụ. (Mkpughe 7:9) Ha anaghịkwa ana ndị ha na-akụziri ihe ego. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị kpọrọ ha asị, na-emegidekwa ha, o nweghị ihe ga-eme ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma otú ahụ Jizọs buru n’amụma.—Luk 21:17.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

15. (a) Ì kwetara na ugbu a bụ oge ikpeazụ? Gịnị mere i ji kweta? (b) Olee ihe Jehova ga-emere ndị na-erubere ya isi, oleekwa ihe ọ ga-eme ndị na-enupụrụ ya isi?

15 Ì kwetara na ugbu a bụ oge ikpeazụ? Ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru anyị ga-eji mara oge ikpeazụ na-emezu. N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ekwu ka a kwụsị ikwusa ozi ọma. Mgbe ahụ ka “ọgwụgwụ” ga-abịa. (Matiu 24:14) Gịnị bụ ọgwụgwụ ahụ? Ọ bụ agha Amagedọn. Ọ bụ n’agha ahụ ka Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume niile nọ n’ụwa. Jehova ga-eji Jizọs na ndị mmụọ ozi ya dị ike bibie onye ọ bụla kpachaara anya na-enupụrụ ya na Jizọs isi. (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9) E bibichaa ha, Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya agaghịzi eduhie ndị mmadụ. Mgbe ahụ, Chineke ga-emere ndị niile na-erubere ya isi ma na-akwado Alaeze ya ihe ọma niile o kwere ha ná nkwa.—Mkpughe 20:1-3; 21:3-5.

16. Gịnị ka ị ga-eme ebe ọ bụ na ọgwụgwụ adịla ezigbo nso?

16 A ga-ebibi ụwa a Setan na-achị n’oge na-adịghị anya. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme?’ Jehova chọrọ ka ị na-amụ Baịbụl. I kwesịkwara ịna-amụchi ya anya. (Jọn 17:3) Ndịàmà Jehova na-enwe ọmụmụ ihe kwa izu. Ha ji ya na-enyere ndị mmadụ aka ịmụta Baịbụl. Gbalịa na-abịachi ọmụmụ ihe ndị ahụ anya. (Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.) Ọ bụrụ na ị mụta na  e nwere ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe n’àgwà gị, jisie ike gbanwee ha. Ka ị na-agbanwe ha, gị na Jehova ga na-adịkwu ná mma.—Jems 4:8.

17. Gịnị mere ọgwụgwụ ga-eji bịa ọtụtụ ndị na mberede?

17 Pọl onyeozi kwuru na Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume mgbe ọtụtụ ndị na-atụghị anya ya, “dị ka onye ohi si abịa n’abalị.” (1 Ndị Tesalonaịka 5:2) Jizọs kwuru na ọtụtụ ndị ga-eleghara ihe ndị na-egosi na anyị bi n’oge ikpeazụ anya. Ọ sịrị: “Dị nnọọ ka ụbọchị Noa dịrị, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ [ma ọ bụ oge ikpeazụ] ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.”—Matiu 24:37-39.

18. Olee aka ná ntị Jizọs dọrọ anyị?

18 Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị na anyị ekwesịghị ikwe ka “iribiga ihe ókè na ịṅụ oké mmanya na nchegbu nke ndụ” megharịa anyị anya. O kwuru na ọgwụgwụ ga-abịa na mberede “dị ka ọnyà,” nakwa na “ọ ga-abịakwasị ndị niile bi n’elu ụwa niile.” O kwuziri, sị: “Mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike [ma ọ bụ sinụ n’ala ala obi unu na-ekpe ekpere] mgbe niile ka unu wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:34-36) Gịnị mere anyị ga-eji mee ihe a Jizọs kwuru? Ọ bụ n’ihi na n’oge na-adịghị anya, a ga-ebibi ụwa ọjọọ a. Ọ bụ naanị ndị ha na Jehova na Jizọs dị ná mma ka a ga-azọpụta, ha adịrị ndụ ruo ebighị ebi n’ụwa ọhụrụ.—Jọn 3:16; 2 Pita 3:13.

^ para. 4 Maịkel bụ aha ọzọ a na-akpọ Jizọs Kraịst. Ị chọọ ịgụ ebe a kọwakwuru ya, gụọ ihe nke 23 e dere ná ngwụcha akwụkwọ a.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka “Ọgwụgwụ Ụwa” Pụtara?

Ị̀ ma na ihe Baịbụl kwuru gbasara “ọgwụgwụ” bụ ozi ọma?